Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 18

Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú ndị Jehova si eji ego ha akwado ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke na ihe mere ha ji eme ya

1, 2. (a) Gịnị ka Nwanna Russell gwara otu pastọ chọrọ ịmata otú Ndị Mmụta Baịbụl si enweta ego ha ji na-arụ ọrụ ha? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

E NWERE otu ụbọchị otu pastọ chọọchị a na-akpọ Reformed Church bịakwutere Nwanna Charles T. Russell. Pastọ a chọrọ ka Nwanna Russell gwa ya otú Ndị Mmụta Baịbụl si enweta ego ha ji na-arụ ọrụ ná nzukọ ha.

Nwanna Russell gwara ya na Ndị Mmụta Baịbụl “anaghị ana ụtụ ná nzukọ ha.”

Pastọ a ajụọ ya, sị, “Oleezi otú unu si enweta ego?”

Nwanna Russell a sị ya: “M gwa gị otú anyị si enweta ego, ị gaghị ekweta. Mgbe ndị mmadụ bịara ọmụmụ ihe anyị, o nweghị onye ha na-ahụ na-ebugharị efere ka ndị mmadụ tinye ego na ya. Ma ha na-ahụ ihe ndị anyị ji ego na-arụ. Ha hụchaa otú ebe ahụ dị, ha agwa onwe ha, sị, ‘E jikwanụ ego rụọ ụlọ a . . . Olee otú m nwere ike isi nye obere onyinye?’”

Mgbe Nwanna Russell kwuchara ihe ndị a, pastọ ahụ elee ya anya ma fufee n’isi.

Nwanna Russell gwara pastọ ahụ na ihe a niile ya gwara ya bụ eziokwu. Ọ gwakwara ya na ndị mmadụ na-ajụ ya otú ha nwere ike isi nye obere onyinye ka e were ya na-ejere Chineke ozi. Nwanna Russell gwara ya na ọ bụrụ na mmadụ enweta ego, ọ ga-achọ iji obi ya dum nye ego ahụ ka e jiri ya na-ejere Onyenwe anyị ozi. Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ego, o nweghị onye kwesịrị ịgba ya ụgwọ onyinye. *

2 Ihe niile ahụ Nwanna Russell gwara pastọ ahụ bụ eziokwu. Kemgbe ụwa, a ma ndị Chineke ama na ha na-eji obi ha dum enye Chineke onyinye. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si nye onyinye. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ụfọdụ ndị Chineke taa sirila nye onyinye. Ka anyị na-eleba anya n’otú ndị Chineke si enweta ego ha ji na-arụ ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi na-akwado Alaeze Chineke?’

“Ka Onye Ọ Bụla Obi Ya Kpaliri Weta Onyinye”

3, 4. (a) Olee ihe Jehova tụkwasịrị ndị ya obi na ha ga-eme? (b) Olee otú ụmụ Izrel si kwado ụlọikwuu ahụ ha wuru?

3 Jehova tụkwasịrị ndị ya obi na ha ga-eme ihe ọ gwara ha. Ọ ma na obi ga-adị ha ụtọ inye onyinye ma á sị ha mee otú ahụ. Ka anyị leba anya n’ihe abụọ mere n’oge ụmụ Izrel.

 4 Mgbe Jehova kpọpụtachara ndị Izrel n’Ijipt, ọ gwara ha rụọrọ ya ụlọikwuu a ga na-ebugharị ebugharị. Ọ bụ n’ụlọikwuu a ka ha ga-anọ na-efe ya. Ịrụ ụlọikwuu a na itinye arịa dị iche iche na ya, ga-efu ndị Izrel nnukwu ego. Jehova gwara Mozis ka ọ gwa ndị Izrel ka ha nye onyinye a ga-eji arụ ụlọikwuu a. Mozis gwara ha, sị: “Ka onye ọ bụla obi ya kpaliri weta onyinye Jehova.” (Ọpụ. 35:5) Ma, olee ihe ndị Izrel mere ugbu a ọ na-adịbeghị anya ha kwụsịrị ịrụ ‘ụdị ọrụ ọ bụla ndị Ijipt ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu’? (Ọpụ. 1:14) Ha mere ihe a gwara ha. Ha ji obi ha dum nye ọlaedo, ọlaọcha, na ihe ndị ọzọ a ga-eji arụ ụlọikwuu ahụ. O nwere ike ịbụ na ha natara ndị Ijipt ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ha ji nye onyinye. (Ọpụ. 12:35, 36) Ụmụ Izrel nyere ihe karịrị ihe a chọrọ. Ọ bụ ya mere Mozis ji kwuo ka ‘a kwụsị ndị Izrel iwebata onyinye ha.’—Ọpụ. 36:4-7.

5. Olee ihe ụmụ Izrel mere mgbe Devid gwara ha ka ha nye onyinye a ga-eji arụ ụlọ nsọ Chineke?

5 Mgbe ihe dị ka narị afọ anọ na iri asaa na ise gachara, e nwere onye Izrel nyere Chineke onyinye. Aha ya bụ Devid. O nyere “ihe onwunwe pụrụ iche” ka e were ha rụọ ụlọ nsọ Chineke. Ụlọ nsọ a bụ ụlọ nsọ mbụ a na-arụrụ Chineke n’ụwa a. Ọ bụkwa ebe a ga-anọ na-efe ya. Mgbe Devid nyechara Chineke onyinye a, ọ gwara ndị Izrel ka ha nye nke ha. Ọ gwara ha, sị: “Ònye n’ime unu na-ewepụta onwe ya iwetara Jehova onyinye taa?” Ndị Izrel wepụtara onwe ha inye onyinye. Ha “ji obi zuru ezu nye Jehova onyinye afọ ofufo.” (1 Ihe 29:3-9) Devid ghọtara na ọ bụ Jehova nyere ha ihe niile ahụ ha ji nye onyinye. Ọ bụ ya mere o ji gwa Jehova n’ekpere, sị: “Ihe niile si n’aka gị, ọ bụkwa n’aka gị ka anyị nwetara ihe anyị nyere gị.”—1 Ihe 29:14.

6. Olee ihe ndị anyị ji ego arụ ma a bịa n’ihe gbasara Alaeze Chineke? Oleekwa ajụjụ ndị a na-ajụ?

6 Ma Mozis ma Devid amanyeghị ndị Izrel ka ha nye Chineke onyinye. Kama, ndị Izrel ji obi ha dum nye Chineke onyinye. Taa kwanụ? O doro onye ọ bụla n’ime anyị anya na e ji ego na-arụ ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke. Ọ na-efu nnukwu ego iji na-ebipụta Baịbụl na akwụkwọ anyị dị iche iche e ji amụ Baịbụl ma na-ekesara ha ndị mmadụ. Ọ bụkwa nnukwu ego ka anyị ji na-arụ alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nakwa ebe ndị anyị na-anọ enwe ọmụmụ ihe. Ọ na-efukwa nnukwu ego ilekọta ha. Ọ bụkwa nnukwu ego ka anyị ji na-azụta ihe ndị anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka na ibugara ha ya. N’ihi ya, e nwere ajụjụ abụọ dị mkpa a na-ajụ. Ajụjụ ndị ahụ bụ: Olee otú anyị si enweta ego anyị ji na-eme ihe ndị a? È kwesịrị ịmanye Ndị Kraịst amanye ka ha nye onyinye?

“Ọ Dịghị Mgbe A Ga-Arịọ Ego ma Ọ Bụ Rịọ Ndị Mmadụ Arịrịọ Maka Enyemaka”

7, 8. Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị arịọ ndị mmadụ ego ha ga-eji na-arụrụ Chineke ọrụ?

7 Nwanna Russell na ụmụnna ya na ha rụkọrọ ọrụ jụwara isi na ha agaghị ana ndị mmadụ ụtụ ma ọ bụ na-agba ọnyà ego otú ahụ chọọchị dị iche iche na Krisendọm si eme. E nwere ihe Nwanna Russell kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke abụọ e bipụtara. Isiokwu ya bụ “Ị̀ Chọrọ Ụlọ Nche?” Nwanna Russell kwuru n’Ụlọ Nche ahụ, sị: “Anyị kweere na onye na-akwado mbipụta Ụlọ Nche bụ JEHOVA. Ebe ọ dị otú ahụ, ọ dịghị mgbe a ga-arịọ ndị  mmadụ ego ma ọ bụ gwa ha ka ha nye ego a ga-eji na-ebipụta ya. Mgbe Onye ahụ nke kwuru, sị: ‘Ọlaọcha na ọlaedo nile dị n’elu ugwu bụ nke m,’ kwụsịrị iweta ego a ga-eji na-ebipụta ya, anyị ga-aghọta na oge eruola ka a kwụsị ibipụta ya.” (Hag. 2:7-9) Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri atọ a malitere ibipụta Ụlọ Nche, nzukọ na-ebipụta ya akwụsịbeghị ibipụta ya. Ego nzukọ a ji arụ ọrụ akọbeghị ha.

8 Ndị Jehova anaghị arịọ ndị mmadụ ego. Ha anaghị ebugharị efere ka ndị bịara ọmụmụ ihe ha tinye ego na ya. Ha anaghịkwa edegara ndị mmadụ akwụkwọ ozi ka ha nye ha ego. Ha anaghịkwa agba lọtrị ma ọ bụ chaa chaa. Ha anaghị agbakwa ọnyà ego. Ha anaghịkwa ere ihe na bazaa. Ha na-eme otu ihe e kwuru kemgbe n’Ụlọ Nche. E kwuru, sị: “O doro anyị anya na ọ dịghị mma ịrịọ ndị mmadụ ego anyị ga-eji na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, otú ahụ chọọchị ndị ọzọ na-eme . . . O dokwara anyị anya na iji ụzọ dị iche iche na-arịọ ndị mmadụ ego n’aha Onyenwe anyị na-ewe ya iwe. Ọ naghị agọzi ndị na-enye ego ndị ahụ. Ọ naghịkwa agọzi ọrụ ndị e ji ego ndị ahụ rụọ.” *

“Ka Onye Ọ Bụla Nye Dị Ka O Kpebiri n’Obi Ya”

9, 10. Gịnị bụ otu ihe mere anyị ji enye onyinye?

9 Ebe anyị bụ ndị Alaeze Chineke na-achị, e kwesịghị ịmanye anyị amanye inye onyinye. Kama, anyị na-eji obi anyị niile enye ego na ihe ndị ọzọ anyị nwere ka e jiri ha na-arụ ọrụ ndị gbasara Alaeze Chineke. Gịnị mere anyị ji eji obi anyị dum na-enye onyinye? Ka anyị leba anya n’ihe atọ mere anyị ji eme otú ahụ.

10 Ihe nke mbụ mere anyị ji eji obi anyị dum enye onyinye bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime “ihe dị mma n’anya ya.” (1 Jọn 3:22) Obi na-atọ Jehova ụtọ ma onye na-efe ya jiri obi ya dum nye ya onyinye. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst banyere otú ha ga-esi na-enye onyinye. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:7.) Ezigbo Onye Kraịst anaghị enye onyinye n’ihi na a manyere ya amanye ma ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ na ndị ọzọ na-eme otú ahụ. Kama, ihe mere o ji enye onyinye bụ n’ihi na ‘o kpebiela n’obi ya’ na ya ga-enye onyinye. * Ihe nke ahụ pụtara bụ na ọ na-enye onyinye mgbe o chebachaara mkpa e nwere echiche, chebakwara otú o nwere ike isi nye aka. Jehova hụrụ onye na-eme otú a n’anya, n’ihi na “Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ: “Chineke hụrụ ndị inye ihe na-atọ ụtọ n’anya.”

Ụmụaka ụmụnna nọ na Mozambik na-ejikwa obi ha niile enye onyinye

11. Gịnị mere anyị ji enye Jehova ihe kacha mma anyị nwere?

11 Ihe nke abụọ mere anyị ji enye onyinye bụ na ọ bụ otu ụzọ anyị si ekele Jehova maka ọtụtụ ihe ọma o meere anyị. E nwere otu ihe Chineke gwara ndị Izrel ka ha mee anyị kwesịrị ichebara echiche. Ka anyị leba anya n’ihe ahụ. (Gụọ Diuterọnọmi 16:16, 17.) Mgbe nwoke onye Izrel ọ bụla na-aga ememme atọ ha na-eme kwa afọ, ọ ga-enye Chineke onyinye ‘dabere n’otú Jehova si gọzie ya.’ N’ihi ya, tupu nwoke ọ bụla agawa ememme ndị ahụ, ọ ga-echebara ọtụtụ ihe ọma Chineke merela ya echiche ma kpebie ihe kacha mma o nwere ike inye Chineke. Otú ahụ ka anyị  kwesịkwara ime taa. Ọ bụrụ na anyị echebara ọtụtụ ihe ọma Jehova meere anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị nye ya ihe kacha mma anyị nwere. Anyị na-eji obi anyị dum na-enye Chineke ego anyị na ihe ndị ọzọ anyị nwere. Ihe ndị a anyị na-enye Jehova na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị o meere anyị.—2 Kọr. 8:12-15.

12, 13. Olee ihe anyị na-eme iji gosi na anyị hụrụ Eze anyị n’anya? Ego ole ka onye ọ bụla n’ime anyị na-enye?

12 Ihe nke atọ mere anyị ji eji obi anyị dum na-enye Chineke onyinye bụ na ọ na-egosi na anyị hụrụ Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst n’anya. Olee otú o si bụrụ eziokwu? E nwere ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya n’abalị ikpeazụ o jere ozi n’ụwa. (Gụọ Jọn 14:23.) Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m.” Gịnị na gịnị so n’okwu Jizọs? Otu ihe so n’okwu Jizọs bụ iwu ahụ o nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Anyị na-eme ihe a Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Otú anyị si eme ya bụ na anyị na-eji oge anyị, ike anyị, nakwa ihe niile anyị nwere, na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke. Ihe ndị a anyị na-eme na-egosi na anyị hụrụ Eze Mesaya anyị n’anya.

 13 Ebe anyị bụ ụmụ amaala Alaeze Chineke, anyị na-eji obi anyị dum enye Chineke ego anyị iji gosi na anyị na-akwado Alaeze ya. Olee otú anyị si na-eme ya? Ọ bụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-enye. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-enye onyinye otú o nwere ike. Ma, ọtụtụ ụmụnna anyị enwechaghị ego. (Mat. 19:23, 24; Jems 2:5) N’agbanyeghị nke ahụ, obi na-atọ Jehova na Ọkpara ya ụtọ n’onyinye ọ bụla ụmụnna ndị a ji obi ha dum nye ha. Obi na-atọkwa ụmụnna ndị a ụtọ ma ha cheta nke a.—Mak 12:41-44.

Olee Ebe A Na-etinye Ego E Nyere n’Onyinye?

14. Olee otú Ndịàmà Jehova si enye ndị mmadụ akwụkwọ ha n’oge gara aga?

14 N’oge gara aga, ọ na-abụ anyị nye ndị mmadụ akwụkwọ anyị, anyị agwa ha obere ego ha ga-enye n’onyinye. Nke a mere ka ndị na-enwechaghị ego nwee ike inweta akwụkwọ anyị. Ma, ọ bụrụ na ndị anyị ziri ozi ọma chọrọ ịgụ akwụkwọ anyị, ma ha enweghị ego ha ga-enye n’onyinye, anyị na-eji obi anyị dum ahapụrụ ha akwụkwọ ndị ahụ. Mkpa anyị abụghị ego, kama, ọ bụ inye ndị chọrọ ịmụta banyere Chineke akwụkwọ ndị ahụ ka ha nwee ike ịgụ ha ma fewe Chineke.

15, 16. (a) Malite n’afọ 1990, olee ihe Òtù Na-achị Isi gbanwere n’otú anyị si enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị? (b) Olee otú anyị si enye onyinye n’ọgbakọ anyị? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ihe E Ji Ego A Na-enye n’Onyinye Eme.”)

15 Ma, ihe gbanwere malite n’afọ 1990. Òtù Na-achị Isi kwuru ka ụmụnna nọ n’Amerịka na-enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị n’agwaghị ha ego ole ha ga-enye n’onyinye. Ọ bụzi ndị anyị nyere akwụkwọ anyị ga-enye ego ọ bụla masịrị ha ma ha chọọ. Òtù Na-achị Isi degaara ọgbakọ niile e nwere n’Amerịka akwụkwọ ozi, sị: “A ga na-enye ndị nkwusa na ndị nwere mmasị akwụkwọ na magazin anyị n’agwaghị ha weta ego ọ bụla tupu e nye ha ya. . . . Ọ bụrụ na onye e nyere akwụkwọ anyị achọọ inye onyinye iji kwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile, o nwere ike ime otú ahụ. Ma e nwere ike inye ya akwụkwọ ma ò nyere onyinye ma o nyeghị.” Olee uru ihe a bara? O mere ka o doo ndị mmadụ anya na a naghị akwụ anyị ụgwọ n’ozi ọma anyị na-ezi. O mekwara ka ndị mmadụ ghọta na “anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke ere.” (2 Kọr. 2:17) E mechakwara gwa ọgbakọ Ndịàmà Jehova niile ka ha na-eme ihe ahụ a gwara ụmụnna anyị nọ n’Amerịka.

16 Olee otú anyị si enye onyinye n’ọgbakọ anyị? E nwere igbe onyinye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Onye ọ bụla chọrọ inye onyinye ga-aga tinye onyinye ya n’igbe ndị ahụ. Onye chọrọnụ nwekwara ike izigara alaka ụlọ ọrụ anyị onyinye ya. N’afọ ọ bụla, a na-enwe isiokwu na-agba n’Ụlọ Nche nke na-ekwu otú ndị chọrọ inye onyinye nwere ike isi enye onyinye ha.

Olee Ihe A Na-eji Ego Ndị Ahụ Eme?

17-19. Kwuo ihe e ji onyinye ndị anyị na-enye eme ma a bịa n’ihe gbasara (a) ọrụ zuru ụwa ọnụ, (b) Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-arụ n’ụwa niile, nakwa (ch) ego a na-emefu n’ọgbakọ.

17 “Ọrụ zuru ụwa ọnụ.” A na-eji ego ụfọdụ e nyere n’onyinye akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ụfọdụ n’ime ihe ndị e ji ego ndị ahụ eme bụ ibipụta akwụkwọ ndị anyị na-ekesa n’ụwa niile. Anyị na-ejikwa ha na-arụ alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, na-ejikwa ha elekọta ha. A na-ejikwa ha azụ ihe ndị e ji arụ ọrụ na Betel, na-ejikwa ha ahazi ụlọ akwụkwọ dị iche iche e nwere na nzukọ  Jehova. A na-ejikwa ego ndị ahụ elekọta ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, nakwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ bụrụ na ọdachi adakwasị ụmụnna anyị, a na-ejikwa ego ndị ahụ azụta ihe ndị anyị ji agbatara ha ọsọ enyemaka. *

18 Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-arụ n’ụwa niile. A na-eji ego ụfọdụ e nyere n’onyinye enyere ọgbakọ ọ bụla chọrọ ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka ma ọ bụkwanụ nyere ndị nke chọrọ ịrụzi nke ha mebiri emebi aka. A naghị ana ha ọmụrụ nwa. Ka ọgbakọ ndị a na-enye onyinye maka aka a e nyeere ha, a na-eji ego ndị ahụ enyekwara ọgbakọ ndị ọzọ aka. *

19 Ego a na-emefu n’ọgbakọ. A na-ejikwa ego ụfọdụ e nyere n’onyinye arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, jirikwa ha na-arụ ọrụ ndị ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Ndị okenye nwekwara ike ịgwa ọgbakọ ka e were ụfọdụ n’ime ego ọgbakọ nyere n’onyinye nye alaka ụlọ ọrụ maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Mgbe ọ bụla a chọrọ ime udị ihe a, ndị okenye ga-agwa ọgbakọ ego ole ha chere e nwere ike izigara alaka ụlọ ọrụ. Ọgbakọ kwado ya, e zigara ya alaka ụlọ ọrụ. N’ọnwa ọ bụla, nwanna na-ahụ maka ihe ndekọ ego ọgbakọ ga-edepụta ego ole ọgbakọ nwetara na ego ole e mefuru, a gụọrọ ya ọgbakọ.

20. Olee otú i nwere ike isi jiri ‘ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa’ sọpụrụ Jehova?

20 O doro anya na nzukọ Jehova na-emefu nnukwu ego n’ozi ọma anyi na-ezi ndị mmadụ n’ụwa niile. Ọ bụrụ na anyị eburu ya n’obi mgbe niile, ọ ga-eme ka anyị ‘jiri ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa sọpụrụ Jehova.’ (Ilu 3:9, 10) Ike anyị, uche anyị, nakwa ihe ndị Jehova na-akụziri anyị n’ọgbakọ ya so n’ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa anyi ji asọpụrụ ya. O doro anya na anyị chọrọ iji ihe ndị a na-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, anyị kwesịkwara icheta na ego anyị na ihe onwunwe anyị sokwa n’ihe ndị dị oké ọnụ ahịa anyị ji asọpụrụ Chineke. Ka anyị niile jisie ike na-enye Chineke ihe ndị anyị nwere, otú anyị nwere ike inye. Ka anyị jisiekwa ike na-enye ya ihe ndị ahụ mgbe anyị nwere ike inye ha ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-enye Jehova onyinye, ọ ga-eme ka e nye ya otuto. Ọ ga-egosikwa na anyị na-akwado Alaeze Mesaya.

^ para. 1 Ụlọ Nche Bekee, July 15, 1915, peeji nke 218 na nke 219.

^ para. 8 Ụlọ Nche Bekee, August 1, 1899, peeji nke 201.

^ para. 10 Otu onye na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru na okwu Grik bụ́ ‘ikpebi’ pụtara “ibu ụzọ kpebie ihe a ga-eme.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ eziokwu na a na-enwe obi ụtọ n’inye ihe, onye chọrọ inye ihe kwesịkwara ibu ụzọ kpebie ihe ọ ga-enye.”—1 Kọr. 16:2.

^ para. 17 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgụkwu banyere otú anyị si agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka, gụọ isi iri abụọ n’akwụkwọ a.

^ para. 18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na-arụ, gụọ isi iri na itoolu n’akwụkwọ a.

GỤKWUO GBASARA YA

Otú Anyị Nwere Ike Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka

Chọpụta otú inye onyinye maka ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa niile si enye aka eme ka a na-enyere ndị ọzọ aka, meekwa ka ha nụ okwu Chineke.

Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?

Mụta otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị, ego anyị, ike anyị, na nkà anyị na-akwado Alaeze Chineke.