Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 2

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị n’Eluigwe

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị n’Eluigwe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú Chineke si kwadebe ndị ya maka oge Alaeze ya ga-amalite ịchị

1, 2. Olee otu ihe merenụ nke ụdị ya na-emetụbeghị? Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya na o nweghị mmadụ ọ bụla hụrụ mgbe ihe a mere?

KA E were ya na ị nọ mgbe otu ihe mere. Ihe a merenụ gbanwere ihe ná ndụ ndị mmadụ. Ị̀ gaara anọ n’ebe a nọ kpaa nkata otú ihe ahụ ga-esi eme? O nwere ike ị gaghị anọ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-anọ mgbe a na-ekpebi ihe ndị kpatara e ji agbanwe ọchịchị. A na-anọ n’ọfis gọọmenti, n’obí eze ma ọ bụ n’ụlọ nzukọ akpa nkata ihe ndị ahụ. N’agbanyeghị ebe a nọ kpaa ihe ndị ahụ, ha na-akpa ọtụtụ nde mmadụ aka ọjọọ.

2 Ma, o nwere otu ihe merenụ nke ụdị ya na-emetụbeghị mbụ. Ọ gbanwekwara ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Ma, e nweghị mmadụ ọ bụla hụrụ mgbe ihe a mere. Gịnị ka ihe a bụ? Ọ bụ Alaeze Chineke nke malitere ịchị n’eluigwe. Alaeze a bụ ọchịchị Mezaya Chineke kwere nkwa ya kemgbe ụwa. Alaeze a ga-ebibi ụwa ajọ omume a. (Gụọ Daniel 2:34, 35, 44, 45.) Ebe ọ bụ na e nweghị mmadụ ọ bụla ji anya ya hụ mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe, ànyị kwesịrị ikwu na Jehova achọghị ka ụmụ mmadụ mara gbasara ya? Jehova ò mere ka ndị ohu ya mara banyere Alaeze ahụ tupu ya amalite ịchị n’eluigwe? Ka anyị chọpụtanụ.

‘Onye Ozi M . . . Ga-edozi Ụzọ n’Ihu M’

3-5. (a) Ònye bụ “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ” e kwuru okwu ya na Malakaị 3:1? (b) Olee ihe ga-eme tupu “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ” abịa n’ụlọ nsọ Chineke?

3 N’oge ochie, Jehova kwuru na ya ga-akwadebe ndị ohu ya maka mgbe Alaeze Mesaya ahụ ga-amalite ịchị. Dị ka ihe atụ, ka anyị leba anya n’amụma dị na Malakaị 3:1. Ebe ahụ, sịrị: “Lee! M na-ezite onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m. Na mberede, ezi Onyenwe unu, bụ́ onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ Ya, ya na onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye unu nwere mmasị na ya.”

4 N’oge anyị a, olee mgbe Jehova, bụ́ ‘ezi Onyenwe anyị,’ bịara nyochaa ndị na-efe ya n’ụwa n’ụlọ nsọ ihe atụ ya? Amụma a kwuru na Jehova ga-abịa “ya na onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ.” Ònye bụ onye ozi a? Ọ bụ Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst. (Luk 1:68-73) Ugbu a ọ bụzi eze, ọ ga-enyocha ndị ohu Chineke nọ n’ụwa ma mee ka ha dịrị ọcha.—1 Pita 4:7.

 5 Ma, ònye bụ “onye ozi,” nke mbụ ahụ e kwuru okwu ya na Malakaị 3:1? Onye a e buru n’amụma ga-abịa ọtụtụ afọ tupu ọnụnọ Eze Mesaya amalite. Ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, è nwere onye ‘doziri ụzọ’ tupu Eze Mesaya abịa?

6. Ole ndị jere ozi ka “onye ozi” ahụ e kwuru na ọ ga-akwadebe ezigbo Ndị Kraịst maka ihe ndị ga-eme n’ụwa n’oge e chiri Kraịst eze n’eluigwe?

6 Anyị ga-amata azịza ajụjụ ndị a ka anyị na-eleba anya n’akụkọ na-eme obi ụtọ anyị ga-akọ n’akwụkwọ a gbasara ndị Jehova n’oge anyị a. Akụkọ a na-egosi na n’ihe dị ka n’afọ 1879, e nwere mmadụ ole na ole malitere ime uche Chineke n’oge ahụ. Ọ bụ naanị ha bụ ezigbo Ndị Kraịst, n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ Ndị Kraịst ụgha n’oge ahụ. E mechara kpọwa ezigbo Ndị Kraịst a Ndị Mmụta Baịbụl. Nwanna Charles T. Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ na-elekọta ọrụ ha n’oge ahụ. Ha jere ozi ka “onye ozi” ahụ e buru n’amụma. Ọ bụkwa ha na-akụziri ndị ohu Chineke eziokwu Baịbụl, ma na-akwadebe ha maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ụzọ anọ ha si jee ozi ka “onye ozi” ahụ e buru n’amụma.

Ha Fere Chineke n’Eziokwu

7, 8. (a) N’agbata afọ 1801 na 1899, ole ndị malitere ịkụziri ndị mmadụ na ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ bụ ozizi ụgha? (b) Olee ozizi ụgha ndị Nwanna C. T. Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ gbara n’anwụ?

7 Ndị Mmụta Baịbụl ahụ na-ekpe ekpere mgbe ha na-amụ Baịbụl, ha na-ekwere n’otu ihe, ha na-edekwa eziokwu ha mụtara na Baịbụl otu ebe ma bipụtara ya ndị mmadụ. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, chọọchị Krisendọm anaghị akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke. Ọtụtụ ihe ndị ha na-akụzi bụ ozizi ndị ọgọ mmụọ. Dị ka ihe atụ, ha na-akụzi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ma, n’agbata afọ 1801 na afọ 1899, mmadụ ole na ole ji obi ha malite ịmụ Baịbụl ka ha mata ma ozizi a ò si na Baịbụl. Ha mechara chọpụta na Baịbụl ekwughị na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Henry Grew, na George Stetson, nakwa George Storrs dere n’akwụkwọ ha na ozizi mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ si n’aka Setan. Ha katakwara obi kụziere ndị mmadụ na ozizi a bụ ozizi ụgha. * Ihe mmadụ atọ a dere n’akwụkwọ ha nyeere Nwanna C. T. Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ ezigbo aka ịmata nke bụ́ eziokwu.

8 Ndị Mmụta Baịbụl chọpụtara ihe ndị ọzọ ndị chọọchị na-akụzi na-abụghị eziokwu. Dị ka ihe atụ, ha na-akụzi na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe, nakwa na Chineke ga-ata mkpụrụ obi ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. Ihe ndị a ha na-akụzi na-agbagwoju ndị mmadụ anya. Nwanna Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ gbara ozizi ụgha ndị a n’anwụ ma n’akwụkwọ, ma na traktị, ma n’okwuchukwu ndị ha dere ede.

9. Olee ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke mere ka ndị mmadụ mata na Atọ n’Ime Otu bụ ozizi ụgha?

9 Ndị Mmụta Baịbụl ahụ mekwara ka ndị mmadụ mata na Atọ n’Ime Otu chọọchị niile na-akụzi bụ ozizi ụgha. N’afọ 1887, Ụlọ Nche kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ kwuru hoo haa na Jehova na Jizọs abụghị otu onye, kwuokwa ihe jikọrọ ha abụọ.” Ụlọ Nche a kwukwara na ọ bụ ihe ijuanya “na chọọchị niile kwetara na Chineke dị atọ bụrụ otu. Nke a gosiri na ha hapụ rụ ihe Baịbụl na-akụzi ma kwere ka Setan were ozizi ụgha kee ha agbụ.”

10. Olee ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke gosiri na afọ 1914 ga-abụ afọ pụrụ iche?

10 Ụlọ Nche kọwara amụma ndị kwuru banyere ọnụnọ Kraịst. Ndị e tere mmanụ so na-ebipụta magazin a ghọtara na amụma Daniel buru banyere “oge asaa” bụ maka oge Chineke ga-emezu ihe o kwuru gbasara Alaeze Mesaya. Malite n’afọ 1870, ha kwuru na “oge asaa” ahụ Daniel buru n’amụma ga-agwụ n’afọ 1914. (Dan. 4:25; Luk 21:24) Ọ bụ eziokwu na ụmụnna anyị ndị nọ n’oge ahụ amachaghị ihe niile ga-eme n’afọ ahụ, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị ha mụtara banyere afọ ahụ. Ihe ndị ahụ ha kọọrọ ndị mmadụ ka na-abara anyị uru.

11, 12. (a) Ole ndị ka Nwanna Russell toro maka ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ? (b) Nwanna Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ kụziiri ndị mmadụ ihe ọtụtụ afọ tupu afọ 1914. Olee uru ihe ndị ahụ ha kụziri baara ndị mmadụ?

11 Ma Nwanna Russell ma ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ etoghị onwe ha maka eziokwu ndị ahụ ha mụtara na Baịbụl. Kama, Nwanna Russell toro ndị ọ mụtara ihe n’aka ha, n’ihi na ha bu ya ụzọ gbawa ozizi ụgha n’anwụ. O tokwara Jehova Chineke karịchaa maka na ọ bụ ya kụziiri ndị ohu ya ihe ha kwesịrị ịma, nakwa n’oge ha kwesịrị ịma ihe ndị ahụ. O doro anya na Jehova gọziri mbọ niile Nwanna Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ gbara maka na ha mere ka ndị mmadụ mata  eziokwu Baịbụl. Ka oge na-aga, Nwanna Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ mere ka a ghara inwe ihe jikọrọ ha na Krisendọm.

Nwanna Russell na ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ kụziiri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl

12 Mbọ niile Nwanna Russell na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ gbara ịkụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl magburu onwe ya. Ha kụziiri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl ndị a ọtụtụ afọ tupu afọ 1914. Ọ bụ ya mere Ụlọ Nche Bekee nke November 1, 1917, ji kwuo, sị: “Ọtụtụ nde mmadụ akwụsịla ịtụ ụjọ ọkụ ala mmụọ na ozizi ụgha ndị ọzọ a kụziiri ha . . . A ka na-akụziri ndị mmadụ eziokwu dị na Baịbụl a malitere ịkụziri ha kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ. A gaghị akwụsị ịkụziri ha ya ruo mgbe mmadụ niile nọ n’ụwa nụrụ ya. Ndị iro ga-agbasi mbọ ike ka ndị mmadụ ghara ịnụ ya, ma mbọ niile ha na-agba ga-akụ afọ n’ala.”

13, 14. (a) Olee otú “onye ozi” ahụ si nyere ndị mmadụ aka ịkwadebe maka Eze Mesaya? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ ihe karịrị otu narị afọ gara aga?

13 Chebara ajụjụ a echiche: Ndị Jehova hà gaara akwadebe maka mmalite ọnụnọ Kraịst, ma ọ bụrụ na ha amaghị na Jizọs dị iche, Nna ya bụ́ Jehova adịrịkwa iche? Mbanụ. Ha agaraghị akwadebekwa maka mmalite ọnụnọ Kraịst ma á sị na ha chere na Ndị Kraịst niile ga-aga eluigwe. Ọ ga-esikwara ha ike ịkwadebe maka mmalite ọnụnọ Kraịst ma ọ bụrụ na ha ka na-eche na Chineke ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. O doro anya na “onye ozi” ahụ kwadebere ụzọ maka Eze Mesaya.

14 Ànyịnwa kwanụ? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ụmụnna anyị ndị dịrị ndụ ihe karịrị otu narị afọ gara aga? Anyị kwesịrị ịmụsi Okwu Chineke ike otú ahụ ha mere. (Jọn 17:3) Ka anyị ghara ịdị ka ụwa Setan a na-achụ ego ọnwụ ọnwụ ma jụ ịmụ Okwu Chineke. Kama, ka agụụ ịmụ Okwu Chineke na-agụsi anyị ike.—Gụọ 1 Timoti 4:15.

“Sinụ n’Ime Ya Pụta”

15. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl mechara ghọta banyere chọọchị niile so na Krisendọm? (Gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

15 Ndị Mmụta Baịbụl kụziiri ndị mmadụ na ha kwesịrị ịhapụ chọọchị ha na-ekpe. N’afọ 1879, Ụlọ Nche kwuru okwu banyere “chọọchị Babịlọn.” Ọ̀ bụ poopu ka o kwuru okwu ya? Ka ọ̀ na-ekwu banyere chọọchị Katọlik? Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị Protestant na-akụziri ndị mmadụ na Babịlọn ahụ Baịbụl kwuru okwu ya bụ chọọchị Katọlik. Ma, Ndị Mmụta Baịbụl mechara ghọta na chọọchị niile e nwere na Krisendọm so na “Babịlọn” nke oge a. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na chọọchị niile dị na Krisendọm anaghị akụziri ndị mmadụ eziokwu. * Ka oge na-aga, a gwawara ndị chọọchị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ihe ha kwesịrị ime.

16, 17. (a) Gịnị ka e kwuru n’akwụkwọ anyị bụ́ Millennial Dawn nke Atọ, nakwa n’Ụlọ Nche ka ndị nọ n’okpukpe ụgha mee? (b) Olee ihe ndị mere ka aka ná ntị ahụ a dọrọ ghara ịdacha ike ike? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

16 Dị ka ihe atụ, n’afọ 1891, e kwuru n’akwụkwọ anyị bụ́ Millennial Dawn, nke Atọ, na Chineke ajụla Babịlọn nke oge a. Akwụkwọ a kwuru, sị: “Chineke ajụla chọọchị niile dị na Krisendọm.” Ọ gwakwara ndị niile nọ na Krisendọm “ozizi ụgha na ihe a na-eme na ya na-agbakasị ahụ́, ka ha si na ya pụta.”

 17 Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche January afọ 1900 kwuru ihe ndị aha ha ka dị n’akwụkwọ chọọchị Krisendọm kwesịrị ime. Ha na-asị na o nweghị ihe o mere ma aha ha ka dịrị na chọọchị Krisendọm. Onye ọ bụla n’ime ha na-asị, “Obi m niile dị n’ọgbakọ Chineke. Ọ na-esikwa ike mụ agaa chọọchị ọzọ.” A jụrụ ajụjụ n’isiokwu ahụ, sị: ‘Ọ̀ dị mma ka otu ụkwụ mmadụ dịrị n’ọgbakọ, nke ọzọ adịrị na Babịlọn? Ihe a ọ̀ bụ ihe Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme? O doro anya na ọ bụghị ihe ọ chọrọ. Onye ọ bụla [banyere chọọchị] ekwerela n’ihu ọhaneze na ya ga na-eme ihe niile chọọchị chọrọ ka ọ na-eme. O kwesịkwara ịna-eme ihe ndị ahụ o kwetara na ya ga na-eme ruo mgbe ọ ga-agwa ha hoo haa na ya abụkwaghị onye òtù ha.’ E kwusiri okwu a ike ruo ọtụtụ afọ. * Ndị ohu Jehova ekwesịghị inwe ihe ọ bụla jikọrọ ha na okpukpe ụgha.

18. Gịnị mere ndị nọ na Babịlọn Ukwuu Ahụ ji kwesị isi na ya pụta?

18 Ọ bụrụ na a gwaghị ndị mmadụ ọtụtụ ugboro ka ha si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta, Kraịst, bụ́ onye e chiri eze ọhụrụ, ọ̀ gaara enwe ndị e tere mmanụ kwadebere maka Alaeze Chineke? O doro anya na ọ garaghị enwe n’ihi na ọ bụ naanị Ndị Kraịst n’enweghị ihe jikọrọ ha na Babịlọn ga-efeli Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ànyị ekpebisiela ike na anyị agaghị enwe ihe jikọrọ anyị na okpukpe ụgha? Ya bụrụ otú ahụ, ka anyị na-erubere iwu a Chineke nyere anyị isi, ya bụ, ka anyị ‘si na Babịlọn pụta.’—Gụọ Mkpughe 18:4.

Izukọta Maka Ọmụmụ Ihe

19, 20. Olee ihe a gwara ndị na-agụ Ụlọ Nche ka ha mee nke ga-enyere ha aka ịmata uru ịna-aga ọmụmụ ihe bara?

19 Ndị Mmụta Baịbụl ahụ kụziiri ndị mmadụ na ndị ohu Chineke kwesịrị ịna-ezukọta maka ife Chineke, ma o kwe omume. Ihe onye ọ bụla chọrọ ịbụ ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ime abụghị naanị isi n’okpukpe ụgha pụta. O kwesịkwara iso ndị na-efe Chineke nke ọma na-amụ ihe. Ụlọ Nche ndị mbụ e bipụtara kwuru na ndị na-agụ ya kwesịrị ịna-ezukọta maka ife Chineke. Dị ka ihe atụ, n’ọnwa Julaị afọ 1880, Nwanna Russell kwuru ihe ndị ọ chọpụtara n’ebe ndị ọ gara ikwu okwu. O kwuru na ọmụmụ ihe ụmụnna ndị ahụ nwerela enyerela ha aka. Ọ gwaziri ha ka ha dee otú ọmụmụ ihe ndị ahụ si na-aga edee ma zite ha. Nwanna Russell kwuru na ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha dere ga-agba n’Ụlọ Nche. Gịnị mere ha ga-eji agba n’Ụlọ Nche? Nwanna Russell kwuru, sị: “Ka anyị mata otú Onyenwe anyị si na-enyere unu aka, nakwa ka anyị mata ma ùnu na-esokwa ndị ọzọ unu na ha kweere n’otu ihe na-enwe ọmụmụ ihe.”

Ihe a bụ foto Nwanna Russell na ndị mbụ ghọrọ Ndị Mmụta Baịbụl na Kọpenhegin sere n’afọ 1909. Obodo a dị na Denmak

20 N’afọ 1882, e nwere otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche Bekee. Isiokwu ahụ bụ “Izukọta Ọnụ.” Isiokwu a gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-enwe ọmụmụ ihe, “ka ha nwee ike ịmụta ihe ma na-agbarịta ibe ha ume, nakwa ka ha mee ka okwukwe ha sikwuo ike.” Isiokwu ahụ kwukwara, sị: “Ihe bụ mkpa abụghị ma mmadụ ọ̀ gụrụ akwụkwọ ma ọ bụ na ọ gụghị, ma ụbụrụ ọ̀ na-aghọ mmadụ nkọ ma ọ bụ na ọ naghị aghọ ya. Kama,  mgbe onye ọ bụla n’ime unu na-abịa, ya jiri Baịbụl ya na pensụl ya, nakwa akwụkwọ ya. Ka onye ọ bụla depụta okwu ndị dị na Baịbụl . . . otú o nwere ike. Ka onye ọ bụla họrọkwa otu isiokwu dị ya mma, ma rịọ Chineke ka o nye ya mmụọ nsọ ya ka o nwee ike ịghọta isiokwu ahụ. Ka onye ọ bụla gụọ isiokwu ahụ na Baịbụl ma chebara ihe ahụ ọ gụrụ echiche, ka o jirikwa ihe dị n’otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ tụnyere ihe dị n’amaokwu Akwụkwọ Nsọ ọzọ. Chineke ga-enyere onye ọ bụla mere otú ahụ aka ka ọ ghọta eziokwu.”

21. A bịa n’ịga ọmụmụ ihe na ịgba ụmụnna ume otu otu, olee ihe ọgbakọ dị n’Alegeni, nke dị na Pensụlvenịa mere, nke anyị kwesịkwara ịna-eme?

21 Ebe isi ụlọ ọrụ Ndị Mmụta Baịbụl dị n’oge ahụ bụ n’Alegeni, dị na Pensụlvenịa, n’Amerịka. Ndị nọ n’isi ụlọ ọrụ a na-egosi ndị ọzọ ihe ha kwesịrị ịna-eme. Otú ha si eme ya bụ na ha na-ezukọta amụ Baịbụl otú ahụ Baịbụl si kwuo ka anyị na-eme ná Ndị Hibru 10:24, 25. (Gụọ ya.) Otu Nwanna nwoke merela agadi kwuru otú ọmụmụ ihe ahụ na-adị n’oge ahụ. Aha Nwanna a bụ Charles Capen. Ọ bụ nwata mgbe ahụ. O dere, sị: “M ka na-echeta otu amaokwu Baịbụl e dere n’ahụ́ ájá nke ụlọ mgbakọ anyị. ‘Otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna.’ Anaghị m echefu amaokwu a echefu. Ọ na- egosi na n’ọgbakọ ndị Jehova, e nweghị ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị.” (Mat. 23:8) Nwanna Capen kwuru na a na-agba ha ezigbo ume n’ọmụmụ ihe, na-akụzikwara ha ọtụtụ ihe. O kwukwara na Nwanna Russell na-agbasi mbọ ike agakwuru nwanna ọ bụla ma gbaa ya ume.

22. Olee ihe ụmụnna anyị mere mgbe a gwara ha ka ha na-enwe ọmụmụ ihe? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ha?

22 Ọtụtụ ndị malitere inwe ọmụmụ ihe ma na-eme ihe a na-akụziri ha. E hiwere ọgbakọ na steeti ndị dị ka Ohayo, Mishigan, nakwa na steeti ndị ọzọ dị n’Amerịka. E hiwekwara ọgbakọ dị iche iche ma na Kanada ma na Meksiko, nakwa n’obodo ndị ọzọ. Chebagodịrị ajụjụ a echiche: Ezigbo Ndị Kraịst hà gaara akwadebe n’eziokwu maka ọnụnọ Kraịst ma a sị na a kụzighịrị ha ịna-enwe ọmụmụ ihe otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru? Mbanụ. Anyịnwa kwanụ? Anyị ekwesịghị ịna-ahapụ ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na anyị ana-aga ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị ga na-efekọ Jehova ọnụ. Ọ ga-emekwa ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, okwukwe anyị ana-esikwukwa ike.

Ikwusasi Ozi Ọma Ike

23. Gịnị ka e kwuru n’Ụlọ Nche nke mere ka o doo anya na ndị niile e tere mmanụ ga-ekwusarịrị ozi ọma?

23 Ndị Mmụta Baịbụl kụziiri ibe ha na ndị niile e tere mmanụ ga-ekwusarịrị ozi ọma. N’Ụlọ Nche Bekee nke afọ 1885, e kwuru, sị: “Anyị ekwesịghị ichefu na ihe mere e ji tee ndị e tere mmanụ mmanụ bụ ka ha na-ekwusa ozi ọma.” (Aịza. 61:1) Ụlọ Nche Bekee nke afọ 1888 kwuru, sị: “Ihe a gwara anyị mee doro anya . . . Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya mewe ihe ọzọ, anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru. Ihe anyị na-ekwu mgbe ahụ bụ na anyị erughị eru ka e tee anyị mmanụ.”

24, 25. (a) Olee ihe ọzọ Nwanna Russell na ụmụnna ndị ha na ya rụkọrọ ọrụ mere ma e wezụga ịgwa ụmụnna ka ha jiri ịga ozi ọma kpọrọ ihe? (b) Olee ihe otu nwanna bụ́ onye kọpọtụa kọrọ gbasara otú o si kwusaa ozi ọma n’oge ahụ a na-enweghị ụgbọala?

 24 Nwanna Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ gbara ụmụnna ume ịga ozi ọma. E wezụgakwa nke ahụ, ha malitere ibipụta traktị Bekee a na-akpọ Bible Students’ Tracts. E mechakwara kpọwa traktị a Old Theology Quarterly. E nyere ndị na-agụ Ụlọ Nche n’oge ahụ traktị a ka ha kesaara ya ndị mmadụ n’anaghị ha ego.

Anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe anyị n’otu n’otu, sị: ‘M̀ na-ejechi ozi ọma anya?’

25 N’oge ahụ, ihe a na-akpọ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile bụ ndị kọpọtụa. Nwanna Charles Capen, anyị kwurula okwu ya, bụ otu n’ime ha. Nwanna a kwuru ihe mere n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Eji m map otu ụlọ ọrụ dị n’Amerịka sere gaa ebe niile na Pensụlvenịa kwusaa ozi ọma. Ị ga-ahụ ụzọ niile dị na Pensụlvenịa na map a. O nyeere m aka iji ụkwụ gaa ebe niile n’obodo ahụ kwusaa ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, m na-anọ ebe ahụ abalị atọ gagharịa nata ndị mmadụ ọda akwụkwọ ha chọrọ ka m wetara ha. Ọ bụ akwụkwọ anyị a na-akpọ Studies in the Scriptures ka ha na-asị m wetara ha. Ọ na-abụ m lọta, nwetachaa mkpụrụ ole ahụ ha chọrọ, mụ akwụọ ụgwọ trọk ịnyịnya na-adọkpụ ka o buga ha Pensụlvenịa, ka m nwee ike inye ha ndị tụrụ ọda ha. Ọ na-abụkarị m gawa, chi jie, mụ akwụsị ma soro ndị ọrụ ugbo hie ụra n’ebe ha na-ehi ụra. N’oge ahụ, ụgbọala adịghị.”

Onye a bụ onye kọpọtụa. Ihe a mapawara n’aka ekpe n’ahụ́ trọk a bụ “Chaatị E Ji Kọwaa Oge Dị Iche Iche”

26. (a) Olee otú ikwusa ozi ọma ga-esi nyere ndị na-efe Chineke aka ịkwadebe maka oge Kraịst ga-amalite ịchị? (b) Olee ajụjụ ndị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya?

26 Ọ bụ naanị ndị katara obi na ndị ozi ọma na-atọ ụtọ na-ekwusa ozi ọma mgbe ahụ. Ezigbo Ndị Kraịst n’oge ahụ, hà gaara akwadebe onwe ha maka mgbe Kraịst ga-amalite ịchị ma ọ bụrụ na a kụzighịrị ha na ha kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma? O doro anya na ha agaraghị akwadebe. A sị ka e kwuwe, ikwusa ozi ọma n’ụwa niile bụ otu n’ime ihe ndị e ji ama ọnụnọ Kraịst. (Mat. 24:14) Ndị Chineke kwesịrị ike ájị̀ n’ume ma jiri ozi ọma kpọrọ ihe n’ihi na ozi ọma bụ otu n’ime ihe Jehova ga-eji maka ya azọpụta ndị mmadụ. Anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-agachi ozi ọma anya? M̀ na-ahapụ ihe ụfọdụ m na-eme ka m nwee ike ijechi ozi ọma anya?’

Alaeze Chineke Amalite Ịchị

27, 28. Gịnị ka Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ? Olee ihe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya mere mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị?

27 Afọ 1914, bụ́ afọ pụrụ iche, mechara ruo. Anyị kwuru ná mmalite isiokwu a na ọ dịghị mmadụ ọ bụla hụrụ ihe ndị ahụ dị ebube mere n’eluigwe n’afọ 1914. Ma, Jọn onyeozi hụrụ ihe ndị ahụ n’ọhụụ. Ị̀ ma ihe ndị Jọn hụrụ? Ọ hụrụ “oké ihe ịrịba ama” n’eluigwe. Ọ hụrụ “nwaanyị” Chineke. Nwaanyị a abụghị nwaanyị nkịtị. Ọ bụ nzukọ Chineke nke ndị so na ya bụ ndị mmụọ ozi. Nwaanyị a dị ime ma mechaa mụọ nwa nwoke. Nwa nwoke a abụghị nwa nwoke nkịtị. Baịbụl gwara anyị na n’oge na-adịghị anya, nwa nwoke a “ga-eji mkpanaka ígwè zụọ mba niile dị ka atụrụ.” Ma mgbe a mụrụ nwa nwoke a, ‘e kuuru ya gaa n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ocheeze ya dị.’ Jọn nụrụ otu oké olu n’eluigwe nke sịrị: “Nzọpụta na ike na alaeze nke Chineke anyị na ikike nke Kraịst ya amalitewo ugbu a.”—Mkpu. 12:1, 5, 10.

 28 O doro anya na ihe Chineke gosiri Jọn n’ọhụụ bụ mgbe Alaeze Mesaya malitere ịchị. Ihe a merenụ dị ebube. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka ọ dị mma n’obi. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya busoro Maịkel ma ọ bụ Kraịst nakwa ndị mmụọ ozi agha. Ọ bụ Kraịst na-edu ndị mmụọ ozi a. Olee otú agha a si gaa? Baịbụl gwara anyị, sị: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya.”—Mkpu. 12:7, 9.

Ihe ndị mere n’ụwa n’afọ 1914 mere ka Ndị Mmụta Baịbụl mata na Kraịst abụrụla Eze n’eluigwe

29, 30. (a) Mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe, olee ihe ndị mere n’ụwa? (b) Oleekwa ihe ndị mere n’eluigwe?

29 Ọtụtụ afọ tupu 1914, ndị mmụta Baịbụl kwuru na a ga-enwe ọgba aghara n’ụwa malite n’afọ 1914. Ma hanwa kwuru ihe a amadịghị otú ọ ga-esi mee. Ọhụụ ahụ Jọn hụrụ gosiri na Setan ga-amalite ịkpa ike ọjọọ n’ụwa. Baịbụl kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpu. 12:12) A malitere ịlụ agha ụwa mbụ n’afọ 1914. Ọ bụkwa n’afọ a ka ihe ndị na-egosi na e chiela Kraịst eze n’eluigwe malitere imezu n’ụwa niile. Ihe ndị a mere ka anyị mata na “oge ikpeazụ” nke ụwa ajọ omume a amalitela.—2 Tim. 3:1

30 Ma, mgbe e chichara Jizọs eze, a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe. Ha enweghịkwa ike ịga ebe ahụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere ndị mmụọ ozi ji ṅụrịa ọṅụ. Jọn kwuru, sị: “N’ihi nke a, ṅụrịanụ ọṅụ, gị eluigwe na unu ndị bi n’ime ya!” (Mkpu. 12:12) Ebe ọ bụ na a chụpụla Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, Jizọs amalitekwa ịchị, oge eruola ka Chineke jiri Alaeze Mesaya nyere ndị ya nọ n’ụwa aka. Olee otú ọ ga-esi enyere ha aka? Ná mmalite isiokwu a, anyị kwuru na Kraịst, bụ́ “onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ,” ga-ebu ụzọ mee ka ndị Chineke nọ n’ụwa dị ọcha. Olee otú a ga-esi eme ya?

Oge Ule

31. Gịnị ka Malakaị kwuru ga-eme n’oge ahụ a ga-eme ka ndị ohu Chineke dị ọcha? Oleekwa otú ihe a o kwuru si bido imezu? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

31 Malakaị kwuru na ihe agaghị adịchara ndị Chineke mfe mgbe a na-eme ka ha dịrị ọcha. O dere, sị: “Ònye pụrụ idi ụbọchị ọ ga-abịa, ònye pụkwara iguzo mgbe ọ ga-apụta? N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ nke onye na-anụcha ihe, dịkwa ka ncha nke ndị na-asụ ákwà.” (Mal. 3:2) Ihe ndị a o kwuru mechara mee. Malite n’afọ 1914, ọtụtụ ọnwụnwa bịaara ndị ohu Chineke nọ n’ụwa. Ka a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, e mekpọrọ ọtụtụ Ndị Mmụta Baịbụl ọnụ, tụọkwa ha mkpọrọ. *

32. Olee ihe merenụ nke kpara Ndị Mmụta Baịbụl aka ọjọọ malite n’afọ 1916 gawa?

32 Ma, e nwere ihe ndị merenụ kpara Ndị Mmụta Baịbụl a aka ọjọọ. N’afọ 1916, Nwanna Russell nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri isii na anọ. Ọnwụ ya gbawara ụmụnna anyị n’oge ahụ obi. Ihe ụfọdụ ụmụnna mere mgbe ọ nwụrụ gosiri na ha weere ya na ọ bụrụ na ọ nọghị ya, ihe agaghị aga aga ná nzukọ Jehova. N’oge ọ dị ndụ, ụfọdụ n’ime ha na-akwanyere ya ùgwù karịa otú ha kwesịrị ịkwanyere ya. Ma Nwanna Russell achọghị ka a na-akwa nyere ya ụdị ùgwù ahụ. Ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị ahụ chere na ugbu a Nwanna Russell nwụrụla, Chineke agaghịzi na-eme ka ndị ohu ya ghọtakwuo eziokwu dị na Baịbụl. Ọ bụrụ na e kwuo ihe a ga-eme ka nzukọ Jehova na-aga n’ihu, ụfọdụ n’ime ha ana-agba ya ụkwụ. Ihe a ha na-eme mere ka e nwee ọgba aghara n’ọgbakọ, ụfọdụ emechaakwa hapụ ọgbakọ.

33. Mgbe ihe Ndị Mmụta Baịbụl tụrụ anya ka o mee na-emeghị, olee otú o si kpaa ha aka ọjọọ?

33 E nwere ihe ọzọ kpara okwukwe ụmụnna anyị n’oge ahụ aka ọjọọ. Ihe ahụ bụ na ihe ha tụrụ anya ka o mee emeghị. Ọ bụ eziokwu na e kwuru n’Ụlọ Nche na Oge Ndị Mba Ọzọ ga-agwụ n’afọ 1914, ụmụnna anyị aghọtaghị ihe ndị ga-eme n’afọ ahụ. (Luk 21:24) Ha chere na Kraịst ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ laa eluigwe ka ha na ya chịwa. Ma ihe ndị ahụ ha tụrụ anya ya emeghị. Ná ngwụcha afọ 1917, e kwuru n’Ụlọ Nche na ọ bụ n’afọ 1918 ka a ga-akwụsị ikwusa ozi ọma e kwusawara kemgbe afọ iri anọ. Ma mgbe afọ 1918 ruru, a kwụsịghị ikwusa ozi ọma. A kwụsịghịkwa ikwusa ya mgbe afọ ahụ gwụrụ. E kwukwara n’Ụlọ Nche n’oge ahụ na e wechaala ihe ubi, naanị ihe fọrọnụ bụ ịtụtụkọta ihe ndị fọrọ afọ. Ma, ọtụtụ ndị kwụsịrị ife Jehova n’ihi na ihe ndị ha tụrụ anya ha emeghị.

34. Olee ọnwụnwa bịaara Ndị Mmụta Baịbụl n’afọ 1918? Oleekwa ihe mere ndị Krisendọm ji chee na nke Ndị Mmụta Baịbụl na-eme agwụla?

34 Mgbe nke bụ́ ọnwụnwa bịara bụ n’afọ 1918. A kpọchiri Nwanna J. F. Rutherford na ụmụnna anyị asaa ndị ọzọ ya na ha na-arụkọ ọrụ. Tupu afọ ahụ, ọ bụ Nwanna Rutherford ka a họpụtara ka ọ na-edu ndú mgbe Nwanna Russell nwụrụ. Ma n’afọ 1918, e kpere Nwanna Rutherford na ụmụnna asaa ndị ahụ ikpe arụrụala, tụọ ha mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti Amerịka dị n’Atlanta, nke dị na Jọjia. N’oge ahụ, o yiri ka ozi ọma Ndị Mmụta Baịbụl na-ekwusa akwụsịla. Obi tọrọ ọtụtụ ndị ụkọchukwu Krisendọm ụtọ. Ha chere na nke Ndị Mmụta Baịbụl a na-enye ha nsogbu agwụla, ebe ọ bụ na a tụọla ndị na-ahazi ọrụ Ndị Mmụta Baịbụl mkpọrọ, mechie isi ụlọ ọrụ ha dị na Bruklin, machiekwa ha ikwusa ozi ọma n’Amerịka nakwa na Yurop. (Mkpu. 11:3, 7-10) Ma, ha dara ya.

Oge A Tọhapụrụ Ha

35. Gịnị mere Jizọs ji kwe ka e mekpọọ ndị na-eso ụzọ ya ọnụ? Oleekwa otú o si nyere ha aka?

35 E nwere ihe ndị a na-emegide Ndị Mmụta Baịbụl na-amaghị. Ha amaghị na Jizọs kwere ka e mekpaa ndị ya ahụ́ n’ihi na Jehova chọrọ ‘ịnụcha ha otú e si anụcha ọlaọcha,’ ya bụ, ọ chọrọ ime ka ha dị ọcha. (Mal. 3:3) Jehova na Ọkpara ya ma na ọnwụnwa ndị ahụ bịaara Ndị Mmụta Baịbụl a ga-eme ka ha dị ọcha, meekwa ka ha rukwuo eruo ijere Jizọs ozi. Ná mbido afọ 1919, Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ihe ndị iro ya chere na ọ gaghị ekwe omume. O mere ka a tọhapụ Ndị Mmụta Baịbụl ahụ a tụrụ mkpọrọ. (Mkpu. 11:11) N’oge ahụ ka Kraịst mezuru otu n’ime ihe ndị Baịbụl kwuru a ga-eji ama oge ikpeazụ. Ọ họpụtara “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ohu a bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị e tere mmanụ. Ọ bụ ha ga na-ahazi ọrụ ndị Chineke ma na-akụziri ha ihe n’oge kwesịrị ekwesị.—Mat. 24:45-47.

36. Gịnị ka Ndị Mmụta Baịbụl mere nke gosiri na ha enwerela onwe ha?

 36 N’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Mach afọ 1919, a tọhapụrụ Nwanna Rutherford na ụmụnna asaa ndị ọzọ ahụ na mkpọrọ. Ozugbo ha pụtara na mkpọrọ, ha haziri mgbakọ distrikti a ga-enwe na Septemba n’afọ ahụ. Ha hazikwara ka e bipụtawa magazin anyị bụ́ The Golden Age, bụ́ nke anyị na-akpọ Teta! ugbu a. Ihe mere e ji bipụta ya bụ ka e jiri ya na Ụlọ Nche na-aga ozi ọma. * Ọ bụkwa n’afọ 1919 ka a malitere ibipụta Bulletin, bụ́ nke anyị na-akpọ Ozi Alaeze Anyị ugbu a. Kemgbe a malitere ibipụta Ozi Alaeze, ọ na-enyere anyị ezigbo aka n’ikwusa ozi ọma. O doro anya na kemgbe afọ 1919, Ndịàmà Jehova ji ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ kpọrọ ihe.

37. Olee ihe ụfọdụ ndị mere mgbe afọ 1919 gachara nke gosiri na ha akwụsịla ife Chineke?

37 Ikwusa ozi ọma so mee ka Ndị Kraịst dị ọcha. Dị ka ihe atụ, o mere ka a mata Ndị Kraịst dị umeala n’obi na ndị nke dị mpako. Ndị nke dị mpako ekweghị aga ozi ọma. N’ihi ya, ha pụrụ n’ọgbakọ. Mgbe afọ 1919 gachara, ụfọdụ ndị a pụrụ n’ọgbakọ malitere ịkatọ Ndị Mmụta Baịbụl ma na-agba ha akwụkwọ n’ụlọikpe. Ha sonyedịịrị ndị iro anyị na-emegide ụmụnna anyị.

38. Gịnị ka anyị na-amụta ná mmeri ụmụnna anyị meriri Setan na ụwa ya?

 38 N’agbanyeghị ihe ndị ahụ e mere ụmụnna anyị, ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma, ọtụtụ mmadụ na-abatakwa n’ọgbakọ. Otú ọrụ ha si aga n’ihu n’ihu nakwa otú ha si merie ọnwụnwa niile ndị bịaara ha gosiri na Alaeze Chineke amalitela ịchị. O nweghị ihe ọzọ mere ndị a na-ezughị okè ji na-emeri Setan na ụwa ya ma ọ́ bụghị na Jehova si n’aka Ọkpara ya nakwa n’Alaeze Mesaya na-akwadosi ha ike ma na-agọzi ha.—Gụọ Aịzaya 54:17.

Onye a bụ Nwanna Rutherford mgbe ọ na-ekwu okwu ihu ọha ná mgbakọ distrikti. Okwu ihu ọha a tọrọ ndị mmadụ ụtọ. O kwuru ya ọnwa ole na ole a tọhapụchara ya na mkpọrọ

39, 40. (a) Olee ihe ụfọdụ anyị ga-eleba anya na ha n’akwụkwọ a? (b) Olee uru ịmụ akwụkwọ a ga-abara anyị?

39 Malite n’isi nke atọ gawa, anyị ga-eleba anya n’ihe Alaeze Chineke mezurula n’ụwa kemgbe otu narị afọ ọ malitere ịchị n’eluigwe. Nkebi nke ọ bụla dị n’akwụkwọ a ga-akọwara anyị ihe Alaeze Chineke na-arụ n’ụwa taa. Ihe e dere n’igbe dị n’isiokwu nke ọ bụla ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịma ma ànyị kwetasiri ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. N’isiokwu ndị ikpeazụ dị n’akwụkwọ a, anyị ga-ekwu banyere ihe ndị anyị na-atụ anya na Alaeze Chineke ga-eme mgbe ọ ga-abịa ibibi ụwa ọjọọ a ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs. Alaeze a ga-abịa ime ihe ndị a n’oge na-adịghị anya. Olee uru akwụkwọ a ga-abara gị ma ị mụọ ya?

40 Setan chọrọ ime ka ị gharazie ikweta na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ma, Jehova chọrọ ime ka i kwetasie ike na Alaeze ya bụ ọchịchị dị adị. Nke a ga-enyere gị aka ka ị bụrụ a kwaa akwụrụ n’ọgbakọ. (Efe. 6:16) N’ihi ya, biko, gbalịa kpee ekpere mgbe ọ bụla ị chọrọ ịgụ akwụkwọ a. Na-ajụ onwe gị mgbe niile ma ị̀ ka kwetara na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ọ bụrụ na i kwetasie ike na ọ dị adị, ọ ga-eme ka i nwekwuo okwukwe na ị ga-abanye n’ime ya. Ọ ga-emekwa ka i jiri obi gị niile na-akwadosi Alaeze ahụ ike ruo ụbọchị Alaeze Chineke ga-akpa ike n’ụwa a, ya bụ, ụbọchị mmadụ niile ga-ekweta na Alaeze Chineke dị adị n’eziokwu, nakwa na ọ malitela ịchị.

^ para. 7 Ị chọọ ịmatakwu Grew, Stetson, na Storrs, gụọ akwụkwọ anyị bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 45 na nke 46.

^ para. 15 Ọ bụ eziokwu na Ndị Mmụta Baịbụl ma na e kwesịghị inwe ihe jikọrọ ha na chọọchị ndị ha na ụwa a na-emekọ ihe, e nwere ndị chọọchị ha ka na-akpọ ụmụnna ha. Ihe mere ha ji akpọ ha ụmụnna ha bụ na ndị ahụ sị na ha kweere n’àjà mgbapụta Kraịst, nyefeekwa Chineke onwe ha. Ha weere ha ka ụmụnna ha ruo ọtụtụ afọ.

^ para. 17 Otu ihe mere ka aka ná ntị ahụ a dọrọ ghara ịdacha ike ike bụ na e kwuru na ndị ọ gbasara karịchaa bụ ìgwè atụrụ nta, ya bụ, otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ. N’isi nke ise n’akwụkwọ a, a ga-agwa anyị na tupu afọ 1935, Ndị Mmụta Baịbụl chere na ndị chọọchị Krisendọm so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe 7:9, 10. Ha chekwara na ndị chọọchị Krisendọm a bụ ndị nke abụọ Kraịst ga-akpọrọ laa eluigwe n’ihi na ha kwadoro ya n’ụbọchị ahụ ọ ga-abịa.

^ para. 31 Na Septemba afọ 1920, e nwere isiokwu pụrụ iche gbara na The Golden Age, nke a na-akpọ Teta! ugbu a. Isiokwu ahụ kwuru ụdị ọnụ a na-emekpọ ụmụnna anyị nọ na Kanada, Ingland, Jamanị, nakwa n’Amerịka n’oge Agha Ụwa Mbụ. Ụfọdụ ihe ndị ahụ a na-eme ụmụnna anyị na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ma ọtụtụ afọ tupu agha ụwa mbụ amalite, e mekpọghị ha ọnụ otú ahụ.

^ para. 36 Ndị e bu n’obi n’oge ahụ na-ebipụta Ụlọ Nche ruo ọtụtụ afọ bụ ndị so n’ìgwè atụrụ nta.

GỤKWUO GBASARA YA

“Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”

Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọtakwuo ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. Mata otú ihe ohu ahụ na-akụziri anyị si eme ka okwukwe anyị sie ike.