Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 11

Otú E Si Na-eme Ka Ndị Chineke Na-akpakwu Àgwà Ọma—Ka Ha Na-adị Nsọ Ka Chineke

Otú E Si Na-eme Ka Ndị Chineke Na-akpakwu Àgwà Ọma—Ka Ha Na-adị Nsọ Ka Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú Eze Alaeze Chineke si kụziere ndị ya ka ha na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ

Were ya na i si n’ọnụ ụzọ nnukwu ụlọ nsọ ihe atụ a na-abata n’ogige dị ná mpụta ya

1. Gịnị ka Ezikiel hụrụ nke nwere ike ime ka ụjọ jide anyị?

KA E were ya na ị hụrụ ọhụụ Ezikiel onye amụma hụrụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga. Ị hụrụ otu ọmarịcha nnukwu ụlọ nsọ, gị ana-aga ka i ruo ya nso. Ka ị na-erute, gị ahụ otu mmụọ ozi ebe ahụ. Mmụọ ozi a chọrọ igosi gị otú ebe ahụ dị. Gị arịgoro n’ihe nrịgo nwere nzọụkwụ asaa e si abanye n’otu n’ime ọnụ ụzọ ámá atọ e nwere n’ụlọ nsọ a. Ụjọ ji gị n’ihi ihe ndị ị na-ahụ n’ọnụ ụzọ ámá ndị a. Ọnụ ụzọ ámá ndị a dị mita iri atọ n’ogologo. E nwere ụlọ ndị nche n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ. A kpụkwara ọmarịcha nkwụ dị iche iche n’ogidi ndị dị n’akụkụ mgbidi ya.—Ezik. 40:1-4, 10, 14, 16, 22; 41:20.

2. (a) Gịnị ka ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-anọchi anya ya? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.) (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere ihe ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá ndị e nwere n’ụlọ nsọ ahụ?

2 Ụlọ nsọ a bụ ụlọ nsọ ihe atụ Jehova gosiri Ezikiel n’ọhụụ. Ezikiel kwuru ọtụtụ ihe banyere otú ụlọ nsọ a dị. O kwuru banyere ya malite n’isi iri anọ ruo n’isi iri anọ na asatọ n’akwụkwọ Ezikiel. Ụlọ nsọ ahụ bụ ndokwa Jehova mere iji nyere ndị mmadụ aka ife ya nke ọma. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe ihe ndị dị n’ụlọ nsọ a pụtara, ọ ga-enyere anyị aka ife Chineke nke ọma n’oge ọgwụgwụ a. * Gịnị ka nnukwu ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ a na-eme ka anyị ghọta? Ha na-eme ka anyị ghọta na onye ọ bụla batara ná nzukọ Jehova ga na-erubere Chineke isi. Nkwụ ndị ahụ a kpụrụ n’ogidi ndị ahụ na-emekwa ka anyị ghọta na anyị ga na-akpa àgwà ọma, n’ihi na e ji nkwụ tụnyere onye ezi omume n’ebe ụfọdụ na Baịbụl. (Ọma 92:12) Gịnịkwanụ ka ụlọ ndị nche ndị dị n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ pụtara? Ọ pụtara na a naghị ekwe ka onye ọ bụla na-anaghị erubere Chineke isi bata ná nzukọ Jehova. Nzukọ a na-enyere ndị mmadụ aka inweta ndụ ebighị ebi.—Ezik. 44:9.

3. Gịnị mere e ji na-eme ka Ndị Kraịst na-adị ọcha?

3 Olee otú ihe ndị ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ si mezuo? N’isi nke abụọ n’akwụkwọ a, anyị kwuru na Jehova si n’aka Kraịst mee ka ndị ya dịkwuo ọcha malite n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919. Ma, à kwụsịrị ịna-eme ka ha na-adịkwu ọcha? Mbanụ. Kemgbe otu narị afọ gara aga, Kraịst na-ahụ na ndị Jehova na-akpa àgwà ọma otú Jehova chọrọ. Gịnị mere a ga-eji na-eme ka ndị Jehova na-adị ọcha? Ọ bụ n’ihi na Kraịst si n’ụwa a rụrụ arụ na-akpọbata ndị nke ya n’ọgbakọ Chineke. Ihe ọzọkwa bụ na Setan na-agbasi mbọ ike ka o mee ka ndị Chineke kpawa àgwà ọjọọ ha  na-akpabu. (Gụọ 2 Pita 2:20-22.) Ugbu a, ka anyị leba anya n’ụzọ atọ e si na-eme ka ezigbo Ndị Kraịst na-adị ọcha. Nke mbụ anyị ga-eleba anya na ya bụ otú e si mee ka ndị Chineke na-akpakwu àgwà ọma. Nke abụọ bụ otú e si na-eme ka ọgbakọ Chineke dịrị ọcha. Nke atọ bụ otú e si nyere ndị Chineke aka ka ha jiri ezinụlọ ha kpọrọkwuo ihe.

Otú E Si Mee Ka Ndị Chineke Na-Akpakwu Àgwà Ọma Kemgbe Ọtụtụ Afọ

4, 5. Kemgbe ụwa, olee otú Setan si na-emegharị ndị mmadụ anya? Oleekwa nsogbu nke a kpataara ndị mmadụ?

4 Kemgbe ụwa, ndị Jehova na-agbasi mbọ ike ịna-akpa àgwà ọma. Ọ bụ ya mere ha ji eji obi ha niile anabata ihe ọ bụla a gwara ha mee iji na-akpakwu àgwà ọma. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị a gwara ha.

5 Ịkwa iko. Jehova kwuru na ọ bụ naanị ndị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. Ma, Setan na-emegharị ndị mmadụ anya taa. Ọ na-eme ka ndị na-abụghị di na nwunye na-enwe mmekọahụ. Ọ na-anwakwa ndị Jehova ọnwụnwa ka ha na-akwa iko, si otú ahụ na-akpasu Chineke iwe. Setan mere ụdị ihe a n’oge Belam, ọtụtụ ndị Izrel akwaa iko, a laakwa ha n’iyi. O sikwa otú ahụ na-anwata imirikitimi mmadụ n’oge ikpeazụ a.—Ọnụ Ọgụ. 25:1-3, 9; Mkpu. 2:14.

6. Olee otu nkwa e dere n’Ụlọ Nche? Oleekwa otú ọtụtụ ndị si egosi na ha ekwela nkwa a? Gịnị mere e ji mechaa kwụsị ikwe ya? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

6 O nwere ihe nzukọ a mere n’oge gara aga iji kụghasịa nkata ọjọọ a Setan na-akpa. Ihe ahụ bụ nkwa onye ọ bụla chọrọnụ n’oge ahụ na-ekwe. E dere ya n’Ụlọ Nche Bekee nke June 15, 1908. E dere, sị: “Otú m ga-esi akpaso onye na-abụghị nwoke ibe m ma ọ bụ nwaanyị ibe m àgwà n’ihu ọha, ka m ga-esikwa akpaso ya mgbe naanị mụ na ya nọ.” * N’agbanyeghị na ọ bụghị iwu n’oge ahụ na onye Jehova ọ bụla ga-ekwe nkwa a, ọtụtụ ndị kwere nkwa a ma kwuo ka aha ha gbaa n’Ụlọ Nche. Nkwa a nyeere ọtụtụ ndị aka ịgbara ịkwa iko ọsọ. Ma, ka ọtụtụ afọ gachara, a bịara chọpụta na ụfọdụ na-ekwe nkwa a iji mezuo iwu. N’ihi ya, a gwara ụmụnna anyị ka ha kwụsị ikwe nkwa a. Ma, ha nọgidere na-agbara ịkwa iko ọsọ bụ́kwanụ ihe e kwo na-ekwe nkwa a.

7. Olee ihe na-adịghị mma ụmụnna malitere iche, nke e kwuru okwu ya n’Ụlọ Nche n’afọ 1935? Oleekwa otú e si nyere ha aka ka ha kwụsị ịna-eche ụdị ihe ahụ?

7 Ma, Setan nọ na-akpa nkata ọjọọ ya n’ike n’ike. N’Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1935, e kwuru otu ihe na-adịghị mma ụfọdụ ụmụnna malitere iche. Ha chere na ebe ọ bụ na ha na-agachi ozi ọma anya, ha nwere ike ịna-akpa àgwà ọjọọ. Ihe a mere ka e kwuo n’Ụlọ Nche, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịghọta na ije ozi ọma abụghị naanị ihe Chineke chọrọ n’aka anyị. Ndịàmà Jehova bụ ndị na-anọchite anya Jehova. Ha kwesịkwara ịnọchite anya Jehova na Alaeze ya nke ọma.” Ụlọ Nche ahụ kwuru otú ndị Chineke kwesịrị isi na-ele alụmdi na nwunye nakwa mmekọahụ anya. E si otú ahụ nyere ha aka ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ.’—1 Kọr. 6:18.

8. Gịnị mere e ji kọwaa n’Ụlọ Nche ugboro ugboro ihe okwu Grik e si na ya sụgharịta ịkwa iko pụtara?

8 Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, a kọwaala n’Ụlọ Nche ugboro ugboro ihe okwu Grik e si na ya sụgharịta ịkwa iko n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst pụtara. Okwu Grik ahụ bụ por·neiʹa. Ihe okwu a pụtara abụghị naanị mmekọahụ nke ndị na-abụghị di na  nwunye na-enwe. Kama, ọ pụtakwara isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ, mmadụ ịdịda onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ihe ndị ọzọ ọ pụtakwara bụ nwoke na nwoke na nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, nakwa idina anụmanụ. Otú a e si kọwaa ihe ịkwa iko pụtara nyeere ụmụnna anyị aka ịgbara ụdị ịkwa iko ọ bụla ọsọ, n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị n’ụwa taa anaghị agbara ya ọsọ.—Gụọ Ndị Efesọs 4:17-19.

9, 10. (a) Olee àgwà ọjọọ e kwuru okwu ya n’Ụlọ Nche n’afọ 1935? (b) Olee ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ mmanya?

9 Ịṅụbiga mmanya ókè. N’Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1935, e kwuru àgwà ọjọọ ọzọ ụfọdụ Ndị Kraịst malitere ịkpa. E kwuru, sị: “A chọpụtala na [mmanya] na-egbu ụfọdụ ụmụnna anyị mgbe ha nọ n’ozi ọma nakwa mgbe ha na-eme ihe ndị ọzọ n’ọgbakọ. Olee mgbe Baịbụl kwuru mmadụ kwesịrị ịṅụ mmanya? Onye Kraịst ò kwesịrị ịṅụ mmanya otú ga-eme ka ọ ghara inwe ike ịrụ ọrụ ya nke ọma n’ọgbakọ?”

10 Otú e si zaa ajụjụ ndị a n’Ụlọ Nche ahụ nyeere ụmụnna anyị aka ịmata ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ mmanya. Baịbụl ekwughị na Ndị Kraịst ekwesịghị ịṅụ mmanya, kama o kwuru na ha ekwesịghị ịṅụbiga ya ókè. (Ọma 104:14, 15; 1 Kọr. 6:9, 10) A gwara ndị Chineke na ha ekwesịghị ịṅụ mmanya tupu ha ejewere Chineke ozi. A kọọrọ ha banyere ihe Baịbụl kwuru Chineke mere ụmụ Erọn abụọ. Baịbụl kwuru na Chineke gburu ha n’ihi na ha ji ọkụ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova, bụ́ nke ọ na-agwaghị ha suree. Obere oge ha nwụchara, Baịbụl kwuru ihe ọ ga-abụ ya mere ha ji suree ihe nsure ọkụ ahụ iwu na-akwadoghị. Ihe ahụ Baịbụl kwuru gosiri na ọ ga-abụ na ha dara iwu Chineke nyere ndị nchụàjà niile, ya bụ, ka ha ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya mgbe ha na-ejere ya ozi. (Lev. 10:1, 2, 8-11) Taa, Ndị Kraịst na-akpachara anya ka ha ghara ịṅụ mmanya mgbe ha chọrọ ijere Chineke ozi.

11. Olee uru ihe a kụziiri Ndị Kraịst banyere ịṅụ mmanya baara ha?

11 E meela ka Ndị Kraịst taa mara na ha ekwesịghị ịbụ ndị aṅụrụma. Ihe a a kụziiri ha enyerela ọtụtụ ndị aka ha akwụsị ịṅụbiga mmanya ókè. O meekwala ka ọtụtụ Ndị Kraịst ghara ịbụ ndị aṅụrụma. Ndị Kraịst ekwesịghị ịṅụbiga mmanya ókè n’ihi na ọ ga-akpaghasịrị ha ezinụlọ ma ọ bụ mee ka ndị mmadụ ghara ịna-akwanyere ha ùgwù. Nke ka nke bụ na o nwere ike ime ka ha kwụsị ife Jehova nke ọma.

“Ọ gaghị ekwekwanụ omume na Onyenwe anyị ga na-esi sịga sịga ma ọ bụ tinye ihe ọ bụla ga-emerụ ya n’ọnụ.”—C. T. Russell

12. Olee ihe Ndị Kraịst malitere ikwu banyere ịṅụ sịga, ịkpọ anwụrụ na ịṅụ ìgbó tupudị anyị abanye n’oge ikpeazụ a?

12 Ịṅụ sịga, ịkpọ anwụrụ na ịṅụ ìgbó. Tupu anyị abanye n’oge ikpeazụ a, Ndị Kraịst amalitela ikwu na ịṅụ sịga, ịkpọ anwụrụ na ịṅụ ìgbó adịghị mma. Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwanna katarala ahụ́, aha ya bụ́ Charles Capen, kwuru ihe Nwanna Charles Taze Russell gwara ya ụbọchị mbụ ya na ya hụrụ ihe karịrị otu narị afọ gara aga. Nwanna Capen dị afọ iri na atọ mgbe ahụ. Nwanna Russell hụrụ Nwanna Capen na ụmụnne ya atọ mgbe ha na-arịgo steepụ ụlọ elu a na-akpọ Ụlọ Baịbụl, ya bụ, Betel nke dị n’Alegeni na Pensụlvenịa. Mgbe Nwanna Russell na-agafe ebe ahụ, ọ jụrụ ha, sị: “Bịa ụmụaka a, ùnu na-aṅụ sịga? Ana m anụ ísì sịga ebe a.” Ha gwara ya na ha anaghị aṅụ sịga. Ajụjụ a Nwanna Russell  jụrụ ha mere ka ha ghọta na Nwanna Russell kweere na Onye Kraịst ekwesịghị ịṅụ sịga. Ụlọ Nche Bekee nke August 1, 1895, kwuru otú Nwanna Russell si kọwaa ihe Baịbụl kwuru na 2 Ndị Kọrịnt 7:1. Nwanna Russell kwuru, sị: “O doro m anya na ọ bụrụ na Onye Kraịst na-aṅụ sịga ma ọ bụ ìgbó, ma ọ bụkwanụ na-akpọ anwụrụ, ọ gaghị adị Chineke mma n’obi ma ọ bụ mee ka e too ya. . . . Ọ gaghị ekwekwanụ omume na Onyenwe anyị ga na-esi sịga sịga ma ọ bụ tinye ihe ọ bụla ga-emerụ ya n’ọnụ.”

13. Gịnị ka a kọwakwuuru ụmụnna anyị n’afọ 1973?

13 N’afọ 1935, e kwuru n’Ụlọ Nche na sịga, anwụrụ ma ọ bụ ìgbó na-emerụ mmadụ. E kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ na-eje ozi na Betel ma na-aṅụ sịga ma ọ bụ ìgbó, ma ọ bụkwanụ na-akpọ anwụrụ, a ga-achụ onye ahụ na Betel. Ihe ọzọ e kwukwara bụ na a gaghị ekwe ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị ahụ bụrụ onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. A kọwakwuru banyere ịkpọ anwụrụ, ịṅụ sịga na ìgbó n’afọ 1973. E kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke June 1, 1973, na a ga-achụ Onyeàmà Jehova ọ bụla n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na onye ahụ na-aṅụ sịga, ma ọ bụ na-akpọ anwụrụ, ma ọ bụkwanụ na-aṅụ ìgbó. E kwukwara na ihe ndị a na-egbu mmadụ, na-emerụkwa onye na-aṅụ ha. Onye na-aṅụ ha ahụghịkwa ma onwe ya ma ndị ọzọ n’anya. Mgbe e kwuchara ihe a, a chụrụ ndị niile gbara isi akwara na-aṅụ ha n’ọgbakọ. * Ihe a bụ ụzọ ọzọ Kraịst ji mekwuo ka ndị ya na-adị ọcha.

14. Gịnị ka Chineke kwuru banyere iri ọbara? Gịnị mere ndị dọkịta ji malitezie ịmịnye ndị ọrịa ọbara n’ebe niile?

14 Iri ọbara. N’oge Noa, Chineke kwuru na iri ọbara adịghị mma. N’iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, ọ gwakwara ha erila ọbara. Jehova gwakwara Ndị Kraịst ka ha “zere . . . ọbara.” (Ọrụ 15:20, 29; Jen. 9:4; Lev. 7:26) Ma, n’oge anyị a, Setan emeela ka ndị mmadụ chọpụta ụzọ ọhụrụ ha sizi na-eri ọbara, si otú ahụ na-enupụrụ Chineke isi. N’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ndị dọkịta malitere ịmịnye ụfọdụ ndị ọrịa ọbara iji mara ma ọ̀ ga-adị ha mma n’ahụ́. Ma, mgbe a chọpụtara ihe ndị dị iche iche mejupụtara ọbara, ha maliteziri ịmịnye ọtụtụ ndị ọrịa ọbara. N’afọ 1937, a malitere ịna-amịrị ọbara ndị mmadụ na-echekwa ya ka e were ya na-amịnye ndị ọrịa. N’ihi otú Agha Ụwa nke Abụọ si na-asụ ndị mmadụ akwụ, a malitere ịna-amịnye ndị ọrịa ọbara n’ike n’ike. Obere oge a lụchara agha a, ọbara bụzi ihe ndị dọkịta ji agwọ ọrịa ebe niile n’ụwa.

15, 16. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si lee mmịnye ọbara anya? (b) Olee ihe nzukọ Jehova merela iji nyere anyị aka n’okwu gbasara mmịnye ọbara? Oleekwa uru ihe a e mere bara?

15 N’afọ 1944, e kwuru n’Ụlọ Nche na ịmịnye ndị mmadụ ọbara bụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ si na-eri ọbara. N’afọ 1945, e mere ka ihe Baịbụl kwuru banyere ọbara dokwuo Ndị Kraịst anya. Tupu afọ 1951 agwụ, e depụtara ajụjụ ndị dọkịta nwere ike ịjụ ụmụnna anyị mgbe ha gara ụlọ ọgwụ, nakwa ihe ha nwere ike ịza ha. N’ụwa niile, ezigbo Ndị Kraịst anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara n’agbanyeghị emo a na-akwa ha, na ọnụ a na-emekpọ ha. Kraịst akwụsịghị ịna-akụziri ọgbakọ ya ihe ha ga-eme n’okwu a. O nyeere ndị ya aka ha emee ezigbo nchọnchọ ma bipụta akwụkwọ ndị kwuru otú e nwere ike isi gwọọ onye ọrịa n’amịnyeghị ya ọbara.

 16 N’afọ 1979, a malitere ịhọpụta ụfọdụ ndị okenye ka ha na-aga n’ụlọ ọgwụ dị iche iche na-akọrọ ndị dọkịta ihe mere anyị achọghị ka a mịnye anyị ọbara. Ha na-akọkwara ndị dọkịta ihe Baịbụl kwuru banyere ọbara na otú e nwere ike isi gwọọ mmadụ n’amịnyeghị ya ọbara. N’afọ 1980, a kụziiri ndị okenye nọ n’obodo iri atọ na itoolu n’Amerịka otú ha ga-esi kọwaara ndị dọkịta ihe ha nwere ike ime n’okwu a. Ka oge na-aga, Òtù Na-achị Isi kwuru ka e nwee Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ ebe niile. Mbọ niile a nzukọ Jehova na-agba ò nwere isi? Ee. Ọtụtụ puku ndị dọkịta na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ na-ekwe agwọ Ndịàmà Jehova n’amịnyeghị ha ọbara. Ka chi na-eji na-abọ, ọtụtụ ụlọ ọgwụ na-agwọzi ndị mmadụ n’amịnyeghị ha ọbara. Ụfọdụ n’ime ha ekwuodịla na ọ bụ ya bụ otú kacha mma isi gwọọ mmadụ ọrịa. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jizọs na-echebe ndị ya iji hụ na mbọ niile Setan na-agba ka o merụọ ha na-akụ afọ n’ala.—Gụọ Ndị Efesọs 5:25-27.

Ka chi na-eji na-abọ, ọtụtụ ụlọ ọgwụ na-agwọzi ndị mmadụ n’amịnyeghị ha ọbara. Ụfọdụ n’ime ha ekwuodịla na ọ bụ ya bụ otú kacha mma isi gwọọ mmadụ ọrịa

17. Olee ihe anyị nwere ike ime iji gosi na obi dị anyị ụtọ n’ihe ndị a Kraịst na-akụzikwuru anyị?

17 Anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Obi ọ̀ dị anyị ụtọ na Kraịst na-eme ka ndị ya na-adị ọcha, na-akụziri anyị ihe ka anyị nwee ike ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ?’ Ya bụrụ na obi dị anyị ụtọ, ka anyị buru n’obi na Setan ka na-agbasi mbọ ike ime ka  anyị ghara ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ, ma mee ka anyị na Jehova na Jizọs ghara ịna-adị ná mma. Ma, Jehova ji nzukọ ya na-enyere anyị aka ka Setan ghara inweta anyị. Otú o si na-eme ya bụ ịna-agwa anyị omume rụrụ arụ ndị juru n’ụwa taa, nakwa otú anyị nwere ike isi na-agbara ha ọsọ. Ka anyị niile saa anya na mmiri na-eme ihe ndị ahụ a na-akụziri anyị.—Ilu 19:20.

Otú E Si Eme Ka Ọgbakọ Na-adị Ọcha

18. Olee otú ọhụụ e gosiri Ezikiel si enyere anyị aka ịghọta ihe a ga-eme ndị kpọrọ ekwo nkụ na-enupụrụ Jehova isi?

18 Otú ọzọ e si na-eme ka ndị Jehova na-akpa àgwà ọma bụ ihe ndị a na-eme iji hụ na ọgbakọ dị ọcha. Otu ihe na-ewute anyị bụ na e nwere ụfọdụ ndị Jehova na-emecha kwụsị ịna-erubere Jehova isi. Ma, ha kwuru na ha ga na-erubere ya isi mgbe ha nyefere ya ndụ ha. Olee ihe e kwesịrị ime ndị dị otú a? Ọhụụ ahụ e gosiri Ezikiel banyere ụlọ nsọ ihe atụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a ga-enyere anyị aka ịma ihe e kwesịrị ime ha. Ì chetara nnukwu ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ e kwuru okwu ha n’ọhụụ ahụ? E nwere ụlọ ndị nche n’ọnụ ụzọ ámá nke ọ bụla. Ndị nche na-anọ ebe ahụ eche ụlọ nsọ ahụ nche ka ndị “a na-ebighị úgwù n’obi,” ghara ịbata na ya. (Ezik. 44:9) Ihe ihe a na-akụziri anyị bụ na ndị Jehova na-anabata ná nzukọ ya bụ naanị ndị ji obi ha dum na-akpa àgwà otú ọ chọrọ, ọ bụghị ndị na-eme ihe otú o si masị ha. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa. Naanị ndị a na-ekwe ka ha nọrọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ndị na-eme ihe otú Jehova chọrọ.

19, 20. (a) Olee otú Kraịst sirila jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ya matakwuo otú ha ga-esi na-ekpe onye mere ihe ọjọọ ikpe n’ọgbakọ? (b) Olee ihe atọ mere e ji achụpụ ndị kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ?

19 N’afọ 1892, e kwuru n’Ụlọ Nche, sị: “E nwee Onye Kraịst ọ bụla na-akpa àgwà na-egosi na Kraịst ejighị ndụ ya chụọ àjà maka anyị niile, ma ọ bụkwanụ onye ahụ ekwuo ya ekwuo, a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ.” (Gụọ 2 Jọn 10.) N’afọ 1904, e kwuru n’otu akwụkwọ anyị aha ya bụ The New Creation na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ma kpọọ ekwo nkụ na-akpa àgwà ọjọọ nwere ike ime ka ndị ọzọ soro ya kpawa àgwà ọjọọ. Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ọjọọ n’oge ahụ, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ na-eso eleba okwu ya anya. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ụdị ihe a na-eme. N’afọ 1944, e kwuru n’Ụlọ Nche na ọ bụ naanị ụmụnna nwoke ndị ruru eru ga na-elebazi ụdị okwu ahụ anya. Otu Ụlọ Nche e bipụtara n’afọ 1952 kwuru otú Baịbụl sị ka e si na-ekpe nwanna mere ihe ọjọọ ikpe. Ụlọ Nche ahụ kwukwara na ihe mere e ji achụ mmadụ n’ọgbakọ ma onye ahụ jụ ichegharị bụ iji mee ka ọgbakọ dịrị ọcha.

20 Kemgbe ahụ, Kraịst emeela ka ndị ya matakwuo otú ha kwesịrị isi na-ekpe ụmụnna ndị mere ihe ọjọọ ikpe. A kụzierela ndị okenye otú Jehova chọrọ ka ha si na-ekpe ụmụnna ndị mere ihe ọjọọ ikpe, ya bụ, ikpe ikpe kwụ ọtọ, na ime ebere mgbe ha kwesịrị ime ebere. N’oge anyị a, anyị amụtala ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụzọ ihe atọ mere e kwesịrị iji chụọ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na onye ahụ kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe ọjọọ. Nke mbụ bụ iji mee ka ndị mmadụ ghara ịna-akọcha aha Jehova. Nke abụọ bụ iji mee ka ndị ọzọ ghara iso kpawa àgwà ọjọọ ahụ. Nke atọ abụrụ iji mee ka onye ahụ mere ihe ọjọọ chegharịa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ.

21. Olee uru ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-abara Ndị Kraịst?

 21 Ị̀ hụlanụ na ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-abara Ndị Kraịst uru taa? N’Izrel oge ochie, ndị ọjọọ na-emekarị ka ọtụtụ ndị soro ha mewe ihe ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ndị ọjọọ a na-akarịdị ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi. Ihe ọjọọ ndị ha na-eme na-emekarị ka a na-akọcha aha Jehova, na-emekwa ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. (Jere. 7:23-28) Ma, ndị ha na Jehova na-emekọ ihe taa bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ebe ọ bụ na a na-achụpụ ndị kpachaara anya na-eme ihe ọjọọ n’ọgbakọ, ọ na-eme ka Setan ghara iji ha na-emerụ ọgbakọ. A chụpụ ndị a, ọ na-eme ka anyị na Jehova na-adị n’ezigbo mma. Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) Ikpe ndị okenye na-ekpe ndị mere ihe ọjọọ abụghị obere ọrụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ma ànyị ji obi anyị niile na-anabata ihe ọ bụla ndị okenye kpebiri n’ikpe ndị ha na-ekpe?

Ito Onye Ezinụlọ Ọ Bụla Sitere n’Ebe Ọ Nọ Nweta Aha Ya

22, 23. Olee ihe ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ ihe dị ka otu narị afọ gara aga mere nke kwesịrị ime ka obi na-atọ anyị ụtọ? Oleekwa ihe na-egosi na ha kwesịrị imezikwu ihe n’okwu gbasara ezinụlọ ha?

22 Otú ọzọ e si eme ka Ndị Kraịst na-adị ọcha bụ n’okwu gbasara ezinụlọ na alụmdi na nwunye. Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, è meela ka anyị ghọtakwuo otú anyị kwesịrị isi na-eme ihe n’ezinụlọ anyị? À na-ajụkwa ajụ? Dị ka ihe atụ, anyị gụọ ihe gbasara ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ ihe dị ka otu narị afọ gara aga, obi na-atọ anyị ụtọ n’otú ha si jiri obi ha niile jeere Jehova ozi. Ihe ọzọ na-emekwa anyị obi ụtọ bụ otú ha si jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla ọzọ ha na-eme ná ndụ. Ma, anyị lerukwuo anya n’otú ha si mee ihe ndị a n’oge ahụ, anyị ga-achọpụta na a ka nwere ebe ndị ha kwesịrị imezi ihe. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

23 N’oge ahụ, ụmụnna nwoke nwere ike ịhapụ ndị ezinụlọ ha n’ụlọ jee ebe dị anya nọrọ na-eje ozi ọma ma ọ bụ na-eleta ọgbakọ dị iche iche ruo ọtụtụ ọnwa. Mgbe ụfọdụ, a na-ekwusi okwu ike banyere uru ọ bara ma mmadụ ghara ịlụ di ma ọ bụ nwaanyị. A na-ekwudị ya karịa otú Baịbụl si kwuo ya. Anaghịkwanụ eji ike ekwu otú e nwere ike isi mee ka ezinụlọ Ndị Kraịst bụrụ a kwaa akwụrụ. Ànyị ka na-eme otú ahụ taa? Mbanụ.

Ụmụnna anaghịzi ekwo maka ọrụ ọgbakọ hapụ ilekọta ezinụlọ ha

24. Olee otú Kraịst si nyere ndị ya aka ka ha ghọtakwuo otú ha kwesịrị isi na-elekọta ezinụlọ ha?

24 Ụmụnna anaghịzi ekwo maka ọrụ ọgbakọ hapụ ilekọta ezinụlọ ha. (Gụọ 1 Timoti 5:8.) Kraịst nọkwa na-akụziri ndị ya ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara otú ha ga-esi na-elekọta ezinụlọ ha. (Efe. 3:14, 15) Dị ka ihe atụ, a malitere ibipụta akwụkwọ dị iche iche na-enyere Ndị Kraịst aka n’ezinụlọ ha. N’afọ 1978, e bipụtara akwụkwọ anyị bụ́ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ. Mgbe ihe dị ka afọ iri na asatọ gachara, e bipụtara akwụkwọ ọzọ aha ya bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. E bipụtakwara isiokwu dị iche iche n’Ụlọ Nche, bụ́ ndị ga-enyere ndị di na nwunye aka ịna-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ezinụlọ.

25-27. Olee otú nzụkọ Jehova sirila nyere ụmụaka na ndị na-eto eto aka kemgbe ọtụtụ afọ?

25 Ò nwere otú e si nyere ndị na-eto eto aka? Ee. Kemgbe ọtụtụ afọ, e kwuola ọtụtụ ihe ga-enyere ha aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ọ dịla anya nzukọ Jehova malitere ide ihe ndị na-enyere  ụmụaka nọ n’afọ ndụ dị iche iche aka. Dị ka ihe atụ, n’agbata afọ 1919 na afọ 1921, e nwere isiokwu na-agba na Teta! Bekee e ji akụziri ụmụaka ihe. Isiokwu ahụ bụ “Ihe E Ji A Kụziri Ụmụaka Baịbụl.” E bipụtakwara broshọ a na-akpọ The Golden Age ABC n’afọ 1920. N’afọ 1941, e bipụtara akwụkwọ a na-akpọ Children. N’agbata afọ 1971 ruo afọ 1979, e bipụtara akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, nakwa Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. N’afọ 1982, a malitere ibipụta otu isiokwu na Teta! maka ndị na-eto eto. Isiokwu ahụ bụ, “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị.” E si n’ihe ndị a na-ede n’isiokwu a bipụta akwụkwọ anyị a na-akpọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè n’afọ 1989.

Obi tọrọ ụmụnna bịara mgbakọ a na Jamanị ụtọ mgbe e wepụtara broshọ a na-akpọ Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl

26 Ka ọ dị ugbu a, anyị enweela akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, nkebi nke mbụ na nke abụọ. Anyị ka na-edekwa isiokwu a na jw.org bụ́ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Anyị nwekwara akwụkwọ ọzọ e bipụtara maka ụmụaka. Aha ya bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ị gaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, ị ga-ahụ ọtụtụ isiokwu anyị dere e ji akụziri ụmụaka ihe. Ha bụ: Kaadị akụkọ ndị dị na Baịbụl, Ihe ndị e ji amụ  Baịbụl, vidio dị iche iche, katuun e sere ese e ji akụzi Baịbụl, na ihe e ji akụziri m Baịbụl nke a na-ewepụta maka ụmụaka ndị na-akarịbeghị afọ atọ. Mgbe Kraịst nọ n’ụwa, ọ hụrụ ụmụaka n’anya, kurudị ndị a kpọtaara ya. O dokwara anya na ọ hụrụ ụmụaka n’anya taa. (Mak 10:13-16) Ọ chọrọ ka anyị mee ka ụmụaka ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ mata na a hụrụ ha n’anya, chọọkwa ka anyị na-akụziri ha ihe gbasara Chineke.

27 Jizọs chọkwara ka e nyere ụmụaka aka ka ndị ọjọọ ghara imetọ ha. Ụwa anyị a eretọọla. Ka chi na-eji na-abọ, ọ na-akakwu njọ. Ọ bụ ya mere e ji na-emetọ ụmụaka aghara aghara. N’ihi ya, nzukọ Jehova e deela ọtụtụ akwụkwọ ga-enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụaka ha ihe ka ndị ọjọọ ghara imetọ ha. *

28. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ife Chineke otú ọ chọrọ? (b) Olee ihe i kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme?

28 Obi kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ na Kraịst nọ na-eme ka ndị ya na-adị ọcha, na-akụzikwara ha ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ, n’ihi na ime otú ahụ ga-abara ha uru. Ị̀ ka chetara ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Ì chetakwara nnukwu ọnụ ụzọ ámá ndị e si abanye na ya? Nke bụ́ eziokwu bụ na ụlọ nsọ a abụghị ụlọ nsọ nkịtị, kama, ọ bụ nke ihe atụ. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe anyị ma ànyị kwetara na ụlọ nsọ a dị adị n’eziokwu? Anyị na-abanye n’ụlọ nsọ a. Ma, otú anyị si abanye na ya abụghị naanị ịga ọmụmụ ihe, ịgụ Baịbụl, ma ọ bụkwanụ ịga ozi ọma. Ime ihe ndị a abụghị ebe okwu biri, n’ihi na onye ihu abụọ nwekwara ike ịna-eme ha, ma ọ banyebeghị n’ụlọ nsọ Jehova. Oleezi otú anyị ga-esi abanye n’ụlọ nsọ a n’eziokwu ma nọrọ ebe ahụ na-ejere Jehova ozi dị nsọ? Otú anyị ga-esi abanye na ya bụ ịga ọmụmụ ihe, ịgụ Baịbụl, ịga ozi ọma, ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ na iji obi anyị dum na-eme ihe ndị a na-eme ná nzukọ Jehova. Jehova enyerela anyị aka ịbata n’ụlọ nsọ a. Anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ bụ ihe ọma pụrụ iche Jehova meere anyị. Anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ka anyị dịrị nsọ ka Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ.

^ para. 2 Baịbụl kwuru na a ga-esi n’ebe a dọọrọ ndị Chineke n’agha kpọghachi ha n’obodo ha. N’afọ 1932, a kọwara na n’oge anyị a, amụma a emezughị n’isi ụmụ Izrel nkịtị, kama, o mezuru n’isi Izrel nke Chineke. Ọ na-ekwu gbasara ịmaliteghachi ife Jehova otú ọ chọrọ n’oge anyị a. Ọ bụ ná nkebi nke abụọ nke akwụkwọ anyị a na-akpọ Vindication ka e buru ụzọ kọwaa ihe a. N’Ụlọ Nche March 1, 1999, a kọwara na ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ a gbasara ịmaliteghachi ife Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, amụma a na-emezukwa n’oge ikpeazụ a.

^ para. 6 E kwukwara ná nkwa ahụ na nwoke na nwaanyị ekwesịghị ịnọ naanị ha n’ime ụlọ mechie ụzọ ọ́ gwụkwala ma hà bụ di na nwunye ma ọ bụ ndị ikwu. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-eghewe ụzọ ha ọnụ. Ndị Betel na-agụpụta nkwa a n’ụtụtụ ọ bụla ma ha gụwa Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị. Ha gụrụ ya afọ ole na ole kwụsị ya.

^ para. 13 Ihe a na-ekwu okwu ya bụ ịṅụ sịga, ịkpọ anwụrụ, ịta ahịhịa anwụrụ, na ịkụ ya ka e jiri ya na-eme ụdị ihe ndị a.

^ para. 27 Gụọ isi nke 32 n’akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ; nakwa Teta! October 2007, peeji nke 3 ruo na nke 11.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Mere Anyị Ga-eji Dị Nsọ

Ò nwetụla mgbe akwụkwọ Levitikọs gbagwojuru gị anya ma ọ bụ gwụ gị ike? Ihe dị na ya ga-eme ka ị na-adị nsọ n’ofufe ị na-efe Jehova.