Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 3

Jehova Na-eme Ka A Mata Ihe O Zubere

Jehova Na-eme Ka A Mata Ihe O Zubere

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka ndị na-atụ egwu ya mata ihe ndị o zubere ime

1, 2. Olee otú Jehova si eme ka a mara ihe o zubere imere ụmụ mmadụ?

NDỊ nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-akpọ ụmụ ha ka ha na ha na-akparịta ihe gbasara ezinụlọ ha. Ma, ọ bụghị okwu niile gbasara ezinụlọ ha ka ha na ụmụ ha na-akparịta n’otu mgbe. Ihe ha na ụmụ ha na-akparịta mgbe ụmụ ha ka dị obere, na-adị iche n’ihe ha na ha na-akparịta mgbe ụmụ ha torola.

2 Jehova na-emekwa otu ihe ahụ. Ọ na-eji nwayọọ nwayọọ akụziri ndị ohu ya ihe o zubere imere ụmụ mmadụ. Ma, ọ ma oge ọ ga-abụ ya kụziere ha ihe, ha aghọta ya. Ka anyị lebatụ anya n’otú Jehova si na-akụziri ndị ohu ya ihe gbasara Alaeze ya kemgbe ụwa.

Ihe Mere Alaeze Chineke Ji Dị Mkpa

3, 4. Jehova ò bu ụzọ kpebie na otú a na otú a ka ụmụ mmadụ ga-esirịrị na-ebi ndụ ha? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

3 Mgbe Jehova kere ihe niile, o zubeghị ka e nwee Alaeze Mesaya. Maka gịnị? N’ihi na Jehova e bughị ụzọ kpebie na otú a ma ọ bụ otú a ka ụmụ mmadụ ga-esirịrị na-ebi ndụ ha. O kedịrị ha ka ha jiri aka ha họrọ ụdị ndụ ha chọrọ ibi. Ọ bụ ya mere o ji gwa Adam na Iv ihe o zubere imere ụmụ mmadụ. Ọ gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jen. 1:28) Jehova gwakwara ha ka ha na-eme ihe ọma ma hapụ ime ihe ọjọọ. (Jen. 2:16, 17) Ọ bụrụ na Adam na Iv chọrọ, ha gaara erubere Chineke isi. A sị na ha na ụmụ ha rubeere Chineke isi, anyị agaraghị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke, nke Kraịst bụ onyeisi ya, bịa mezuo nzube Chineke. Ọ bụ naanị ụmụ mmadụ zuru okè gaara ebi ebe niile n’ụwa a na-efe Jehova.

4 Isi ahụ Setan, Adam na Iv nupụụrụ Jehova emeghị ka Jehova kwuo na ya agaghị emezukwa nzube ya, ya bụ, ime ka ọ bụrụ naanị ụmụ mmadụ zuru okè ga-ebi n’ụwa. Kama, Jehova gbanwere otú ọ chọrọ isi mezuo nzube ya. Otú ọ chọrọ isi emezu nzube ya adịghị ka ụgbọ okporo ígwè. Ụgbọ okporo ígwè ga-agbarịrị n’okporo ígwè ka o nwee ike iru ebe ọ na-aga. Ma, ihe mee n’ụzọ, ọ gaghị erukwa ebe ahụ. Ọ bụrụ na Jehova ekwuo ihe o zubere ime, o nweghị ihe nwere ike ime ka  ọ ghara imezu. (Gụọ Aịzaya 55:11.) Ọ bụrụ na Jehova ekwuo otú ọ chọrọ isi emezu nzube ya, ya enwee ihe ụfọdụ mere ka ọ ghara imezu otú ahụ ọ chọrọ isi mee ya, ọ na-esi n’ụzọ ọzọ mezuo ya. * (Ọpụ. 3:14, 15) Ọ na-agwa ndị ohu ya ụzọ ọzọ ahụ ọ chọrọ isi mezuo ya mgbe o lere anya na oge ezuola ka ọ gwa ha ya.

5. Olee ihe Jehova mere mgbe Adam na Iv nupụchaara ya isi n’ogige Iden?

5 Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi n’Iden, Jehova kwuru na ya ga-enwe Alaeze nke ọ ga-eji emezu nzube ya. (Mat. 25:34) N’oge ahụ ụmụ mmadụ na-enweghị olileanya, Jehova malitere ime ka ha mata otú ọ ga-esi eme ka ha zuo okè na otú ọ ga-esi mezie ihe niile ọchịchị ọjọọ Setan mebiri. (Jen. 3:14-19) Ma, Jehova ekwuchaghị ihe niile gbasara Alaeze otu mgbe ahụ.

Jehova Malitere Ime Ka Ụmụ Mmadụ Mata Eziokwu Gbasara Alaeze Ya

6. Olee ihe Jehova kwuru na a ga-enwe? Ma, olee ihe ọ na-ekwughị?

6 Amụma mbụ Jehova buru na Baịbụl gosiri na a ga-enwe otu “mkpụrụ” nke ga-egwepịa agwọ ahụ isi. (Gụọ Jenesis 3:15.) N’oge ahụ, Jehova ekwughị onye mkpụrụ ahụ bụ, o kwughịkwa onye mkpụrụ agwọ ahụ bụ. Jehova ekwughịkwa ihe ọ bụla gbasara ya ruo mgbe ihe karịrị puku afọ abụọ gachara. *

7. Gịnị mere Jehova ji họrọ Ebreham? Gịnịkwa ka anyị mụtara na ya?

7 Jehova mechara gwa Ebreham na mkpụrụ ahụ nke ga-egwepịa agwọ ahụ isi ga-esi n’ezinụlọ ya pụta. Ihe mere Jehova ji họrọ Ebreham bụ na o ‘gere ntị n’olu Jehova.’ (Jen. 22:18) O nwere ihe dị mkpa anyị mụtara n’ihe ahụ Jehova gwara Ebreham. Ihe anyị mụtara bụ na ọ bụ naanị ndị na-atụ egwu Jehova ka ọ na-akọrọ nzube ya.—Gụọ Abụ Ọma 25:14.

8, 9. Olee ihe Jehova gwara Ebreham na Jekọb banyere mkpụrụ ahụ ga-egwepịa agwọ ahụ isi?

8 Mgbe Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi ya na-agwa enyi ya Ebreham okwu, Jehova kwuru na mkpụrụ ahụ nke ga-egwepịa agwọ ahụ isi ga-abụ mmadụ. Nke a bụ nke mbụ Jehova na-eme ka ụmụ mmadụ mata na mkpụrụ ahụ bụ mmadụ. (Jen. 22:15-17; Jems 2:23) Ma olee otú onye a ga-esi egwepịa agwọ ahụ isi? Ònye bụ agwọ ahụ? Ihe ndị Jehova ga-emecha kọọrọ anyị ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a.

9 Jehova mechara kwuo na mkpụrụ ahụ nke ga-egwepịa agwọ ahụ isi ga-esi n’ezinụlọ nwa nwa Ebreham aha ya bụ Jekọb. Jekọb bụ nwoke nwere ezigbo okwukwe na Chineke. (Jen. 28:13-22) Jehova si n’ọnụ Jekọb kwuo na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ nwa Jekọb aha ya bụ Juda. Jekọb kwuru na a ga-enye mkpụrụ a nke ga-esi n’ụlọ Juda “mkpanaka eze.” Mkpanaka a a ga-enye ya pụtara na ọ ga-abụ onye ọchịchị. Jekọb kwukwara na ‘ọ bụkwa mkpụrụ a ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.’ (Jen. 49:1, 10) Jehova ji ihe a Jekọb kwuru mee ka anyị mata na Mkpụrụ ahụ ga-abụ onye ọchịchị ma ọ bụ eze.

10, 11. Gịnị mere Jehova ji gwa Devid na Daniel ihe o zubere ime?

10 Mgbe Juda nwụchara, ihe dị ka narị afọ isii na iri ise agaakwa, Jehova mere ka Eze Devid matakwuo nzube ya. Devid si  n’ezinụlọ Juda. Jehova kwuru na Devid bụ ‘nwoke obi ya nabatara.’ (1 Sam. 13:14; 17:12; Ọrụ 13:22) Jehova na Devid gbara ndụ. Ọ gwara ya na otu nwa ya ga-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ihe mere Jehova ji gwa Devid okwu a bụ na Devid na-atụ egwu Chineke.—2 Sam. 7:8, 12-16.

11 Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gachara, Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Daniel kwuo hoo haa afọ a ga-ete mkpụrụ ahụ, ma ọ bụ Mesaya ahụ, mmanụ n’ụwa. (Dan. 9:25) Jehova kwuru na Daniel bụ “onye a hụrụ n’anya nke ukwuu.” Maka gịnị? Ọ bụ maka na Daniel rubeere Jehova isi ma jeere ya ozi ná ndụ ya niile.—Dan. 6:16; 9:22, 23.

12. Olee ihe Jehova gwara Daniel ka o mee? Gịnị mere o ji gwa ya ihe ahụ?

12 Jehova mere ka Daniel na ọtụtụ ndị amụma ndị ọzọ dee ọtụtụ ihe gbasara mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ma ọ bụ Mesaya. Ma oge ahụ abụghị oge ọ ga-eme ka a ghọta ihe niile ndị ahụ ha dere. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova mechara ka Daniel hụ ọhụụ gbasara mgbe Alaeze ya ga-amalite ịchị n’eluigwe, ọ gwara Daniel ka o mechie akwụkwọ amụma ahụ ruo mgbe Jehova ga-achọ ka a ghọta ihe ndị ahụ. Mgbe oge ahụ ruru, ihe ọmụma “ga-abakwa ụba.”—Dan. 12:4.

Jehova gwara Daniel na ọtụtụ ndị amụma ndị ọzọ ka ha dee ọtụtụ ihe gbasara Alaeze Mesaya

Jizọs Mere Ka Ndị Mmadụ Mata Gbasara Nzube Chineke

13. (a) Ònye bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa? (b) Olee otú Jizọs si mee ka a ghọtakwuo amụma ahụ dị na Jenesis 3:15?

13 Jehova kwuru hoo haa na Jizọs bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. Jizọs si n’ezinụlọ Devid, ọ ga-abụkwa Eze. (Luk 1:30-33; 3:21, 22) Mgbe Jizọs malitere ije ozi ya n’ụwa, o mere ka ụmụ mmadụ matakwuo gbasara nzube Chineke. (Mat. 4:13-17) Dị ka ihe atụ, Jizọs mere ka onye “agwọ” ahụ e kwuru okwu ya na Jenesis 3:14, 15, bụ doo onye ọ bụla anya. Ọ kpọrọ Ekwensu “ogbu mmadụ,” kpọọkwa ya “nna ụgha.” (Jọn 8:44) Jizọs gosiri Jọn na “agwọ mbụ ahụ” bụ “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.” * (Gụọ Mkpughe 1:1; 12:9.) Jizọs gosikwara Jọn otú ya ga-esi mechaa mezuo amụma ahụ Chineke buru n’Iden ma gwepịa Setan isi, ya bụ, gbuo Setan kpamkpam. Jizọs bụ mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.—Mkpu. 20:7-10.

14-16. Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs hà ghọtara ihe niile Jizọs kụziiri ha? Gịnị mere anyị ji zaa otú ahụ?

14 N’isi mbụ nke akwụkwọ a, anyị kwuru na ihe Jizọs kacha kụziere ndị mmadụ bụ gbasara Alaeze Chineke. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe niile ha chọrọ ịma. O nwedịrị mgbe ọ kọọrọ ha ọtụtụ ihe ma ha aghọtachaghị ha. Ma mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Kraịst mere ka a ghọta ihe ihe ndị ahụ ọ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya pụtara. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

15 N’afọ 33, Jizọs mere ka a ghọta na ndị ahụ ha na ya ga-eso achị n’Alaeze Chineke ga-emecha bịa biri n’eluigwe. Tupu ha agaa eluigwe, a ga-agbanwe ha ha abụrụ mmụọ. Ma, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe a ọ gwara ha ozugbo. (Dan. 7:18; Jọn 14:2-5) N’afọ ahụ Jizọs gwara ha ihe a, o meere ha ihe atụ nke  gosiri na ya laghachi n’eluigwe, ọtụtụ afọ ga-agafe tupu Alaeze Chineke amalite ịchị. (Mat. 25:14, 19; Luk 19:11, 12) Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe a ọ gwara ha. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ha mechara jụọ ya, sị: “Ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze ahụ n’oge a?” Ma, Jizọs achọghị ịkọrọ ha ihe ọzọ n’oge ahụ. (Ọrụ 1:6, 7) Jizọs kụzikwaara ha na ya nwere “atụrụ ọzọ.” Atụrụ ọzọ a esoghị ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ha na Jizọs ga-eso achị. (Jọn 10:16; Luk 12:32) Ndị na-eso ụzọ Kraịst aghọtaghị ndị atụrụ ọzọ ahụ bụ, ha aghọtaghịkwa ndị ìgwè atụrụ nta ahụ bụ. Ọ bụ mgbe afọ 1914 gafere, ya bụ, mgbe Alaeze Chineke malitecharala ịchị n’eluigwe, ka a ghọtara ndị ha bụ.

16 Jizọs nwere ọtụtụ ihe ọ gaara akọrọ ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na ya nọ, ma ọ ma na ha agaghị aghọta ha mgbe ahụ. (Jọn 16:12) O doro anya na Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ọtụtụ ihe gbasara Alaeze Chineke n’oge ahụ ọ nọ n’ụwa. Ma, e nwere ihe ndị ọ na-akụzirighị ha n’oge ahụ banyere Alaeze Chineke.

Ezi Ihe Ọmụma Ga-aba Ụba “n’Oge Ikpeazụ”

17. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta eziokwu gbasara Alaeze Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Oleekwa otú anyị ga-esi aghọta ya?

17 Jehova gwara Daniel na “n’oge ikpeazụ,” ọtụtụ ndị “ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma” gbasara nzube Chineke ga-abakwa ụba. (Dan. 12:4) Ndị chọrọ ịmata ihe bụ́ nzube Chineke ga-agbasi mbọ ike ka ha mata ya. Otu akwụkwọ kwuru na okwu ahụ bụ́ “ga na-awagharị,” pụtara mmadụ iji nwayọọ na-agụ akwụkwọ ka ọ ghọta ihe ọ na-agụ. Ma, n’agbanyeghị otú anyi si mụọ Baịbụl nke ọma, anyị enweghị ike ịghọta ihe o kwuru banyere Alaeze Chineke ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị anyị aka.—Gụọ Matiu 13:11.

18. Olee otú ndị Jehova si egosi na ha nwere okwukwe ma dị umeala n’obi?

18 Jehova ji nwayọọ nwayọọ mee ka ndị mmadụ ghọta eziokwu banyere Alaeze ya ọtụtụ afọ tupu afọ 1914. O jikwa nwayọọ nwayọọ na-eme ka anyị ghọta eziokwu banyere Alaeze ya  n’oge ikpeazụ a. N’isi nke anọ na nke ise n’akwụkwọ a, anyị ga-aghọta na kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, ndị Chineke na-agbanwe otú ha sibu ghọta ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru. Nke a ọ̀ pụtara na Jehova anaghị enyere ha aka ịghọta Baịbụl? Mbanụ. Ọ na-enyere ha aka. Gịnị mere o ji na-enyere ha aka? Ọ bụ n’ihi na ndị ohu ya ndị a nwere okwukwe ma dịrị umeala n’obi. Chineke hụrụ ndị dị otú ahụ n’anya. (Hib. 11:6; Jems 4:6) Ndị Jehova nwere okwukwe na ihe niile Jehova kwuru na Baịbụl ga-emerịrị. Ọ bụrụ na ha achọpụta na ha ghọtahiere otú Chineke ga-esi emezu nzube ya, ha na-ekwu ya ma gbanwee ya n’ihi na ha dị umeala n’obi. Ihe ha kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1925, gosiri n’eziokwu na ha dị umeala n’obi. Ha kwuru, sị: “Anyị ma na ọ bụ Onyenwe anyị na-eme ka a ghọta Okwu ya, nakwa na ọ ga-eme ka ndị ohu ya ghọta Okwu ya otú ọ chọrọ na mgbe ọ chọrọ.”

“Onyenwe Anyị . . . ga-eme ka ndị ohu ya ghọta Okwu ya otú ọ chọrọ na mgbe ọ chọrọ”

19. Olee ihe Jehova merela ka anyị ghọta? Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

19 Mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914, ndị ohu Chineke amachaghị otú ihe niile Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke ga-esi emezu. (1 Kọr. 13:9, 10, 12) Anyị na-achọsi ike ka Chineke mezuo ihe niile o kwere anyị ná nkwa. Nke a emeela mgbe ụfọdụ ka anyị kwuo ihe dị iche n’otú Chineke ga-esi emezu ha. Kemgbe ọtụtụ afọ, a chọpụtala na ihe ọzọ anyị kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1925, bụ eziokwu. Anyị kwuru, sị: “Otu ihe anyị kwesịrị iburu n’uche bụ na ọ bụ mgbe amụma e buru na Baịbụl mezurula ma ọ bụ mgbe ọ na-emezu ka anyị na-aghọta amụma ahụ nke ọma.” Ugbu a oge ikpeazụ a anyị bi n’ime ya fọrọ obere ka ọ gwụ, ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl banyere Alaeze Chineke emezuola, ọtụtụ ndị ọzọ na-emezukwa. Jehova emeela ka anyị ghọtakwuo nzube ya n’ihi na anyi dị umeala n’obi ma na-ekwetakwa ka ọ gbazie anyị mgbe anyị mehiere ihe. O doola onye ọ bụla anya ugbu a na ezi ihe ọmụma abaala ụba.

 Ihe Anyị Na-eme Mgbe Anyị Gbanwere Otú Anyị Sibu Ghọta Ihe Baịbụl Kwuru

20, 21. Olee ihe ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mere mgbe Pọl gwara ha ihe ọhụrụ ha ga-eme?

20 Mgbe Jehova mere ka anyị gbanwee otú anyị sibu akọwa ihe Baịbụl kwuru, a na-eji ya ama ma ànyị nwere okwukwe ma dịrị umeala n’obi. Ànyị ga-anabata ihe ọhụrụ ahụ a kọwara? Ụdị ihe a mere Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na i so ná ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst n’oge ahụ. I jighị Iwu Mozis egwu egwu. Obi na-atọkwa gị ụtọ na ọ bụ naanị obodo unu na-efe Chineke. Obere oge, Chineke enye Pọl onyeozi mmụọ nsọ ya ya edetara unu akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ya ekwuo na ọ bụghịzi iwu na unu ga-eme ihe Iwu Mozis kwuru, nakwa na Jehova ajụla obodo unu, họrọzie Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị Juu na ndị nke bụ́ ndị mba ọzọ ka ha na-efezi ya. (Rom 10:12; 11:17-24; Gal. 6:15, 16; Kọl. 2:13, 14) Olee ihe ị gaara eme?

21 Ndị Kraịst dị umeala n’obi n’oge ahụ nabatara akwụkwọ ozi ahụ Pọl dere. Jehova gọzikwara ha. (Ọrụ 13:48) Ndị ọzọ were iwe ma jụ ịnabata ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ. (Gal. 5:7-12) Ọ bụrụ na ha ekwesie olu ike, ha agaghịzi eso Kraịst chịa.—2 Pita 2:1.

22. Olee otú obi dị gị n’ihe ọhụrụ ndị anyị ghọtara banyere Alaeze Chineke?

22 N’oge anyị a, Jehova emeela ka anyị gbanwee otú anyị sibu akọwa ihe ndị anyị ghọtara gbasara Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, o meela ka anyị ghọtakwuo mgbe a ga-ekewa ndị Alaeze Chineke ga-achị na ndị na-ekweghị ka ọ chịa ha, ya bụ, ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. O meekwala ka anyị ghọta mgbe ndị ha na Jizọs ga-eso achị ga-ezu. Ha ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. O meela ka anyị mata ihe ihe atụ ndị Jizọs mere gbasara Alaeze Chineke pụtara, meekwa ka anyị ghọta mgbe onye ikpeazụ n’ime ndị ahụ ha na Jizọs ga-eso achị ga-aga eluigwe. * Olee otú obi dị gị n’ihe ọhụrụ a niile anyị ghọtara? Ò meela ka okwukwe gị sikwuo ike? Ị̀ ghọtara na ọ bụ otú Jehova si na-akụziri ndị ya dị umeala n’obi ihe? Ọ bụrụ na ị ghọta ya otú ahụ, ihe ndị ọzọ anyị na-aga ikwu n’akwụkwọ a ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-eme ka ndị na-atụ egwu ya na-aghọta nzube ya.

^ para. 4 N’asụsụ Hibru, okwu e si nweta aha Chineke pụtara “ịghọ.” N’ihi ya, Jehova pụtara Onye na-emezu nkwa ya. Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Aha Chineke Pụtara.” Ọ dị na peeji nke 43.

^ para. 6 Ọ bụ eziokwu na e nwere ike ikwu taa na puku afọ abụọ abụghị obere ihe, anyị ekwesịghị ichefu na ụmụ mmadụ na-adịte ndụ aka n’oge ahụ karịa anyị. Si n’oge Adam dịrị ndụ ruo n’oge Ebreham dịrị ndụ, e nwere naanị ọgbọ anọ. Adam na Lemek nna Noa, dịkọrọ ndụ. Lemek na Shem, nwa Noa, dịkọkwara ndụ. Shem na Ebreham dịkọkwara ndụ.—Jen. 5:5, 31; 9:29; 11:10, 11; 25:7.

^ para. 13 E nwere ebe iri na asatọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru a kpọrọ Setan aha. Ma, okwu bụ́ “Setan” gbara ihe karịrị ugboro iri atọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ dị mma na e kwuru ọtụtụ ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gbasara otú a ga-esi amata onye Mesaya bụ, ma kwuo ihe ole na ole gbasara Setan. Mgbe Mesaya bịara n’ụwa, ọ kọọrọ anyị onye Setan bụ. E dere ihe ndị Mesaya ahụ kwuru gbasara Setan n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ para. 22 Ị chọọ ịgụ ebe ndị a gbanwere otú anyị sibu ghọta ihe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl, gụọ Ụlọ Nche ndị a: October 15, 1995, peeji nke 23 ruo na nke 28; January 15, 2008, peeji nke 20 ruo na nke 24; July 15, 2008, peeji nke 17 ruo na nke 21, na Julaị 15, 2013, peeji nke 9 ruo na nke 14.

Ihe T.O.N.K. pụtara bụ Tupu Oge Ndị Kraịst. Ihe O.N.K. pụtara bụ Oge Ndị Kraịst

GỤKWUO GBASARA YA

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

Jehova ji ọgbụgba ndụ isii mee ka obi sie anyị ike na Alaeze ya ga-emezu nzube ya. Olee otú ọgbụgba ndụ ndị ahụ ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?