Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 15

Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ

Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú Kraịst si nyere anyị aka ka ndị ọchịchị deba aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro, nakwa ka ha kwe ka anyị na-erubere Chineke isi

1, 2. (a) Olee ihe gosiri na ị bụ nwa amaala Alaeze Chineke? (b) Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji agba akwụkwọ mgbe ụfọdụ n’ụlọikpe?

Ị̀ BỤ nwa amaala Alaeze Chineke? Ebe ị bụ Onyeàmà Jehova, ị bụ nwa amaala ya. Olee ihe na-egosi na ị bụ ya? Ọ bụghị akwụkwọ ikike i nwere ike iji gaa mba ọzọ ma ọ bụ akwụkwọ ụfọdụ gọọmenti nyere gị. Kama, ọ bụ otú i si efe Jehova. Ihe e ji ama na ị na-efe Chineke nke ọma abụghị naanị ihe i kweere, kama, ihe ị na-eme sokwa na ya. Otú i si na-edebe iwu Chineke na-egosi na ị bụ nwa amaala Alaeze ya. Otú anyị niile si efe Chineke gbasara ihe niile anyị na-eme ná ndụ, otú anyị si elekọta ezinụlọ anyị, nakwa otú anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị mgbe anyị na-arịa ọrịa.

2 Ma, ụwa Setan na-enye anyị nsogbu mgbe ụfọdụ maka na anyị na-eme ihe ndị na-egosi na anyị bụ ụmụ amaala Alaeze Chineke. Gọọmenti ụfọdụ anwaala ịkwụsị anyị ife Chineke otú ọ chọrọ, ụfọdụ agwadịla anyị kwụsị ife ya. Mgbe ụfọdụ, anyị bụ́ ndị Kraịst na-achị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka gọọmenti kwe anyị ịna-erubere Mesaya bụ́ Eze anyị isi. Ihe a anyị na-eme ọ̀ dị mma? Ee. Ndị fere Jehova n’oge ochie mekwara otu ahụ. Ha mere ihe niile ha nwere ike ime ka gọọmenti kwe ha ịna-efe Jehova otú ọ chọrọ.

3. Olee ihe ndị Chineke mere n’oge Esta bụ́ nwunye eze?

3 Dị ka ihe atụ, n’oge Esta bụ́ nwunye eze, ndị Chineke mere ihe niile ha nwere ike ime ka ndị iro ha ghara igbu ha. Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe Heman obi tara mmiri gwara Ahazuirọs bụ́ Eze Peshia. Heman bụ osote Eze n’oge ahụ. Ọ gwara Eze a ka e gbuo ndị Juu niile bi n’obodo niile ọ na-achị n’ihi na “iwu ha dị iche na nke ndị niile ọzọ.” (Esta 3:8, 9, 13) Jehova ọ̀ hapụrụ ndị Juu ka ndị iro ha gbuo ha? Mbanụ. Mgbe Esta na Mọdekaị rịọrọ Eze Ahazuirọs ka ọ ghara ikwe ka e gbuo ndị Juu, Jehova mere ka nkata ahụ a kpara kụọ afọ n’ala.—Esta 9:20-22.

4. Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

4 À na-eme ndị Jehova ụdị ihe ahụ taa? Ee. N’isi iri na anọ n’akwụkwọ a, anyị kwuru otú gọọmenti ụfọdụ si mekpọọ Ndịàmà Jehova ọnụ n’oge anyị a. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú gọọmenti ụfọdụ si chọọ ịkwụsị anyị ife Jehova otú ọ chọrọ. Lekwa ihe atọ anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a: (1) ihe ndị anyị mere ka ndị ọchịchị deba aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro nakwa ka ha kwe anyị ife Chineke otú ọ chọrọ, (2) ihe ndị anyị na-eme iji hụ na a gwọrọ anyị otú anyị na-agaghị emebi iwu Chineke mgbe anyị na-arịa ọrịa, nakwa (3) ihe ndị anyị  na-eme ka e kwe anyị zụọ ụmụ anyị otú Jehova chọrọ. Ka anyị na-eleba nke ọ bụla anya, anyị ga-ahụ otú anyị si mee ihe niile anyị nwere ike ime ka gọọmenti kwe anyị ịna-eme ihe Chineke chọrọ ka ndị Alaeze Mesaya na-achị na-eme. Anyị ga-ahụkwa otú Jehova si gọzie mbọ ndị ahụ anyị gbara.

Ihe Ndị Anyị Mere Ka E Deba Aha Okpukpe Anyị n’Akwụkwọ Nakwa Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ

5. Olee uru ezigbo Ndị Kraịst na-erite ma e deba aha okpukpe ha n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro?

5 È kwesịrị ibu ụzọ deba aha okpukpe anyị n’akwụkwọ tupu anyị efewe Jehova? Mbanụ. Ma, ideba aha okpukpe anyị n’akwụkwọ na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ife Chineke otú ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka anyị na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị nakwa n’Ụlọ Mgbakọ anyị otú anyị chọrọ. Ọ na-emekwa ka anyị na-ebipụta akwụkwọ anyị mgbe ọ bụla, ma ọ bụ na-esi ná mba ọzọ ebubata akwụkwọ anyị n’enweghị onye ga-asị anyị ebubatala. Ọ na-emekwa ka anyị na-ezi ozi ọma otú anyị chọrọ. N’ọtụtụ mba, e debala aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ka e kwe anyị ịna-efe Chineke otú ọ chọrọ, otú ahụ e si ekwe ka okpukpe ndị ọzọ e debara aha ha n’akwụkwọ na-eme. Ma, olee ihe ndị anyị na-eme ma gọọmenti ọ bụla jụ ideba aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ma ọ bụ ma ha jụ ikwe anyị na-efe Chineke otú ọ chọrọ?

6. Olee nsogbu bịaara Ndịàmà Jehova nọ n’Ọstrelia n’agbata afọ 1941 na afọ 1944?

6 Ọstrelia. N’agbata afọ 1941 na afọ 1944, onyeisi ala Ọstrelia kwuru na ihe Ndịàmà Jehova kweere na-eme ka mbọ ha na-agba n’agha ha na-alụ na-akụ afọ n’ala. N’ihi ya, ha machiri anyị ikpe okpukpe anyị. Ụmụnna anyị na-ezozi ezo ezi ozi ọma. Ha anaghịzi amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ọchịchị mechiri alaka ụlọ ọrụ anyị n’Ọstrelia, kpọchiekwa Ụlọ Nzukọ Alaeze niile. A machikwara ndị mmadụ inwe akwụkwọ anyị. Ma, mgbe afọ ole na ole gachara, ihe gbanwere. N’abalị iri na anọ n’ọnwa Jun afọ 1943, Ụlọikpe Kasị Elu n’Ọstrelịa kagburu mmachi ahụ gọọmenti machiri anyị.

7, 8. Olee mbọ ụmụnna anyị nọ na Rọshịa gbarala kemgbe ọtụtụ afọ ka e kwe ha ikpe okpukpe ha?

7 Rọshịa. Ndị ọchịchị Kọmunist machiri Ndịàmà Jehova na Sọviet Yuniọn ruo ọtụtụ afọ. Ma, n’afọ 1991, ha debara aha okpukpe anyị n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. Mgbe Sọviet Yuniọn dara, ndị ọchịchị Rọshịa debakwara aha okpukpe anyị n’akwụkwọ n’afọ 1992, ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. Obere oge, ndị mmegide bidoro inye ụmụnna anyị nsogbu. Ndị bu ya n’isi bụ ndị Chọọchị Ọtọdọks nke Rọshịa. Ihe mere ha ji na-enye ha nsogbu bụ na ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ. N’agbata afọ 1995 na afọ 1998, ndị mmegide a degaara ụlọikpe akwụkwọ ugboro ise ka e kpee anyị ikpe na anyị bụ ndị ọjọọ. Ma, n’ugboro ise ahụ ha dere ihe a, onye ọkàiwu ọ dị n’aka ịgba ndị ọjọọ akwụkwọ n’ụlọikpe lebachara anya n’ihe ha dere ma kwuo na o nweghị ihe ọ bụla ya hụrụ gosiri na anyị bụ ndị ọjọọ. Ndị mmegide ahụ fooro ntutu taa na ha agaghị akwụsị inye ụmụnna anyị nsogbu. N’ihi ya, ha gbara ụmụnna anyị akwụkwọ n’ụlọikpe n’afọ 1998. Ụlọikpe ahụ kpelaara anyị ikpe. Ma, ndị mmegide a ekweghị ihe ụlọikpe ahụ kpebiri. Ọ bụ ya mere ha ji gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe. Na Mee, afọ 2001, ụlọikpe a mara anyị ikpe. Ma, n’Ọktoba  afọ 2001, a malitere ikpegharịkwa ikpe a. E kpebiri ya n’afọ 2004. E kpebiri ka a machie anyị ikpe okpukpe anyị na Mọsko.

8 Ihe a e kpebiri mere ka a malite inye ụmụnna anyị nsogbu ebe niile na Mọsko. (Gụọ 2 Timoti 3:12.) A na-amaja ụmụnna anyị ma na-akụ ha ihe. A na-ebukọrọkwa akwụkwọ anyị. E nyekwara iwu ka ndị mmadụ ghara inye ụmụnna anyị ụlọ ha ga-anọ na-amụ ihe. N’eziokwu, ụmụnna anyị hụsiri anya n’oge ahụ. N’afọ 2001, Ndịàmà Jehova wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. N’afọ 2004, ụmụnna anyị wegakwaara Ụlọikpe a ihe ndị ọzọ ha ga-eleba anya mgbe ha na-ekpebi ikpe a. N’afọ 2010, Ụlọikpe a kpebiri ikpe a. Ha kwuru na ihe mere mba Rọshịa ji machie Ndịàmà Jehova bụ na ha kpọrọ ha asị. N’ihi ya, Ụlọikpe a kagburu ikpe ụlọikpe ndị nọ na Rọshịa mara Ndịàmà Jehova, sị na o nweghị ihe gosiri na anyị dara iwu. Ha kwukwara na ihe mere gọọmenti Rọshịa ji machie Ndịàmà Jehova bụ ka ha napụ ha ikike iwu nyere ha ikpe okpukpe ha otú ha chọrọ. Ụlọikpe a kwuru na e kwesịghị igbochi Ndiàmà Jehova ife Chineke otú ọ chọrọ. Ihe a Ụlọikpe a kpebiri emeela ka obi sie ụmụnna anyị ike ife Chineke otú ọ chọrọ, ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị Rọshịa na-egbu oge ime ihe Ụlọikpe a kpebiri.

Onye a bụ Nwanna Titos Manoussakis (A kọrọ gbasara ya na paragraf nke 9)

9-11. Olee mbọ ụmụnna anyị nọ na Gris gbarala ka e kwe ha ịna-enwe ọmụmụ ihe? Oleekwa uru mbọ a ha gbara bara?

9 Gris. N’afọ 1983, Nwanna Titos Manoussakis chọtara otu ọnụ ụlọ n’obodo Herakliọn, dị na Krit ka ụmụnna anyị nọrọ na ya na-enwe ọmụmụ ihe. (Hib. 10:24, 25) Obere oge ọ chọtachara ụlọ a, otu ụkọchukwu Chọọchị Ọtọdọks degaara ndị ọchịchị akwụkwọ ma sị ha ekwela Ndịàmà Jehova nọrọ ebe ahụ na-amụ ihe. Gịnị mere ụkọchukwu a ji mee ihe a? Ọ bụ n’ihi na ihe anyị na-akụzi dị iche n’ihe ndị Chọọchị Ọtọdọks na-akụzi. Ndị ọchịchị kpụpụrụ Nwanna Titos Manoussakis na ụmụnna atọ ndị ọzọ n’ụlọikpe ma kwuo na ha dara iwu. Ụlọikpe a mara ụmụnna anyị ndị a ikpe, rie ha iwu, ma tụọ ha mkpọrọ ọnwa atọ. Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova na-erubere Chineke isi, ha weere ya na ihe ahụ ụlọikpe ahụ kpebiri ga-eme ka ha ghara inwe ike ife Chineke otú ha chọrọ. N’ihi ya, ha wepụrụ okwu a n’ụfọdụ ụlọikpe ndị e nwere na Gris, ma ụlọikpe ndị ahụ mara ụmụnna anyị ikpe. N’ihi ya, ụmụnna anyị wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.

10 Ụlọikpe Yurop a kpebiri ikpe a n’afọ 1996 ma ma ndị iro anyị ikpe. Ihere mere ndị iro anyị n’ihi na ha atụghị anya ihe a merenụ. Ụlọikpe ahụ kwuru na “Ndịàmà Jehova so ‘n’okpukpe a ma ama na Gris’ n’ihi na gọọmenti debara aha ha n’akwụkwọ ka ọ bụrụ okpukpe iwu kwadoro. Ha kwukwara na ikpe ahụ ụlọikpe ndị dị na Gris mara “Nwanna Titos Manoussakis na ụmụnna atọ ndị ozọ ga-eme ka ha ghara ikpe okpukpe ha otú ha chọrọ.” Ha kwukwara na ọ bụghị gọọmenti Gris “ga-ekwu ma ihe okpukpe na-akụzi ọ̀ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị mma, nakwa na ọ bụghịkwa ya ga-ekwu otú a ga-esi na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị ahụ.” Ụlọikpe a kagburu ikpe ahụ a mara ụmụnna anyị ma gwa ha kpewe okpukpe ha otú ha chọrọ.

11 Ikpe a e kpelaara anyị, ò mere ka ndị Gris kwụsị inye anyị nsogbu? N’ebee kwanụ? N’afọ 2012, ụlọikpe e nwere n’obodo Kasandre  kpebikwara ụdị ikpe ahụ Ụlọikpe Yurop kpebiri. Ikpe a were ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri na abụọ. Ihe mere e ji gbaa akwụkwọ a bụ nsogbu bishọp chọọchị Ọtọdọks na-enye ụmụnna anyị. E mechara wepụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu na Gris. Mgbe ha lebachara ya anya, ha kpelaara anyị ikpe. Ụlọikpe a kwuru na iwu mba Gris kwuru na nwa amaala Gris ọ bụla nwere ike ikpe okpukpe masịrị ya. Ha kwukwara na ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwu na Ndịàmà Jehova abụghị okpukpe a ma ama abụghị eziokwu. Ụlọikpe ahụ sịrị: “Ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi doro onye ọ bụla anya. N’ihi ya, ha bụ okpukpe a ma ama.” Obi dị ụmụnna anyị ole na ole e nwere n’ọgbakọ Kasandre ụtọ n’ihi na ha na-enwezi ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

12, 13. Olee otú ndị ọchịchị Frans si jiri ‘iwu na-akpa nkata inye anyị nsogbu?’ Oleekwa ihe mechara mee?

12 Frans. Ụfọdụ ndị iro anyị ejirila ‘iwu na-akpa nkata inye anyị nsogbu.’ (Gụọ Abụ Ọma 94:20.) Dị ka ihe atụ, n’afọ 1995, gọọmenti Frans malitere inyocha otú alaka ụlọ ọrụ anyị na Frans si enweta ego na otú ha si emefu ya. Minista atụmatụ mkpata na mmefu ego dị n’aka kwuru ihe mere ha ji na-eme ya. Ọ sịrị: ‘Ihe a anyị na-eme nwere ike ime ka ụlọikpe kwuo ka e rekpọọ ihe niile dị n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova iji kwụọ ụgwọ ha ji gọọmenti Frans. O nwekwara ike ime ka e kpee ha ikpe na ha na-arụrụ aka, meekwa ka e mechie alaka ụlọ ọrụ ha kpamkpam.’ Mgbe ha mechara nnyocha a, o nweghị ihe ọ bụla ha hụrụ gosiri na alaka ụlọ ọrụ anyị a na-arụrụ aka. Ma, ha kwuru na anyị ga-akwụ ụtụ isi buru ezigbo ibu. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị ekweta ịkwụ ụtụ isi a, ọ ga-eme ka anyị mechie alaka ụlọ ọrụ anyị, ree ihe niile dị na ya iji kwụọ ụgwọ a. Ihe a gọọmenti Frans kwuru wutere ụmụnna anyị, ma o meghị ka ha gba nkịtị. Ha mere ka ọhaneze mara na ihe a gọọmenti chọrọ ime ha adịghị mma. N’afọ 2005, ha wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.

13 Ụlọikpe a kpebiri ikpe a n’abalị iri atọ n’ọnwa Jun afọ 2011. Ha kwuru na ebe ọ bụ na iwu mba Frans kwuru na nwa amaala ya ọ bụla nwere ike ikpe okpukpe masịrị ya, gọọmenti ekwesịghị ileba anya n’ihe okpukpe ọ bụla na-akụzi, ọ gwụkwala ma ihe ndị ahụ hà na-akpata ọgba aghara. Ha ekwesịghịkwa ileba anya n’otú ha si na-akụzi ihe ndị ahụ. Ụlọikpe ahụ kwukwara, sị: “Ụtụ isi ahụ . . . ga-eme ka alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Frans ghara inwe ego ha ga-eji na-arụ ọrụ ha. Ọ ga-emekwa ka Ndịàmà Jehova nọ na Frans ghara ikpe okpukpe ha otú ha chọrọ.” Ndị ọkàikpe niile e nwere n’Ụlọikpe a kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe a. Ụlọikpe a gwara gọọmenti Frans ka ha kwụghachi Ndịàmà Jehova ego niile ha kwụrụ n’ụtụ isi nakwa ọmụrụ nwa ọ mụtara. Ha gwakwara ha ka ha gharakwa ịkpa ihe ọ bụla dị n’alaka ụlọ ọrụ anyị aka. Obi dịkwa anyị niile ụtọ na gọọmenti Frans mere ihe ụlọikpe a kwuru.

E nwere ụmụnna anyị taa na-ata ahụhụ n’ihi ikpe mkpegbu e kpere ha. I kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere ha aka

14. Olee ihe i nwere ike ime ná mbọ a anyị na-agba ka e kwe anyị ịna-efe Chineke otú ọ chọrọ?

14 Ndị Jehova taa na-eme ihe niile ha nwere ike ime ka e kwe ha ife Chineke otú ọ chọrọ, otú ahụ Esta na Mọdekaị mere. (Esta 4:13-16) Ò nwere ihe i nwere ike ime ka e kwe ka anyị na-efe Chineke otú ọ chọrọ? Ee. I kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere ụmụnna  anyị gọọmenti na-emekpọ ọnụ aka. Ụdị arịrịọ a ga-eme ka okwukwe ụmụnna anyị ndị a a na-emekpọ ọnụ na ndị ihe na-esiri ike, bụrụ a kwaa akwụrụ. (Gụọ Jems 5:16.) Jehova ọ̀ na-aza ụdị ekpere a? Ee. Ikpe ndị o mere ka e kpelaara anyị n’ụlọikpe na-egosi n’eziokwu na ọ naghị eji arịrịọ anyị rịọrọ maka ụmụnna anyị egwu egwu.—Hib. 13:18, 19.

Ihe Ndị Anyị Na-eme Iji Hụ Na A Gwọrọ Anyị Otú Anyị Na-agaghị Emebi Iwu Chineke Mgbe A Na-agwọ Anyị Ọrịa

15. Olee ihe ndị Chineke kwesịrị iburu n’obi gbasara ịmịnye ha ọbara?

15 N’isi iri na otu nke akwụkwọ a, e mere ka o doo anya na Baịbụl gwara ndị Alaeze Chineke na-achị ka ha ghara iri ọbara n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị taa na-eri ya. (Jen. 9:5, 6; Lev. 17:11; gụọ Ọrụ Ndịozi 15:28, 29.) Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara, anyị chọrọ ka a gwọọ anyị na ndị ikwu anyị nke ọma, ọ bụrụhaala na otú a chọrọ isi gwọọ anyị agaghị eme ka anyị nupụrụ Chineke isi. Ụlọikpe Kasị Elu e nwere n’ọtụtụ mba ekwuola na mmadụ nwere ike ikwu otú ọ chọrọ ka e si gwọọ ya ọrịa. Ha kwukwara na mmadụ nwekwara ike ịjụ otú a chọrọ isi gwọọ ya ọrịa ma ọ bụrụ na ihe mere o ji jụ bụ n’ihi ihe o kweere, ma ọ bụkwanụ na akọnuche ya ekweghị ya. Ma okwu a a kpatarala ụmụnna anyị nsogbu tara akpụ n’ụfọdụ mba. Ka anyị leba anya n’ole na ole n’ime ha.

16, 17. Gịnị gbawara otu nwanna nwaanyị obi na Japan mgbe a wachara ya ahụ́? Olee otú Chineke si za ekpere ya?

16 Japan. Nwanna Nwaanyị Misae Takeda, onye bi na Japan, chọrọ ka a waa ya ahụ́ n’ụlọ ọgwụ. Ọ dị afọ iri isii na atọ. O ji obi ya niile na-akwado Alaeze Chineke. Mgbe o ruru n’ụlọ ọgwụ, ọ gwara dọkịta ya na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara. Ma, mgbe a wachara ya ahụ́, ọtụtụ ọnwa agaakwaa, ọ chọpụtara na a mịnyere ya ọbara. Ihe a wutere ya. O weere ihe a e mere ya ka idina ya n’ike, nakwa ka igwu ya wayo. Ọ bụ ya mere o ji gbaa ndị dọkịta na ndị ụlọ ọgwụ ahụ akwụkwọ n’ụlọikpe na Jun, afọ 1993. Okwukwe nwanna nwaanyị a siri ike. Nwanna nwaanyị a guzo ọtọ n’ụlọikpe kwuo okwu nke ọma ihe karịrị otu awa n’agbanyeghị na ahụ́ esighị ya ike. Mgbe ikpeazụ ọ bịara n’ụlọikpe ahụ bụ mgbe ọ fọrọ naanị otu ọnwa ka ọ nwụọ. N’eziokwu, okwukwe ya enweghị atụ. Nwanna Nwaanyị Takeda kwuru na ya na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka n’okwu a. Obi siri ya ike na Jehova ga-anụ arịrịọ ya. Jehova ọ̀ nụrụ ya?

17 Mgbe Nwanna Nwaanyị Takeda nwụchara, afọ atọ agaakwa, Ụlọikpe Kasị Elu na Japan kpelaara ya ikpe. Ụlọikpe a kwuru na dọkịta ahụ na ndị ụlọ ọgwụ ahụ mejọrọ ya, ebe ọ bụ na ha mịnyere ya ọbara mgbe ọ gwara ha na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara. Ọ bụ n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Febụwarị, afọ 2000, ka e kpebiri ikpe a. Ha kwuru na “ebe ọ bụ na mmadụ nwere ike ikwu otú e nwere ike isi gwọọ ya ọrịa, e kwesịrị ime ihe onye ahụ kwuru n’ihi na ọ bụ ihe ruuru ya.” Nwanna Nwaanyị Takeda katara obi mee ka o doo anya na e kwesịghị ịmịnye ya ọbara n’ihi na akọnuche ya ekweghị ya. Mbọ niile a ọ gbara baara ụmụnna anyị nọ na Japan uru. Ha anaghịzi achị obi n’aka aga ụlọ ọgwụ n’ihi na ha ma na o nweghị onye ga-amịnye ha ọbara n’ike.

Onye a bụ Nwanna Pablo Albarracini (A kọrọ gbasara ya na paragraf nke 18 ruo na nke 20)

18-20. (a) Gịnị ka ụlọikpe mkpegharị ikpe n’Ajentina kwuru banyere akwụkwọ otu nwanna dejupụtara o ji sị na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara? (b) A bịa n’okwu gbasara ịmịnye mmadụ ọbara, olee ihe anyị kwesịrị ime nke ga-egosi na anyị na-erubere Eze anyị bụ́ Kraịst isi?

 18 Ajentina. Olee ihe ndị Alaeze Chineke na-achị nwere ike ime adịghị ama ama a chọọ ka e kpebie otú a ga-esi gwọọ ha ọrịa mgbe ha na-amaghị onwe ha? Ihe anyị kwesịrị ime bụ idejupụta akwụkwọ iwu kwadoro anyị ji kwuo na anyị achọghị ka a mịnye anyị ọbara. Anyị kwesịkwara iji akwụkwọ a eje ebe ọ bụla anyị na-eje. Ọ bụ akwụkwọ a ga-ekwuchite ọnụ anyị mgbe anyị na-amaghị onwe anyị. Nwanna Pablo Albarracini mere ihe a niile. Na Mee, afọ 2012, ndị ohi nwara izu ya ohi, ma gbaa ya égbè ọtụtụ ugboro. Mgbe ihe a mechara, e buuru ya gaa ụlọ ọgwụ. Ọ maghịzi onwe ya, n’ihi ya kwa, o nweghị ike ịgwa ndị ụlọ ọgwụ na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara. Ma, o ji akwụkwọ ọ bịanyere aka na ya nke kwuru otú a ga-esi agwọ ya ọrịa. O dejupụtara akwụkwọ a ihe karịrị afọ anọ tupu ihe a emee. Ọ bụ eziokwu na ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, ụfọdụ ndị dọkịta ekwuokwa na e kwesịrị ịmịnye ya ọbara ka ọ ghara ịnwụ, ndị ụlọ ọgwụ ahụ kwuru na a ga-agwọ ya n’amịnyeghị ya ọbara otú ahụ o kwuru n’akwụkwọ ahụ. Ma, papa ya wepụrụ okwu a n’ụlọikpe ozugbo. Papa ya a abụghị Onyeàmà Jehova. Mgbe ụlọikpe lebachara okwu a anya, ha kpebiri ka a mịnye nwanna a ọbara n’agbanyeghị na o kwuru n’akwụkwọ ahụ na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara.

19 Onye ọkàiwu na-ekpechite ọnụ nwunye Nwanna Pablo wepụrụ okwu a n’ụlọikpe mkpegharị ikpe ozugbo. Ụlọikpe a lebakwara okwu a anya n’awa ole na ole. Ha kagburu ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpebiri, sị na e kwesịrị ime ihe Nwanna Pablo kwuru n’akwụkwọ ahụ ọ bịanyere aka na ya. Papa Nwanna Pablo wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Ajentina. Ma, Ụlọikpe a kwuru na ‘o doro ha anya na Nwanna Pablo chere echiche nke ọma tupu ya edejupụta akwụkwọ ahụ o ji kwuo na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara mgbe ọ bụla.’ Ụlọikpe a kwukwara na ‘o nweghị ihe gosiri na a manyere ya amanye ịbịanye aka na ya.’ Ụlọikpe ahụ kwukwara, sị: “Onye ọ bụla torurula ihe e ji mmadụ eme nwere ike idejupụta akwụkwọ o ji kwuo otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa. O nwekwara ike ikwere ka ndị dọkịta gwọọ ya otú ha chọrọ ma ọ bụkwanụ jụ . . . Dọkịta ga-agwọ onye ahụ ga-emerịrị ihe e dere n’akwụkwọ ahụ onye ahụ dejupụtara.”

Ì dejupụtala akwụkwọ i ji kwuo na ị chọghị ka a mịnye gị ọbara?

20 Nwanna Pablo mechara gbakee. Obi na-atọ ya na nwunye ya ụtọ na ha dejupụtara akwụkwọ ahụ tupu ihe ahụ emee. Akwụkwọ a nwanna a dejupụtara dị ezigbo mkpa. Ihe a o mere gosiri na ọ na-eme ihe Chineke kwuru ka ndị Kraịst na-achị na-eme. Gị na ezinụlọ gị, ùnu edejupụtala akwụkwọ nke unu?

Onye a bụ Nwanna Nwaanyị April Cadoreth (A kọrọ gbasara ya na paragraf nke 21 ruo na nke 24)

21-24. (a) Olee ihe Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada kpebiri n’okwu gbasara ịmịnye ndị na-eto eto ọbara? (b) Olee uru ihe a ụlọikpe a kpebiri baara ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova?

21 Kanada. O doro anya na ụlọikpe dị iche iche ma na ndị nne na nna nwere ikike ikwu otú kacha mma e kwesịrị isi gwọọ ụmụ ha ọrịa. Mgbe ụfọdụ, ụlọikpe dị iche iche ekpebiedịla na ọ bụrụ na onye na-eto eto, nke na-eche echiche ka dimkpa, ekwuo otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa, e kwesịrị ime ihe o kwuru. Ụdị ihe a ka ụlọikpe kwuru mgbe ha kpebiri ikpe Nwanna Nwaanyị April Cadoreth, onye Kanada. Mgbe ọ dị afọ iri na anọ, a kpọgara ya ụlọ ọgwụ n’ihi na ọbara na-agba ya n’ime ahụ́. Ọnwa ole na ole tupu ihe a emee, o dejupụtara kaadị a na-akpọ Advance Medical Directive ma bịanye aka na ya. O kwuru na kaadị a na ya achọghị ka a mịnye ya ọbara,  a sịgodị na ya nọ n’ọnụ ọnwụ. Dọkịta na-agwọ ya jụwara isi na ya agaghị eme ihe o kwuru na kaadị ahụ. Dọkịta a wepụrụ okwu a n’ụlọikpe ka ha nye ya ikike ịmịnye nwa a ọbara. Ụlọikpe ahụ nyere dọkịta ahụ ikike ka ọ mịnye ya ọbara, dọkịta ahụ amịnyekwa ya akpa ọbara atọ. April mechara kwuo na ya weere ihe a e mere ya ka idina ya n’ike.

22 April Cadoreth na nne na nna ya wepụrụ okwu a n’ụlọikpe ụfọdụ. Mgbe ụlọikpe ndị a kpebichara okwu a, afọ abụọ agaakwa, e wepụrụ ya n’Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada. N’afọ 2009, ụlọikpe a kpelaara April ikpe. Ihe a e kpebiri bakwaara ndị na-eto eto ndị ọzọ uru ebe ọ bụ na o doola anya na ha nwere ike ikpebi otú a ga-esi gwọọ ha ọrịa. Ma, ihe Ụlọikpe a kpebiri agbanweghị iwu mba Kanada. Ụlọikpe a kwuru, sị: “A bịa n’okwu gbasara otú a ga-esi gwọọ mmadụ ọrịa, e kwesịrị ịhapụ ndị na-eto eto na-erubeghị afọ iri na isii ka ha jiri aka ha gosi na ọjụjụ ha jụrụ otú a chọrọ isi gwọọ ha ọrịa si ha n’ala ala obi, nakwa na ha nwere ike ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme.”

23 Ikpe a Ụlọikpe Kasị Elu kpebiri bara ezigbo uru n’ihi na o mere ka o doo anya na iwu kwuru na ndị na-eto eto, bụ́ ndị  na-eche echiche ka dimkpa, nwere ike ikwu otú a ga-esi gwọọ ha ọrịa. Tupu Ụlọikpe Kasị Elu na Kanada ekpebie ikpe a, ụlọikpe ndị ọzọ dị na Kanada nwere ike inye ndị dọkịta ikike ka ha gwọọ onye na-eto eto na-erubeghị afọ iri na isii ọrịa otú hanwa chọrọ, ma ọ bụrụ na ụlọikpe ahụ echee na nke ahụ ga-eme ka nwa ahụ gbakee. Ma, mgbe Ụlọikpe Kasị Elu kpebichara ikpe a, o nweghịzi ụlọikpe dị na Kanada nwere ike ikwu ka a gwọọ onye na-eto eto ọ bụla na-erubeghị afọ iri na isii ọrịa otú ndị dọkịta chọrọ, n’ebughị ụzọ jụta ihe onye ahụ chere iji mara ma ò toruola ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme.

“Obi dị m ụtọ ugbu a n’ihi na mbọ niile m gbara n’ikpe a emeela ka e too aha Chineke ma mee Setan onye ụgha”

24 È nwere uru ikpe a e kpere afọ atọ bara? Nwanna Nwaanyị April kwuru na “ọ bara uru.” O mechara gbakee. Ọ bụkwa onye ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ ugbu a n’ihi na mbọ niile m gbara n’ikpe a emeela ka e too aha Chineke ma mee Setan onye ụgha.” Ihe a o mere na-egosi na ụmụ anyị na-eto eto nwekwara ike ịkwụsi ike n’ihe ha kweere, si otú ahụ gosi na ha bụ ezigbo ụmụ amaala Alaeze Chineke.—Mat. 21:16.

Ihe Ndị Anyị Na-eme Ka E Kwe Anyị Zụọ Ụmụ Anyị Otú Jehova Chọrọ

25, 26. Olee nsogbu a na-enwe mgbe ụfọdụ ma di na nwunye gbaa alụkwaghịm?

25 Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-azụ ụmụ ha otú ọ chọrọ. (Diut. 6:6-8; Efe. 6:4) Ihe a Chineke gwara ndị nne na nna ka ha na-eme adịchaghị mfe. Ọ na-akadị esi ike ma a gbaa alụkwaghịm. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, otú nne chere a ga-esi na-azụ ụmụ ha nwere ike ịdị iche n’otú nna chere a ga-esi azụ ha. Dị ka ihe atụ, nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova chọsiri ike ka a zụọ nwa ha otú Chineke chọrọ, ma onye nke na-abụghị Onyeàmà Jehova nwere ike ịjụ. Ma, nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova kwesịrị ịghọta na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na ụmụ ha ka ga na-emekọrịta ihe n’agbanyeghị na ha agbaala alụkwaghịm.

26 Ụdị ihe a mee, nne ma ọ bụ nna na-abụghị Onyeàmà Jehova nwere ike ịgba akwụkwọ n’ụlọikpe ka a kpọnye ya nwa ha n’ihi na ya chọrọ iji aka ya kụziere ya ihe gbasara okpukpe ya. Ma, ụfọdụ na-ekwu na nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova zụọ ụmụ ha, ụmụaka ahụ ga-amụta ihe ọjọọ. Ha nwere ike ikwu na onye nke bụ́ Onyeàmà Jehova agaghị ekwe ka ụmụ ahụ na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ha ma ọ bụ ememme ndị ọzọ. Ha nwekwara ike ikwu na ọ gaghị ekwe ka a mịnye ụmụ ahụ ọbara ga-azọ ha ndụ ma ha nọrọ n’ọnụ ọnwụ. Obi dị anyị ụtọ na e nweela ụlọikpe ndị lebarala okwu a anya ma gbakwasị ụkwụ n’ihe ga-abara nwatakịrị uru kpebie ya. Ha agbakwasịghị ụkwụ n’ihe ụfọdụ ndị na-ekwu, ya bụ, na okpukpe nne ma ọ bụ nna na-ekpe ga-akụziri nwatakịrị ihe ọjọọ. Ka anyị leba anya n’ikpe ole na ole e kpebirila n’okwu a.

27, 28. E kwuru na ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova akụziere nwa ya ihe Ndịàmà Jehova kweere, ọ ga-eme ka nwa ahụ mụta ihe ọjọọ. Ma, olee ihe Ụlọikpe Kasị Elu n’Ohayo kpebiri n’okwu a?

27 Amerịka. N’afọ 1992, Ụlọikpe Kasị Elu n’Ohayo kpebiri ikpe Nwanna Nwaanyị Jennifer Pater na onye bụ́bu di ya. Ihe sere okwu bụ na onye a bụ́bu di ya kwuru na ọ bụrụ na Jennifer akpọrọ Bobby, bụ́ obere nwa ha nwoke, ma kụziere ya ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi, ọ ga-amụta ihe ọjọọ. Tupu e wepụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu,  onye a bụ́bu di Jennifer gbara akwụkwọ n’otu ụlọikpe dị n’Ohayo. Ụlọikpe a kpelaara nwoke a ikpe ma kpọnye ya nwa ha ka o jiri aka ya zụọ ya. Ha kwuru na Jennifer nwere ike ịna-aga eleta nwa ha nwoke ahụ, ma ọ gaghị “akụziri ya ihe ọ bụla Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla mee ka nwa ahụ mụta ihe ndị ahụ.” Ihe a ụlọikpe a kpebiri edoghị anya n’ihi na mmadụ nwere ike ịghọta na ihe ọ pụtara bụ na Jennifer ekwesịghị ịkụziri nwa ya nwoke ahụ Baịbụl ma ọ bụ àgwà ọma ndị Baịbụl kwuru ka a na-akpa. Olee otú i chere obi dị Jennifer mgbe ahụ? Ihe a gbawara ya obi. Ma, o kwuru na ya mụtara inwe ndidi ma chere Jehova. O kwukwara, sị: “O nwetụghị mgbe Jehova gbara nkịtị n’okwu a.” Nzukọ Jehova nyeere onye ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Jennifer aka, ya ewepụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu n’Ohayo.

28 Ụlọikpe a kagburu ihe ahụ ụlọikpe mbụ kpebiri. Ha kwuru na “nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà ọma nakwa ihe gbasara okpukpe ha.” Ụlọikpe a kwuru na ụlọikpe mbụ ahụ ekwesịghị igbochi nne ma ọ bụ nna bụ́ Onyeàmà Jehova ịkụziri nwa ya ihe gbasara okpukpe ya, ọ gwụkwala ma è mere ka o doo anya na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ga-akpa nwatakịrị ahụ aka ọjọọ ma a kụziere ya ihe ndị ahụ. Ụlọikpe a kwuru na o nweghị ihe ọ bụla ha chọpụtara gosiri na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ga-akpa nwatakịrị aka ọjọọ.

Ọtụtụ ụlọikpe ekpelaarala Ndị Kraịst bụ́ nne ma ọ bụ nna ikpe ma kpọnye ha ụmụ ha ka ha zụwa

29-31. Gịnị mere otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Denmak ji gbara aka nwa ya nwaanyị? Ma, olee ihe Ụlọikpe Kasị Elu na Denmak kpebiri n’okwu a?

29 Denmak. Nwanna nwaanyị Anita Hansen na di ya gbara alụkwaghịm. Ọ bụ onye Denmak. Di ya ahụ gbara akwụkwọ n’ụlọikpe  ka a kpọnye ya Amanda, bụ́ obere nwa ha nwaanyị dị afọ asaa, ka ya zụwa n’ihi na ya achọghị ka Anita kụziere nwa ahụ ihe gbasara okpukpe ya. N’afọ 2000, ụlọikpe a kpelaara Anita ikpe ma kpọnye ya Amanda. Onye a bụ́bu di ya wepụrụ okwu a n’ụlọikpe mkpegharị ikpe. Ụlọikpe a kagburu ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpere ma kpọnye nke nwoke nwa ha nwaanyị. Ụlọikpe a kwuru na ha chere na nwoke a ga-aka akụziri nwa ha ihe ga-abara ya uru, ebe ọ bụ na okpukpe ha abụọ anaghị akụzi otu ihe. Otú a ka Nwanna Nwaanyị Hansen si gbara aka Amanda n’ihi na ọ bụ Onyeàmà Jehova.

30 N’oge niile ihe a nọ na-eme, obi anaghị adị Nwanna Nwaanyị Hansen mma mgbe ụfọdụ. Ọ chọọ ikpe ekpere, ọ naghịkwa ama ihe ọ ga-ekpe ekpe. Ma, o kwuru, sị: “Ihe e kwuru ná Ndị Rom 8:2627 kasiri m obi. Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ama m na Jehova ma ihe ndị m rịọrọ ya. Ọ nọnyeere m, ọ na-enyekwara m aka mgbe niile.”—Gụọ Abụ Ọma 32:8; Aịzaya 41:10.

31 Nwanna Nwaanyị Hansen wepụrụ okwu a n’Ụlọikpe Kasị Elu na Denmak. Ụlọikpe a mechara kpebie ikpe a ma sị: “Ihe e kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na ya kpọnye nne ma ọ bụ nna nwa ka ọ zụọ bụ ihe ga-akacha abara nwa ahụ uru.” Ha kwukwara na ihe ọzọ e kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na ya kpọnye nne ma ọ bụ nna nwa ha bụ ụdị mbọ onye nke ọ bụla n’ime ha na-agba ma e nwee nghọtahie. E kwesịghị ịgbakwasị ụkwụ ‘n’ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi nakwa otú e si ele ha anya.’ Ụlọikpe a chọpụtara na Nwanna Nwaanyị Hansen zuru ka e mee ma a bịa n’ịzụ nwa. Ha kpọnyekwara ya Amanda ka ọ zụwa. Ikpe a e kpelaara ya mere ya obi ụtọ.

32. Olee otú Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop si gbatara ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova ọsọ enyemaka?

32 Mba ndị ọzọ dị na Yurop. E nweela ikpe ụfọdụ e kperela n’Ụlọikpe Kasị Elu e nwere ná mba ụfọdụ ma e mechaa wepụ ha n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Ihe sere okwu bụ onye ga-akpọrọ nwa mgbe di na nwunye gbara alụkwaghịm, ọ̀ bụ nke nwoke ka ọ̀ bụ nke nwaanyị. Na ha abụọ, Ụlọikpe a chọpụtara na ụlọikpe ndị mbụ kpere ikpe ndị ahụ mara ndị nke bụ́ Ndịàmà Jehova ikpe n’ihi na ha bụ Ndịàmà Jehova. Ụlọikpe Yurop a kwuru na ụlọikpe ndị mbụ ahụ kpere ikpe arụrụala. Ha kwukwara, sị: “Ọ dịghị mma ka ụlọikpe gbakwasị ụkwụ naanị n’okpukpe mmadụ na-ekpe ma otu onye ikpe.” Obi tọrọ otu nwanna nwaanyị ụtọ mgbe Ụlọikpe Yurop a kpelaara ya ikpe. O kwuru, sị: “Obi gbawara m mgbe a sị na m na-akụziri ụmụ m ihe ọjọọ, ebe o dokwaranụ m anya na ihe m na-akụziri ha bụ ihe ga-akacha baara ha uru, ya bụ, àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa.”

33. Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova si eme ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:5?

33 Ndị nne ma ọ bụ ndị nna bụ́ Ndịàmà Jehova okwu ha dị n’ụlọikpe maka na ha chọrọ ka ha na-akụziri ụmụ ha Baịbụl kwesịkwara ichebara onye bụ́bu di ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Onyeàmà Jehova echiche. (Gụọ Ndị Filipaị 4:5.) Ha kwesịrị ịghọta na onye nke ahụ na-abụghị Onyeàmà Jehova nwekwara ike ịkụziri ụmụ ha ihe ma ọ chọọ. Olee otú di ma ọ bụ nwunye bụ́ Onyeàmà Jehova ga-esi jiri ịzụ nwa ya kpọrọ ihe?

34. Gịnị ka ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-amụta n’ihe ndị Juu mere n’oge Nehemaya?

34 Iji nwee ike ịza ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe mere n’oge Nehemaya. Ndị Juu gbasiri mbọ ike ka ha wughachi mgbidi Jeruselem. Ha ma na ọ bụrụ na ha ewughachi mgbidi a, ọ ga-eme ka  mba ndị gbara ha gburugburu na-achọghị iji anya ahụ ha, ghara igbu ha na ụmụ ha. N’ihi ya, Nehemaya gwara ha, sị: “Buoronụ ụmụnne unu agha, tinyere ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, ndị nwunye unu na ebe obibi unu.” (Nehe. 4:14) Agha a baara ndị Juu uru. Ihe ahụ ha mere ka ndị nne na nna, bụ́ Ndịàmà Jehova, na-emekwa taa. Ha na-agbasi mbọ ike ka ha kụziere ụmụ ha ihe otú Chineke chọrọ. Ha ma na e nwere ọtụtụ ihe ọjọọ ụmụ ha nwere ike ịmụta n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ha bi. Ha makwa na ụmụ ha nwekwara ike ịnọ n’ụlọ ha mụta ihe ọjọọ na tiivi ma ọ bụ n’Ịntanet. Ndị nne na nna, unu echefula na ọ ga-abara unu uru, baakwara ụmụ unu uru, ma unu gbasie mbọ ike kụziere ha ihe otú Chineke chọrọ. Ihe ndị ahụ unu ga-akụziri ha ga-eme ka ha na-agbara ihe ọjọọ ọsọ, meekwa ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ.

Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Na-akwado Ndị Na-efe Ya

35, 36. Olee uru anyị riterela ná mbọ niile anyị gbarala ka e kwe ka anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ? Oleekwa ihe i kpebisiri ike ime?

35 O doro anya na Jehova na-agọzi mbọ niile ndị ya na-agba taa ka ndị ọchịchị kwe ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Mbọ niile a ndị Jehova na-agba emeela ka ha zie ma ọhaneze ma ndị ọkàikpe ma ndị ọkàiwu ozi ọma mgbe ha na-azara ọnụ ha n’ụlọikpe. (Rom 1:8) E nweela ọtụtụ ikpe ndị Chineke meriri. Otu n’ime uru ikpe ndị a bara bụ na n’ọtụtụ mba, ụmụ amaala ha na-abụghị Ndịàmà Jehova amatakwuola ihe ndị ruuru ha. Ma, ebe anyị bụ ndị Chineke, ihe anyị kwo ewepụ okwu anyị n’ụlọikpe abụghị ka anyị mee ka ihe ka mma n’obodo. Ọ bụkwanụghị ka anyị gosi na anyị bụ ndị ezi omume. Kama, ọ bụ ka ndị ọchịchị kwe ka anyị na-efe Chineke otú ọ chọrọ.—Gụọ Ndị Filipaị 1:7.

36 E nwere ọtụtụ ihe anyị na-amụta n’aka ụmụnna anyị mere ihe niile ha nwere ike ime ka e kwe ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Anyị kwesịrị iji ihe ndị ahụ kpọrọ ihe. Ka anyị gbasie mbọ ike na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ka obi siekwa anyị ike na Jehova na-enyere anyị aka n’ozi anyị na-ejere ya, nakwa na ọ ga na-enye anyị ike anyị ga-eji na-efe ya otú ọ chọrọ.—Aịza. 54:17.