Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 6

Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma—Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Na-eji Obi Ha Niile Ewepụta Onwe Ha

Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma—Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Na-eji Obi Ha Niile Ewepụta Onwe Ha

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Eze Alaeze Chineke na-ahazi imirikitimi ndị na-ezisa ozi ọma

1, 2. Olee nnukwu ọrụ Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ? Oleekwa ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịza?

NDỊ ỌCHỊCHỊ na-ekwekarị nkwa ha na-agaghị emezu. Ụfọdụ n’ime ha chọdịrị imere ndị mmadụ ihe ha kwere ha ná nkwa, ma ha anaghị enwe ike ime ya. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jizọs Kraịst, bụ́ Eze Alaeze Chineke, dị iche. Ọ na-emezu nkwa ọ bụla o kwere.

2 Mgbe e chichara Jizọs Eze n’eluigwe n’afọ 1914, o jikeere imezu otu amụma o buru ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga. Obere oge tupu e gbuo ya, ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Ozi ọma a o kwuru na a ga-ekwusa so n’otu n’ime ihe ndị anyị ga-eji amata na ọ bụrụla eze nke Alaeze Chineke. Ma, e nwere ajụjụ dị mkpa anyị kwesịrị ịza. Ajụjụ ahụ bụ, Olee otú Eze nke Alaeze Chineke ga-esi nweta ndị ga-eji obi ha niile wepụta onwe ha ikwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a? Oge ikpeazụ a bụ oge ọtụtụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ọ bụkwa oge ndị mmadụ na-anaghị ahụ ibe ha n’anya, nakwa oge ndị mmadụ na-achọghị ife Chineke. (Mat. 24:12; 2 Tim. 3:1-5) Anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ ahụ, n’ihi na ọ gbasara ezigbo Ndị Kraịst niile.

3. Gịnị ka Jizọs kwuru nke gosiri na obi siri ya ike na a ga-enwe ndị ga-ewepụta onwe ha ikwusa ozi ọma? Olee ihe mere obi ji sie ya ike?

3 Ì chetara ihe ahụ Jizọs kwuru? Otu n’ime ihe o kwuru bụ na “a ga-ekwusakwa ozi ọma.” Ihe a o kwuru, ó gosighị na obi siri ya ike na a ga-enwe ndị ga-eji obi ha niile wepụta onwe ha ikwusa ozi ọma a n’oge ikpeazụ a? À na-ajụkwa nke ahụ ajụ? Ma, olee ihe mere obi ji sie ya ike? Ọ bụ ihe ọ mụtara n’aka Nna ya. (Jọn 12:45; 14:9) Tupu Jizọs abịa n’ụwa, o ji anya ya hụ otú obi si sie Jehova ike na ndị na-efe ya ga-eji obi ha niile wepụta onwe ha ijere ya ozi. Ka anyị leba anya n’otú Jehova si gosi na obi siri ya ike na ndị ohu ya ga-ewepụta onwe ha ijere ya ozi.

“Ndị Gị Ga-eji Obi Ha Wepụta Onwe Ha”

4. Olee ọrụ Jehova gwara Ndị Izrel ka ha kwado? Oleekwa ihe ha mere?

4 Ì chetara ihe mere mgbe Jehova gwara Mozis ka ọ rụọ ụlọikwuu ndị Izrel ga-anọ na-efe Chineke? Jehova gwara Mozis ka ọ gwa ndị Izrel niile ka ha kwado ọrụ ahụ. Mozis gwara ha, sị: “Ka onye ọ bụla obi ya kpaliri weta onyinye [ọ ga-enye] Jehova.”  Ndị Izrel hà mere ihe a a gwara ha mee? O doro anya na ha mere ya. Baịbụl kwuru na ndị Izrel “nọ na-ewetara ya onyinye afọ ofufo kwa ụtụtụ.” Ihe ha wetara karịrị akarị nke na Mozis kwuru ka ‘a kwụsị ndị Izrel iwebata onyinye ha.’ (Ọpụ. 35:5; 36:3, 6) Ihe a ụmụ Izrel mere gosiri na ha emechughị Jehova ihu.

5, 6. Gịnị ka e kwuru n’Abụ Ọma nke 110:1-3 na Jehova na Jizọs tụrụ anya na ezigbo ndị na-efe Chineke ga-eme n’oge ikpeazụ?

5 Obi ò siri Jehova ike na ndị ohu ya ga-eji obi ha wepụta onwe ha ikwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a? Ee. Ihe karịrị otu puku afọ tupu a mụọ Jizọs n’ụwa, Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Devid dee gbasara ihe ndị ga-eme n’oge Mesaya ga-amalite ịchị. (Gụọ Abụ Ọma 110:1-3.) O kwuru na Jizọs ga-enwe ndị iro na-agaghị achọ ka ọ chịa ha mgbe e chiri ya eze ọhụrụ. Ọ ga-enwekwa ọtụtụ ndị ga-achọ ka ọ na-achị ha. A gaghị amanye ha amanye ijere ya ozi. Ụfọdụ n’ime ha ga-abụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa. Ha ga-eji obi ha niile wepụta onwe ha ijere Eze a ozi. Ha ga-adị ọtụtụ nke na e nwere ike iji ha tụnyere igirigi isi ụtụtụ. *

Ndị ji obi ha na-akwado Alaeze Chineke juru ebe niile dị ka igirigi (A kọwara ya na paragraf nke 5)

6 Jizọs ma na ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma nke 110 gbasara ya. (Mat. 22:42-45) Ọ bụ ya mere obi ji sie ya ike na ọ ga-enwe ndị ga-eji obi ha wepụta onwe ha ikwusa ozi ọma n’ụwa niile. È nweelanụ ndị mere otú ahụ? Eze Alaeze Chineke, ò nweela imirikitimi ndị na-ezisa ozi ọma n’oge ikpeazụ a?

“Ọrụ M Bụ Ikwusa Ozi Ọma Ọ Sị M Kwusawa”

7. Mgbe e chichara Jizọs eze, gịnị na gịnị ka o mere iji kwadebe ndị Chineke maka ọrụ ha ga-arụ?

7 Obere oge e chichara Jizọs Eze, o mere ihe ụfọdụ iji kwadebe ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee ike izisa ozi ọma ọ gwara ha na-ezisa n’ụwa niile. N’isi nke abụọ nke akwụkwọ a, anyị kwuru na Jizọs nyochara ndị ohu Chineke nọ n’ụwa ma mee ka ha dịrị ọcha malite n’afọ 1914 ruo ná mmalite nke afọ 1919. (Mal. 3:1-4) Ihe ọzọ o mere bụ ịhọpụta ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’afọ 1919 ka ọ na-edu ndị ohu Chineke nọ n’ụwa. (Mat. 24:45) Malite n’afọ ahụ gawa, ohu a malitere ịkụzikwuru ndị Chineke  ihe. Otú o si eme ya bụ ịhazi okwu dị iche iche a na-ekwu ná mgbakọ, nakwa ibipụta akwụkwọ dị iche iche. Ohu a na-eji akwụkwọ ndị a na okwu ndị ahụ a na-ekwu ná mgbakọ na-agwa Onye Kraịst ọ bụla na o kwesịrị ịna-ekwusasi ozi ọma ike.

8-10. Olee otú mgbakọ ndị e nwere si nyere ndị ohu Chineke aka ikwusasi ozi ọma ike? Mee ihe atụ. (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Mgbakọ Ndị Nyeere Ndị Jehova Aka Ịna-ekwusasi Ozi Ọma Ike.”)

8 Okwu ndị a na-ekwu ná mgbakọ. Ndị Mmụta Baịbụl chọsiri ike ka a gwa ha ihe ha ga-eme. Ọ bụ ya mere ha ji gaa mgbakọ ha nwere n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba ruo n’abalị asatọ, n’afọ 1919. Ha nwere mgbakọ a na Sida Pọịnt, Ohayo, dị n’Amerịka. Mgbakọ a bụ mgbakọ ukwu mbụ ha nwere ka a lụchara Agha Ụwa nke Mbụ. N’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ, Nwanna Rutherford gwara ndị bịara mgbakọ ahụ hoo haa ihe ha kwesịrị ime. Ọ gwara ha, sị: “Ọrụ Onye Kraịst ọ bụla nọ n’ụwa a . . . bụ ikwusa ozi ọma alaeze Onyenwe anyị.”

9 Abalị atọ Nwanna Rutherford kwuchara ihe a, o kwuru okwu mmechi isiokwu ya bụ “Okwu A Na-agwa Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ.” E mechakwara kọwaa ya n’Ụlọ Nche. Isiokwu a kọwara okwu ya ahụ na ya bụ, “Ịkpọsa Alaeze ahụ.” Nwanna Rutherford sịrị: “Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị imeda obi jụọ onwe ya, sị, Gịnị mere Chineke ji kee m n’ụwa a? Ihe o kwesịrị ịgwa onwe ya bụ na Onyenwe anyị kere m ka m nọchite anya ya n’ụwa a, na-ezisara ndị ụwa ozi ọma ka ha na ya nwee ike dịrị ná mma. Ọrụ m bụ ikwusa ozi ọma ọ sị m kwusawa.”

10 N’okwu ahụ Nwanna Rutherford kwuru, ọ gwara ndị bịara mgbakọ ahụ na a ga-amalite ibipụta magazin ọhụrụ. Aha magazin a bụ The Golden Age, (ma, aha ya ugbu a bụ Teta!). Magazin a ga-enyere ndị mmadụ aka ịghọta na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu ụmụ mmadụ nwere. Ọ jụziri ndị niile bịara mgbakọ ahụ mmadụ ole n’ime ha ga-achọ inye ndị mmadụ magazin a n’ozi ọma. Mgbe ọ jụchara ajụjụ a, ndị lekọtara mgbakọ ahụ kọrọ ihe merenụ. Ha sịrị: “Puku mmadụ isii bịara mgbakọ ahụ biliri ọtọ iji gosi na ha niile ga-eji magazin ahụ na-aga ozi ọma.” * O doola anya ugbu a na Eze Alaeze Chineke enwetala ndị ji obi ha niile wepụta onwe ha ịkọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke.

11, 12. Gịnị ka e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke July 1, 1920 gbasara mgbe a ga-amalite ikwusa ozi ọma Jizọs kwuru na a ga-ekwusa?

11 Akwụkwọ anyị. N’Ụlọ Nche anyị, a na-eme ka ihe mere anyị kwesịrị iji na-ezi ozi ọma Jizọs kwuru na a ga-ezi dokwuo anya. Legodị otú e si mee nke a n’agbata afọ 1920 na afọ 1922.

12 Gịnị bụ ozi ọma ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:14 na a ga-ekwusa? Olee mgbe a ga-ekwusa ya? E nwere otu ihe isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke July 1, 1920, kwuru. Isiokwu ahụ bụ “Ozi Ọma Alaeze Chineke.” N’isiokwu a, a kọwara ihe ozi ọma a a ga-ekwusa bụ. E kwuru, sị: “Ozi ọma ahụ Jizọs sị na a ga-ekwusa bụ gbasara ọgwụgwụ nke ụwa ochie a nakwa mgbe Alaeze Mesaya ga-amalite ịchị.” Ihe ọzọ e kwukwara n’isiokwu ahụ bụ mgbe a ga-amalite ikwusa ozi ọma a Jizọs kwuru okwu ya. E kwuru, sị: “A ga-ekwusa ozi ọma a n’agbata Agha Ụwa nke Mbụ na oge ‘oké mkpagbu.’” Ọ bụ ya mere e ji kwuo  n’isiokwu ahụ, sị: “Ugbu a bụ oge . . . ikwusara ndị Krisendọm niile ozi ọma a.”

13. N’Ụlọ Nche Bekee nke March 15, 1921, olee ihe a gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha mee?

13 À ga-amanye ndị ohu Chineke ka ha kwusaa ozi ọma a Jizọs kwuru ka e kwusaa? Mbanụ. E nwere otu ihe isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke March 15, 1921, kwuru. Isiokwu ahụ bụ “Nweenụ Obi Ike.” A gwara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka ha jiri obi ha wepụta onwe ha ikwusa ozi ọma. A gwakwara onye ọ bụla n’ime ha ka ọ jụọ onwe ya, sị: “Ihe ọma Chineke kacha meere m ọ́ bụghị ikwusa ozi ọma a Jizọs sị ka e kwusaa?” E kwukwara n’isiokwu ahụ, sị: “O doro anyị anya na ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị aghọta na ozi ọma a Jizọs sị ka anyị kwusaa bụ ihe ọma Chineke meere anyị, ọ ga-eme ka anyị dị ka Jeremaya. N’obi Jeremaya, okwu Onyenwe anyị ‘dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ [ya].’ Nke a mere ka ọ ghara ịgbachi nkịtị.” (Jere. 20:9) Ihe a a gwara ụmụnna anyị ndị a gosiri na obi siri Jehova na Jizọs ike na a ga-enwe ndị ga-akwadosi Alaeze Chineke ike.

14, 15. N’Ụlọ Nche Bekee nke August 15, 1922, olee otú a chọrọ ka Ndị Kraịst e tere mmanụ si na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

14 Olee otú ezigbo Ndị Kraịst ga-esi ezi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke? Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee nke August 15, 1922, kwuru otú ha ga-esi eme ya. Isiokwu ahụ bụ “Ikwusa Ozi Ọma Dị Oké Mkpa.” A gwara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka ha “na-agbasi mbọ ike enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị ma na-agakwa n’ụlọ ha ezi ha ozi ọma. Ha ga na-akọrọ ndị mmadụ na alaeze eluigwe dị nso.”

15 O doro anya na malite n’afọ 1919 gawa, Kraịst ji ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, na-ekwusi okwu ike na Onye Kraịst ọ bụla nọ n’ụwa kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ndị mbụ so ná Ndị Mmụta Baịbụl, hà kwusara ozi ọma Alaeze Chineke otú ahụ a gwara ha mee?

“Ezigbo Ndị Kraịst Ga-ewepụta Onwe Ha”

16. Mgbe a gwara ndị Jehova na ha kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma, olee ihe ndị okenye ụfọdụ mere?

16 N’agbata afọ 1921 na afọ 1939, ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl achọghị iji ntị anụ na Ndị Kraịst niile e tere mmanụ kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Ụlọ Nche Bekee nke November 1, 1927, kwuru ihe merenụ. Ọ sịrị: “E nwere ndị okenye taa n’ọgbakọ . . . na-achọghị ịgba ụmụnna ha ume ka ha na-ekwusa ozi ọma. Hanwa anakwaghị aga ozi ọma. . . . Obi adịghị ha mma na e kwuru na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-aga n’ụlọ n’ụlọ ezi ndị mmadụ ozi ọma gbasara Chineke, Eze Alaeze Chineke nakwa Alaeze Chineke.” Ụlọ Nche ahụ kwuru hoo haa, sị: “Oge eruola ka ezigbo Ndị Kraịst niile hụwa ndị dị otú ahụ ama ma na-eze ha eze. Ha ga-agwakwa ha na anyị achọghịzi ka ha bụrụ ndị okenye n’ọgbakọ.” *

17, 18. Olee ihe ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ mere mgbe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi gwara ha ihe ha ga-eme? Oleekwa otú ọtụtụ nde mmadụ sirila na-eme ya kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a?

17 Otu ihe ọma merenụ bụ na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ji obi ha niile mee ihe a ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru. Ha weere na Chineke meere ha ihe ọma sị ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze ya. Ụlọ Nche Bekee nke March 15, 1926, kwuru, sị: “Ezigbo Ndị  Kraịst ga-ewepụta onwe ha . . . izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke.” Ụmụnna ndị a mere ihe ahụ e kwuru n’Abụ Ọma nke 110:3. Ha ji obi ha niile wepụta onwe ha na-akwado Mesaya bụ́ Eze Alaeze Chineke.

18 Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’isiokwu ole na ole ga-eso isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ụmụnna ndị a sirila na-ekwusa ozi ọma nakwa uru ndị ọ barala. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe mere ọtụtụ nde mmadụ ji jiri obi ha niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa ebe onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ka anyị na-eleba anya n’ihe mere ha ji mee ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị mere m ji na-ezi ndị ọzọ ozi ọma?’

‘Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ’

19. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eme ihe a o kwuru?

19 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Mat. 6:33) Gịnị mere anyị ji eme ihe a Jizọs kwuru? Ọ bụ n’ihi na anyị ghọtara na Alaeze Chineke dị ezigbo mkpa. Anyị ma na ọ bụ ya ka Chineke ga-eji eme ihe ndị o zubere ime. N’isiokwu nke ise n’akwụkwọ a, anyị lebara anya n’otú mmụọ nsọ si jiri nwayọọ nwayọọ na-eme ka ndị ohu Chineke na-aghọta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ihe ndị anyị ghọtara gbasara Alaeze Chineke eruo anyị n’obi, ọ na-eme ka anyị chọwa ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.

Obi tọrọ otu nwoke ụtọ mgbe ọ hụrụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e zoro n’ala. Obi na-atọkwa Ndị Kraịst ụtọ mgbe ha mụtara eziokwu gbasara Alaeze Chineke (A kọwara ya na paragraf nke 20)

20. Olee ihe ihe atụ Jizọs mere gbasara akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e zoro n’ala na-akụziri anyị?

20 Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya ga-eme ihe ahụ ọ gwara ha, ya bụ, ka ha buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ka anyị leba anya n’ihe atụ o mere banyere otu nwoke hụrụ akụ̀ dị oke ọnụ ahịa e zoro n’ala. (Gụọ Matiu 13:44.) N’ihe atụ ahụ, o kwuru na otu nwoke hụrụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa e zoro n’ala. Ozugbo ọ hụrụ ya, ya amata na ọ bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Gịnị ka nwoke a mere? Jizọs kwuru na “n’ihi ọṅụ o nwere, ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ.” Olee ihe ihe atụ a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na anyị amụta eziokwu gbasara Alaeze Chineke ma ghọta na ọ bara ezigbo uru, anyị ga-eji obi ụtọ hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị nwee ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. *

21, 22. Olee otú ndị na-akwadosi Alaeze Chineke ike si egosi na ha na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke? Mee ihe atụ.

21 Ndị na-akwadosi Alaeze Chineke ike na-eme ihe ndị na-egosi na ha na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke. Ha na-eji ma ndụ ha ma ihe niile ha nwere na-akwado ozi ọma Alaeze Chineke. Ọtụtụ n’ime ha ahapụla ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwee ike ịbụ ndị ozi oge niile. Ndị a niile ma na Jehova na-agọzi ndị na-ebu ụzọ achọ Alaeze ya. Ka anyị leba anya n’otú Jehova si gọzie otu di na nwunye jere ozi oge niile ọtụtụ afọ gara aga.

22 N’ihe dị ka afọ 1929, Avery Bristow na nwunye ya Lovenia, malitere ije ozi n’ebe ọdịda anyanwụ Amerịka. Ha bụ ndị kọpọtụa ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Nwanna Nwaanyị Lovenia kwuru ihe ndị merenụ ka ha jerela ozi ọtụtụ afọ n’ebe  ahụ. Ọ sịrị: “Obi dị mụ na di m ụtọ kemgbe ọtụtụ afọ anyị bụ ndị ọsụ ụzọ. E nwere oge ụfọdụ anyị na-anaghị enwe ego nri ma ọ bụ ego mmanụ ụgbọala. Anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme eme. Ma, mgbe ọ bụla ihe siiri anyị ike otú a, Jehova na-enye anyị ihe ahụ na-akpa anyị. Ọ dịtụghị mgbe anyị hapụrụ ozi anyị. Ọ dịghị mgbe ihe ndị dị anyị ezigbo mkpa kọrọ anyị.” Nwanna Nwaanyị Lovenia kwuru ihe mere ha otu ụbọchị ha na-eje ozi ọma na Pensakola dị na Flọrịda. O kwuru na n’ụbọchị ahụ, ha enweghị ego, ha enweghịkwa ihe oriri. Ma mgbe ha mechiri ozi lọta n’ụlọ ha, ha hụrụ nnukwu akpa nri abụọ na otu mpempe akwụkwọ e dere ihe na ya. E dere ná mpempe akwụkwọ ahụ, sị: “Ọ bụ ọgbakọ Pensakola nyere unu ihe ndị a. Anyị hụrụ unu n’anya.” Lovenia kwuru otú Jehova sirila gọzie ha. Ọ sịrị: “Ọ dịghị mgbe Jehova hapụrụ anyị. Ọ dịghịkwa mgbe anyị kwara mmakwaara na anyị tụkwasịrị ya obi.”

23. Olee otú obi dị gị maka eziokwu Alaeze Chineke ị mụtara? Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

23 O doro anya na anyị niile agaghị abụcha ndị ọsụ ụzọ oge niile. Otú ihe si dịrị anyị niile abughị otu. Ma, anyị niile nwere ike iji obi anyị dum na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ bụ ihe ọma pụrụ iche Jehova meere anyị. (Kọl. 3:23) Ebe ọ bụ na ihe ndị bụ́ eziokwu anyị mụtara gbasara Alaeze Chineke dị oké ọnụ ahịa n’anya anyị, anyị dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme, ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma otú anyị nwere ike. Ị̀ ga-eme otú ahụ?

24. Olee otu ihe kachanụ Chineke ji Alaeze ya na-eme n’oge ikpeazụ a?

24 Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, Eze Alaeze Chineke na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka ka ha na-ezi ozi ọma o kwuru okwu ya na Matiu 24:14. Ọ naghịkwa amanye ha amanye ime ya. Ndị na-eso ụzọ ya ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma a ebe ọ bụ na o nweghịzi ihe jikọrọ ha na ụwa a na-achọ ihe na-abara naanị ya uru. Ozi ọma a Jizọs kwuru na a ga-ekwusa so n’otu n’ime ihe ndị anyị ga-eji amata na ọ bụrụla eze nke Alaeze Chineke. O sokwa n’ihe kachanụ Chineke ji Alaeze ya na-eme n’oge ikpeazụ a.

^ para. 5 Na Baịbụl, e ji igirigi tụnyere ihe dị ọtụtụ.—Jen. 27:28; Maị. 5:7.

^ para. 10 Otu akwụkwọ anyị aha ya bụ To Whom the Work Is Entrusted kwuru, sị: “A ga na-eji The Golden Age ezi ozi ọma alaeze n’ụlọ n’ụlọ. . . . Mgbe e zichara mmadụ ozi ọma, a ga-enye ya otu The Golden Age, ma onye ahụ ọ tụrụ ọda ya ma ọ bụ na ọ tụghị.” Mgbe ọtụtụ afọ gachara, a gwara ụmụnna anyị ka ha na-agwa ndị ha ziri ozi ọma ka ha tụọ ọda The Golden Age na nwanne ya bụ́ Ụlọ Nche. Malite n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1940, a gwara ụmụnna anyị ka ha na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! A gwakwara ha ka ha na-ede mkpụrụ ole ha nyefere ndị mmadụ n’ọnwa ọ bụla.

^ para. 16 N’oge ahụ, ọ bụ ọgbakọ na-ahọpụta ndị okenye. Ha na-eji ntụli aka ahọpụta ha. N’ihi ya, ọgbakọ nwere ike ịjụ ịtụli aka elu mgbe a chọrọ ịhọpụta onye na-agba ije ozi ọma ụkwụ. N’isi nke iri na abụọ n’akwụkwọ a, anyị ga-eleba anya n’otu e si kwụsị iji ntụli aka elu na-ahọpụta ndị okenye ma na-ahọpụtazi ha otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.

^ para. 20 Ihe atụ ọzọ Jizọs mere bụ gbasara onye ahịa nke na-achọ nkume pel ọma. Mgbe onye ahịa ahụ chọtara ya, o rere ihe niile o nwere zụta ya. (Mat. 13:45, 46) Ihe atụ abụọ ahụ na-akụziri anyị na anyị nwere ike isi ụzọ dị iche iche mụta eziokwu gbasara Alaeze Chineke. O nwere ndị e nwere ike ịsị na ha achọghị ya achọ hụ ya, nweekwa ndị chọrọ ya achọ tupu ha achọta ya. Ma, n’agbanyeghị otú anyị si mụta eziokwu a, anyị niile dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị nwee ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.

GỤKWUO GBASARA YA

Ị̀ “Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”?

Isiokwu a kwuru otú ozi ọma anyị na-ekwusa na àgwà ọma anyị na-akpa si eme ka ndị mmadụ fewe Chineke.

Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute

Olee otú ụmụnna merela agadi nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?