Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 10

Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị Ọcha

Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị Ọcha

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ihe mere Jizọs ji eme ka ọgbakọ ya dị ọcha nakwa otú o si eme ya

1-3. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka a na-eme ihe na-adịghị mma n’ụlọ nsọ Chineke?

MGBE Jizọs nọ n’ụwa, o ji ụlọ nsọ Jeruselem kpọrọ ihe n’ihi na ọ ma ihe ọ nọchiri anya ya. O teela a nọwara n’ụlọ nsọ ahụ na-efe Jehova ofufe. Ma, e kwesịrị ịnọ ebe ahụ na-efe Jehova Chineke anyị dị nsọ ofufe otú ọ chọrọ. N’abalị iri n’ọnwa Naịsan, afọ 33, Jizọs batara n’ụlọ nsọ ahụ ma hụ ka ndị mmadụ kpachaara anya na-eme ihe Chineke kpọrọ asị. Chegodị otú obi dị Jizọs mgbe ọ hụrụ ha. Gịnịdị ka ha nọ na-eme?—Gụọ Matiu 21:12, 13.

2 E nwere ogige ndị Jentaịl n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ ebe ahụ ka ụfọdụ ndị chọrọ ịzụrụ ihe ha ga-eji chụọrọ Jehova àjà na-aga azụrụ ya. Ma ndị na-eresị ha ihe ndị ahụ ma ndị na-agbanwere ha ego na-erigbu ha. * Mgbe Jizọs hụrụ ihe a na-emenụ, ‘ọ chụpụrụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego ihu n’ala.’ (Tụlee Nehemaya 13:7-9.) Ọ katọrọ ndị anyaukwu a maka otú a ha si jiri ụlọ Nna ya mere “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ihe a Jizọs mere gosiri na o jighị ụlọ nsọ ahụ egwu egwu, ọ makwa ihe ọ nọchiri anya ya. Ọ chọsiri ike ka a na-efe Nna ya ofufe otú kwesịrị ekwesị n’ụlọ nsọ ahụ.

3 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, e chiri Jizọs Eze. O teghịkwa aka, ya emee ka ụlọ nsọ ọzọ dị ọcha. Ndị nọ n’ụlọ nsọ a bụ ndị niile chọrọ ife Jehova otú ọ chọrọ taa. Gịnị bụ ụlọ nsọ a Jizọs mere ka ọ dị ọcha?

Ime “Ka Ụmụ Livaị Dị Ọcha”

4, 5. (a) Olee otú e si mee ka ndị e tere mmanụ dịrị ọcha malite n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919? (b) À kwụsịrị ịna-eme ka ndị Jehova dịrị ọcha n’afọ 1919? Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ?

4 N’isi nke abụọ n’akwụkwọ a, anyị kwuru na mgbe e chichara Jizọs eze n’afọ 1914, ya na Nna ya bịara nyochaa otu ụlọ nsọ ihe atụ. Ụlọ nsọ ihe atụ ahụ bụ ndokwa Jehova mere ka a na-efe ya otú ọ chọrọ. * Mgbe Eze Jizọs nyochara ụlọ nsọ a, ọ chọpụtara na e kwesịrị ime ka Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị a na-akpọ “ụmụ Livaị,” dịkwuo ọcha. (Mal. 3:1-3) Malite n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919, Jehova, bụ́ “Onye na-anụcha ihe,” gbara nkịtị e si n’ụzọ dị iche iche nwaa ndị ya ọnwụnwa, ihe  esiekwara ha ezigbo ike. Ihe a niile nyere aka mee ka ha dị ọcha. Ugbu a ndị a e tere mmanụ bịara dịrị otú Jehova chọrọ ka ha dịrị, ha ejikerela ịkwado Mesaya bụ́ Eze.

5 À kwụsịrị ịna-eme ka ndị Chineke dị ọcha n’afọ 1919? Mba. N’oge ikpeazụ a, Jehova si n’aka Mesaya bụ́ Eze enyere ndị ya aka ka ha na-adị ọcha ka ha nwee ike ịnọgide n’ụlọ nsọ ya. N’isiokwu abụọ ndị na-esochi isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova sirila mee ka ha na-akpakwu àgwà ọma, na otú o sirila mee ka ọgbakọ ya dịkwuo ọcha. Ma, ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’otú e si na-eme ka ha na-efe ya otú ọ chọrọ. Okwukwe anyị ga-esikwu ike ma anyị leba anya n’ihe niile Jizọs merela iji nyere ndị ya aka ka ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ.

“Debenụ Onwe Unu Ọcha”

6. Olee otú iwu Jehova nyere ndị Juu a dọọrọ n’agha ga-esi enyere anyị aka ịghọta otú e si efe Chineke?

6 Olee otú e si efe Jehova otú ọ chọrọ? Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ya bụ ileba anya n’ihe Jehova gwara ndị Juu obere oge tupu ha esi na Babịlọn pụta n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. (Gụọ Aịzaya 52:11.) Ihe kacha mkpa mere ndị Juu ji alaghachi Jeruselem bụ ka ha wughachi ụlọ nsọ ha ga-anọ na-efe Chineke otú ọ chọrọ. (Ezra 1:2-4) Jehova chọrọ ka ndị ya hụ na aka ha adịghị n’ihe ọ bụla gbasara otú ndị Babịlọn si ekpere chi ha. Ọ gwara ha, sị: ‘Unu emetụla ihe na-adịghị ọcha aka, sinụ n’etiti ya pụọ, debekwanụ onwe unu ọcha.’ Jehova achọghị ka e si otú ọzọ fee ya ma ọ bụghị otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya. Gịnị ka ndị chọrọ ife Chineke otú ọ chọrọ na-eme? Ha anaghị ekwere ihe ndị okpukpe ụgha na-akụzi, ha anaghịkwa eme ihe ndị okpukpe ụgha na-eme.

7. Ole ndị ka Jizọs ji enyere Ndị Kraịst aka ka ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ?

7 Obere oge e chichara Jizọs Eze, ọ họpụtara ndị ọ ga-esi n’aka ha na-enyere ndị ya aka ịna-efe Chineke otú kwesịrị ekwesị. Ọ họpụtara ha n’afọ 1919. Ọ kpọrọ ha ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. (Mat. 24:45) Tupu afọ 1919 agafee, Ndị Mmụta Baịbụl akwụsịla ikwere n’ọtụtụ ihe ndị okpukpe ụgha na-akụzi. Ma, a ka nwekwara ihe ndị ọzọ ha kwesịrị ime iji na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Jizọs Kraịst ji nwayọọ nwayọọ si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mee ka ndị ya mara na e nwere omenala na ememme ndị ha kwesịrị ịkwụsị ịna-eme. (Ilu 4:18) Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịna-agba Krismas?

8. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl ma kemgbe gbasara Krismas? Ma, olee ihe ha na-aghọtaghị ozugbo banyere ya?

8 O teela Ndị Mmụta Baịbụl matara na Krismas si n’ememme ndị ọgọ mmụọ malite, nakwa na a mụghị Jizọs n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba. Ụlọ Nche Bekee nke December afọ 1881, kwuru, sị: “Ọtụtụ nde ndị ọgọ mmụọ bịara  ghọọ ndị chọọchị. Ma, ihe ha mere bụ ịzagharị aha, kwụsị ịza ndị dibịa afa zawazie ndị ụkọchukwu. Ha gụgharịkwara ememme ndị ọgọ mmụọ ha aha, ka ha dị ka hà bụ ememme Ndị Kraịst. Otu n’ime ememme ndị a ha gụgharịrị aha bụ Krismas.” N’isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee n’afọ 1883, e mere ka a mata na a mụrụ Jizọs n’ihe dị ka ná mmalite ọnwa Ọktoba. Isiokwu ahụ bụ “Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?” * N’agbanyeghị ihe ndị a niile Ndị Mmụta Baịbụl matara, ha aghọtaghị ozugbo na ha kwesịrị ịkwụsị ịna-agba Krismas. N’oge ahụ ndị Betel nọ na Bruklin nọkwa na-agba Krismas. Ma, n’afọ 1926, ihe bịara gbanwee. Gịnị mere?

9. Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl mechara ghọta banyere Krismas?

9 Ndị Mmụta Baịbụl lebakwuru anya n’okwu gbasara ịgba Krismas ma ghọta na ememme a si n’aka ndị ọgọ mmụọ, nakwa na ihe ndị a na-eme na ya anaghị enye Chineke otuto. E nwere ihe e kwuru n’otu isiokwu gbara na Teta! Bekee nke December 14, 1927. E kwuru na Krismas bụ ememme ndị ọgọ mmụọ, na ihe e ji mara ya bụ oriri na nkwari na ikpere arụsị. E kwukwara na Kraịst agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-agba Krismas. Ihe ọzọ isiokwu ahụ kwuru bụ: “Ebe ọ bụ na Ekwensu na ụwa ya kwadoro ka a na-agba Krismas, ndị niile ji obi ha na-ejere Jehova ozi ekwesịtụghị inwe ihe jikọrọ ha na Krismas.” Ọ bụ ya mere ndị Betel agbaghị Krismas n’afọ 1927. Sikwa mgbe ahụ gawa, ha agbaghị ya ọzọ.

10. (a) Olee ihe e mere ka ndị mmadụ ghọtakwuo banyere Krismas n’ọnwa Disemba afọ 1928? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú Krismas Si Malite na Ihe Mere E Ji Agba Ya.”) (b) Olee otú e si mee ka ndị Chineke ghọta na e nwekwara ememme ndị ọzọ ha kwesịrị ịkwụsị ime? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Otú E Si Mee Ka A Mara Ememme Ndị Ọzọ Na-adịghị Mma.”)

10 N’afọ 1928, a kọwakwuuru Ndị Mmụta Baịbụl ihe mere ha ga-eji kwụsị ịgba Krismas. N’abalị iri na abụọ n’ọnwa Di semba afọ 1928, Nwanna Richard H. Barber, onye na-eje ozi na Betel dị n’isi ụlọ ọrụ anyị, kwuru okwu na redio. Ọ kọwara n’okwu ya ahụ na ọ bụ ndị ọgọ mmụọ malitere ememme Krismas. Olee ihe ụmụnna anyị mere mgbe a kọwaara ha ihe mere ha kwesịrị iji kwụsị ịgba Krismas? Otu nwanna nwoke aha ya bụ Charles Brandlein kọrọ otú ya na ezinụlọ ya si lee ihe a a gwara ha mee anya. Ọ sịrị: “Ò wutere anyị na a gwara anyị kwụsị ime ememme a ndị ọgọ mmụọ na-eme? Mbanụ. . . . Ịkwụsị ime ya yiri mmadụ iyipụ uwe ruru unyi o yi ma tụfuo ya.” Nwanna Henry A. Cantwell kwukwara ihe yiri ihe a Nwanna Charles kwuru. Nwanna Henry mechara bụrụ onye nlekọta sekit. O kwuru, sị: “Obi dị anyị ụtọ na anyị kwụsịrị ịgba Krismas n’ihi na anyị si otú ahụ gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya.” Ndị na-erubere Kraịst isi dị njikere ime ihe ọ bụla ọ sị ha mee. Ha achọkwaghị ime ememme ndị ọgọ mmụọ. *Jọn 15:19; 17:14.

11. Olee otú anyị ga-esị gosi na anyị na-akwado Mesaya anyị bụ́ Eze?

11 Ihe a niile Ndị Mmụta Baịbụl mere bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Ihe a ha mere kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Olee otú m si were ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi gwara anyị na-eme? Àna m eji obi m niile anabata ya. M̀ na-eme ihe ndị m na-amụta ná nzukọ Jehova?’ Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-eme ihe a gwara anyị, ọ na-egosi na anyị na-akwado Eze Mesaya. Eze Mesaya a ji ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-akụziri anyị ihe n’oge kwesịrị ekwesị.—Ọrụ 16:4, 5.

 Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Iji Obe Efe Chineke?

Ihe a bụ obe ahụ a kpụkọtara ya na okpueze (A kọwara ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. Olee otú Ndị Mmụta Baịbụl si lee obe anya ruo ọtụtụ afọ?

12 Ruo ọtụtụ afọ, Ndị Mmụta Baịbụl weere ya na obe bụ ihe e kwesịrị iji na-amata Ndị Kraịst. Ma o doro ha anya na e kwesịghị ife ya ofufe, n’ihi na ha ghọtara na ime otú ahụ bụ ikpere arụsị. (1 Kọr. 10:14; 1 Jọn 5:21) N’afọ 1883, e kwuru n’Ụlọ Nche hoo haa na “Ikpere arụsị bụ ihe arụ n’anya Chineke.” N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl echeghị na ọ dị njọ ma ha jiri ya na-eme ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha na-adụnye obe a kpụkọtara ya na okpueze n’uwe ha ọ bụla. Ha chere na ihe a ha dụnyere n’efe ha na-echetara ha na ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi ruo ọnwụ, Chineke ga-enye ha okpueze nke ndụ. Malite n’afọ 1891, obe na okpueze a a kpụkọtara ọnụ malitere ịgba n’ihu Ụlọ Nche.

13. Olee ihe a kụzikwuuru ụmụnna anyị banyere obe? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ E Ji Nwayọọ Nwayọọ Kụzikwuoro Ha Ihe Banyere Obe.”)

13 Ndị Mmụta Baịbụl ejighị obe na okpueze ahụ a kpụkọtara ọnụ egwuri egwu. Ma, n’ihe dị ka afọ 1928, a bịara jiri nwayọọ nwayọọ na-akụziri Ndị Kraịst ihe banyere obe. Otu nwanna aha ya bụ Grant Suiter kwuru ihe a kụziiri ha ná mgbakọ ha gara n’afọ 1928 n’obodo Ditrọịt dị na Mishigan, n’Amerịka. Nwanna a mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Ọ sịrị: “A gwara anyị na e kwesịkwaghị inwe ihe jikọrọ anyị na obe na okpueze ahụ anyị na-adụnye n’uwe.” N’afọ ole na ole ndị sochirinụ, a kụzikwuuru anyị ihe banyere obe. E mere ka o doo anyị anya na ezigbo Ndị Kraịst ekwesịghị inwe ihe jikọrọ ha na obe.

14. Gịnị ka ụmụnna anyị mere mgbe e ji nwayọọ nwayọọ kụzikwuoro ha ihe gbasara obe?

14 Olee ihe ụmụnna anyị mere gbasara ihe ndị a e ji nwayọọ nwayọọ kụziere ha banyere obe? Hà siri ọnwụ na-adụnye obe na okpueze ahụ n’uwe ha, ebe ọ bụ na ọ na-atọ ha ụtọ? Otu nwanna jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ kwuru ihe mere mgbe ahụ. Aha ya bụ Lela Roberts. Ọ sịrị: “Anyị kwụsịrị ịdụnye ya n’uwe anyị ozugbo anyị ghọtara ihe ọ bụ.” Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ursula Serenco kwuru otú obi dị ya. Otú a obi dị ya ka ọ dịkwa ọtụtụ ụmụnna anyị n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Anyị amaghị na ihe a anyị na-adụnye n’uwe anyị, nke anyị ji echeta ọnwụ Onyenwe anyị, nakwa nke anyị ji egosi na anyị ji obi anyị dum na-ejere Chineke ozi, bụ ihe ndị ọgọ mmụọ. Obi dị anyị ụtọ na ihe e kwuru n’akwụkwọ Ilu 4:18 mezuru n’isi anyị, n’ihi na Jehova mere ka ìhè eziokwu dị na Baịbụl nwukwuoro anyị.” Ezigbo Ndị Kraịst achọghị ka e nwee ihe ọ bụla jikọrọ ha na okpukpe ụgha.

15, 16. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ekpebisiela ike ime ka nzukọ Jehova na-adị ọcha?

15 Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị anyị taa. Anyị ma na Kraịst si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-enyere ndị ya aka ka ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ọ bụ ya mere na a gwahaala anyị na omenala ma ọ bụ ememme ndị anyị na-eme bụ nke ndị okpukpe ụgha, anyị na-akwụsị ime ya ozugbo. Anyị ekpebiela na, mee elu, mee ala, anyị ga na-eme ka nzukọ Jehova na-adị ọcha otú ahụ ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ ihe dị ka otu narị afọ gara aga mere.

 16 Kemgbe oge ikpeazụ a, Kraịst nọ na-eme ka ụmụnna ụgha ghara imerụ ọgbakọ ya. Olee otú o si na-eme ya? Ka anyị chọpụta.

Ikewapụ “Ndị Ajọ Omume n’Etiti Ndị Ezi Omume”

17, 18. N’ihe atụ Jizọs ji ụgbụ mee, gịnị ka ihe ndị a pụtara? (a) Ịwụnye ụgbụ n’oké osimiri, (b) ‘ikpokọta ụdị azụ̀ niile,’ (ch) ịchịkọta azụ̀ ndị dị mma wụnye ha n’arịa dị iche iche, na (d) ịtụfu azụ̀ ndị na-adịghị mma.

17 Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-eduzi ọgbakọ ndị Jehova niile nọ n’ụwa. Ya na ndị mmụọ ozi nọ na-ekewa ndị mmadụ otú anyị na-enweghị ike ịghọtacha. Jizọs ji ihe atụ ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri tụnyere ihe a ya na ndị mmụọ ozi na-eme. (Gụọ Matiu 13:47-50.) Gịnị ka ihe atụ a pụtara?

Ụgbụ a a wụnyere n’oké osimiri nọchiri anya ozi ọma Alaeze a na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile (A kọwara ya na paragraf nke 18)

18 “Ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri.” Ụgbụ a nọchiri anya ozi ọma Alaeze a na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile. ‘Ikpokọta ụdị azụ̀ niile.’ Ụdị mmadụ dị iche iche na-anụ ozi ọma ahụ taa. E nwere ndị a na-ezi ya ha emechaa ghọọ ezigbo Ndị Kraịst, nweekwa ndị a na-ezi ya, ha enwetụ mmasị, ma ha anaghị aghọ Ndị Kraịst. * Ịchịkọta ‘azụ̀ ndị dị mma wụnye ha n’arịa dị iche iche.’ A na-akpọbata ndị niile ọ na-agụ agụ ịmụta ihe banyere Chineke n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst ka ha na-efe Jehova otú ọ chọrọ. Ịtụfu azụ̀ “ndị na-adịghị mma.” Kemgbe oge ikpeazụ a, Kraịst na ndị mmụọ ozi nọ na-ekewapụ “ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume.” * Ọ bụ ya mere na ndị na-achọghị ịhapụ ozizi ụgha na omenala ndị na-adịghị mma enwebeghị ike imerụ ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst. *

19. Olee otú obi dị gị n’ihi otú Kraịst si eme ka nzukọ Jehova nakwa ndị Jehova na-adị ọcha?

19 Obi siri anyị ike na Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-echebe ndị niile na-erubere ya isi. Obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ na o ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka nzukọ Jehova na ndị Jehova na-adị ọcha otú ahụ o mere ka ụlọ nsọ dị na Jeruselem dịrị ọcha n’oge ọ na-eje ozi n’ụwa. Anyị na-ekele Jehova na o mere ka Kraịst ghara ikwe ka e merụọ nzukọ ya nakwa ndị na-efe ya. Anyị kwesịrị ịna-akwado Eze anyị na Alaeze ya. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ isepụ ụkwụ na aka anyị n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha.

^ para. 2 E nwere ụdị ego ndị Juu si ebe ọzọ bịa Jeruselem na-eji akwụ ụtụ isi ha kwa afọ. Ndị na-agbanwe ego na-ana ha ego mgbe ha na-agbanwere ha ego kịrịkịrị ha ji bịa. Ihe ọzọ bụkwa na, ndị Juu a si esi bịa na-azụ anụmanụ ha na-eji achụrụ Chineke àjà. Jizọs kpọrọ ma ndị na-agbanwere ha ego ma ndị na-eresị ha anụmanụ ndị ahụ “ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kpọọ ha aha a bụ n’ihi na ha na-ana ha ego karịrị akarị.

^ para. 4 Ndị Jehova nọ n’ụwa taa nọ ná nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ ya.

^ para. 8 E kwukwara n’isiokwu a na oge oyi ahụ a sị na a mụrụ Jizọs “adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru, n’ihi na Baịbụl kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha nọ n’èzí n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs.”—Luk 2:8.

^ para. 10 Nwanna Frederick W. Franz dere otu akwụkwọ ozi n’abalị iri na anọ n’ọnwa Nọvemba afọ 1927. O dere, sị: “Anyị agaghị agba Krismas nke afọ a. Ndị ezinụlọ Betel ekwekọrịtala na ha agaghị agbakwa Krismas.” Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Nwanna Franz dekwara akwụkwọ ozi ọzọ n’abalị isii n’ọnwa Febụwarị afọ 1928. O dere, sị: “Onyenwe anyị ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka anyị na-adị ọcha, ka anyị ghara ịna-eme ihe ndị okpukpe ụgha na-eme.”

^ para. 18 Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa e nwere n’afọ 2013 dị nde asaa, narị puku itoolu na puku iri isii na puku ise, na narị itoolu na iri ise na anọ, ebe ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs dị nde mmadụ iri na itoolu, narị puku abụọ na puku iri anọ na otu puku, na narị abụọ na iri ise na abụọ.

^ para. 18 Ịhọpụta azụ̀ ndị dị mma n’etiti azụ̀ ndị na-adịghị mma dị iche n’ikewapụta atụrụ n’ebe ewu nọ. (Mat. 25:31-46) Ọ bụ n’oké mkpagbu ka Jizọs ga-ekewapụta ndị bụ́ atụrụ n’etiti ndị bụ́ ewu. Tupu mgbe ahụ, ndị a yiri azụ̀ ndị na-adịghị mma nwere ike ịlọghachikwute Jehova, ma bata n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst.—Mal. 3:7.

^ para. 18 A ga-emecha tụba ndị ajọ omume a n’ọkụ ihe atụ, ya bụ, na Chineke ga-ebibi ha n’ọdịnihu.

GỤKWUO GBASARA YA

Ì Ji Ihe Nketa Jehova Nyere Anyị Kpọrọ Ihe?

Ọ bụrụ na ị mata ihe nketa Jehova nyere ndị ya ma jiri ya kpọrọ ihe, o nwere ike ime ka i kpebisie ike iji obi gị niile na-efe ya.

Ị̀ ‘Ghọtara Ihe Ọ Pụtara’?

Gịnị ka ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ nke hiri ụra, ụgbụ, na nwa mmefu pụtara?