Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 20

Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka

Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Ihe ndị anyị na-eme mgbe ọdachi dakwasịrị ụmụnna anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya

1, 2. (a) Olee ihe kpara Ndị Kraịst nọ na Judia aka ọjọọ? (b) Olee ihe ụmụnna ha ndị nọ ebe ọzọ meere ha nke gosiri na ha hụrụ ha n’anya?

N’IHE dị ka afọ 46, ụnwụ dara na Judia, agụụ ana-aghụkwa ndị bi na ya anya. Nri dị oké ọnụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs bi n’obodo a enweghịkwa ego ha ga-eji azụ nri. Ị hụ ha, ị ga-ama na agụụ akpaala ha aka ọjọọ. Ma, o nwere ihe Jehova chọrọ imere ha. Tupu afọ ahụ, o nwebeghị ndị na-eso ụzọ Jizọs o meerela ụdị ihe a. Gịnị ka ọ bụ?

2 Ahụhụ a ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na-ata na Jeruselem nakwa na Judia metụrụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi n’ Antiọk na Siria n’obi. O metụkwara ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst n’obi. Ọ bụ ya mere ha ji tụkọta ego ha ga-eji enyere ụmụnna ndị ahụ aka. Mgbe ha tụkọtachara ego ndị ahụ, ha nyere ya Banabas na Sọl, bụ́ ụmụnna ndị ha tụkwasịrị obi. Ụmụnna ndị a wegaziiri ya ndị okenye nọ na Jeruselem ka ha jiri ya gbatara ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ọsọ enyemaka. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 11:27-30; 12:25.) Mgbe e nyere ụmụnna ndị a agụụ na-echi ọnụ n’ala ego ndị ahụ, olee otú i chere obi dị ha? O doro anya na ihe ọma a ụmụnna ha nọ n’Antiọk meere ha tọgburu ha atọgbu.

3. (a) Olee otú Ndị Kraịst taa si eme ihe ahụ Ndị Kraịst nọ n’Antiọk n’oge ndịozi mere? Kọọ otu ihe gosiri na anyị na-eme otú ahụ taa. (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ọsọ Enyemaka Mbụ Gbara Ọkpụrụkpụ Anyị Gbataara Ụmụnna Anyị n’Oge Anyị A.”) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

3 Ọsọ enyemaka a Ndị Kraịst bi n’Antiọk gbataara ụmụnna ha ndị bi na Jeruselem bụ nke mbụ Ndị Kraịst bi n’otu mba na-agbatara Ndị Kraịst ibe ha bi ná mba ọzọ ọsọ enyemaka. Anyị na-emekwa otu ihe ahụ taa. Ọ na-abụ anyị nụ na ọdachi dakwasịrị Ndị Kraịst ibe anyị bi n’obodo ọzọ, anyị agbatara ha ọsọ enyemaka. * Anyị ga-eleba anya ugbu a n’ajụjụ atọ gbasara ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Ileba anya na ha ga-enyere anyị aka ịghọta na ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka so n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ajụjụ ndị ahụ bụ: Gịnị mere a ga-eji sị na ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka so n’ozi anyị na-ejere Chineke? Gịnị mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Olee uru ọsọ enyemaka a na-abara anyị?

Ihe Mere E Nwere Ike Iji Sị na Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka So ‘n’Ozi Dị Nsọ’ Anyị Na-ejere Chineke

4. Olee ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt banyere ozi Ndị Kraịst na-ejere Chineke?

4 N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt, o kwuru gbasara ozi abụọ Ndị Kraịst na-eje. Ọ bụ eziokwu na ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ihe o dere gbasakwara Ndị Kraịst so ‘n’atụrụ ọzọ’ taa. (Jọn 10:16) Otu n’ime  ozi ahụ anyị na-eje bụ “ozi nke ime ka a dị ná mma,” ya bụ, ozi ọma anyị na-ezi ndị mmadụ nakwa Baịbụl anyị na-akụziri ha. (2 Kọr. 5:18-20; 1 Tim. 2:3-6) Ozi ọzọ anyị na-ejekwa bụ ozi anyị na-ejere ụmụnna anyị. Pọl kpọrọ ụdị ozi a ‘ozi a na-ejere ndị nsọ.’ (2 Kọr. 8:4) A bịa n’ozi abụọ a Pọl kwuru okwu ya, ya bụ, “ozi nke ime ka a dị ná mma” na ‘ozi a na-ejere ndị nsọ,’ e si n’okwu Grik bụ́ di·a·ko·niʹa sụgharịta okwu bụ́ “ozi.” Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mata ihe okwu a pụtara?

5. Gịnị ka ihe Pọl kwuru gbasara ọsọ enyemaka na-egosi?

5 Otú ahụ Pọl si jiri otu okwu kwuo gbasara ozi abụọ ahụ anyị na-eje gosiri na, ma ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka, ma ọrụ ndị ọzọ anyị na-arụ n’ọgbakọ so n’ozi anyị na-ejere Jehova. Tupu ya ekwuo gbasara ozi abụọ ndị ahụ, o kwuru, sị: “E nwekwara ije ozi dị iche iche, ma e nwere otu Onyenwe anyị ahụ; e nwekwara ịrụ ọrụ dị iche iche, . . . Ma ọrụ ndị a niile ka otu mmụọ nsọ ahụ na-arụ.” (1 Kọr. 12:4-6, 11) Nke bụ́ eziokwu bụ na Pọl kwuru na ozi dị iche iche anyị na-eje n’ọgbakọ so ‘n’ozi dị nsọ’ anyị na-ejere Chineke. * (Rom 12:1, 6-8) Ọ bụ ya mere o ji chee na o kwesịrị ekwesị ka ya were oge ya ụfọdụ ‘na-ejere ndị nsọ ozi.’—Rom 15:25, 26.

6. (a) Gịnị mere Pọl ji kwuo na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ibe anyị so n’ozi anyị na-ejere Chineke? (b) Olee otú anyị si agbatara ụmụnna anyị n’ụwa niile ọsọ enyemaka taa? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Mgbe Ọdachi Mere!”)

6 Pọl nyeere Ndị Kọrịnt aka ka ha ghọta na ịgbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka so n’ozi ha na-ejere Jehova. O kwuru na ihe mere Ndị Kraịst ji agbatara ibe ha ọsọ enyemaka bụ n’ihi na ha “na-erube isi n’ozi ọma banyere Kraịst.” (2 Kọr. 9:13) N’ihi ya, ihe mere Ndị Kraịst ji na-enyere ibe ha aka bụ na ha chọrọ ime ihe Kraịst na-akụziri ha. Pọl kwukwara na ihe ọma Ndị Kraịst na-emere ibe ha bụ n’ihi “oké obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.” (2 Kọr. 9:14; 1 Pet. 4:10) Ọ bụ ya mere e ji kwuo ihe e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1975 banyere ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. E kwuru, sị: “Obi kwesịrị isi anyị ike na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-eme Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, obi ụtọ.” N’eziokwu, ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke.—Rom 12:1, 7; 2 Kọr. 8:7; Hib. 13:16.

Ibu Ezigbo Ihe n’Obi Na-agbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka

7, 8. Gịnị bụ ihe mbụ mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

7 Olee ihe anyị bu n’obi na-agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka? Pọl zara ajụjụ a n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrịnt. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15.) 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl kwuru ihe atọ mere anyị ji arụ “ọrụ a nke ijere ọha mmadụ ozi,” ma ọ bụ, ihe mere anyị ji agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Ka anyị leba ha anya otu otu.

8 Nke mbụ bụ na ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka na-eme ka e too Jehova. Ị̀ chọpụtara na ná 2 Ndị Kọrịnt 9:11-15, Pọl gwara ụmụnna ya gbasara Jehova Chineke ọtụtụ ugboro. Ọ gwara ha gbasara ‘ịna-enye Chineke ekele,’ gwakwa ha gbasara “ọtụtụ okwu ekele a na-enye Chineke.” (Amaokwu nke 11, na nke 12) O kwuru gbasara otú ọsọ enyemaka Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha si eme ka a “na-enye Chineke otuto,” nakwa ka a na-eto Chineke  maka ‘oké obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ.’ (Amaokwu nke 13, na nke 14) Ihe ikpeazụ Pọl kwuru gbasara ọsọ enyemaka a Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha bụ: “Ekele dịrị Chineke.”—Amaokwu nke 15; 1 Pita 4:11.

9. Olee otú ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị si eme ka ụfọdụ ndị gbanwee otú ha si ele anyị anya? Kọọ otu ihe gosiri na nke ahụ bụ eziokwu.

9 Ndị Chineke taa weere na ọsọ enyemaka ha na-agbatara ibe ha na-emekwa ka e nye Jehova otuto, nakwa ka a na-achọ ozizi ya mma. (1 Kọr. 10:31; Taị. 2:10) O doro anya na ọsọ enyemaka Ndịàmà Jehova na-agbatara ụmụnna ha na-emekarị ka ụfọdụ ndị kwụsị ịkpọ anyị na Jehova aha ọjọọ. Dị ka ihe atụ: E nwere otu nwaanyị bi n’otu obodo ajọ ifufe kpara mkpamkpa. Tupu ajọ ifufe a efee, o nwere akwụkwọ nwaanyị a kwo Ndịàmà Jehova mapawa n’ọnụ ụzọ ya. Ihe e dere na ya bụ: “Achọghị M Ka Ndịàmà Jehova Bịa n’Ụlọ M.” Mgbe ajọ ifufe ahụ fechara, nwaanyị a nọ n’ụlọ ya otu ụbọchị hụ ebe ndị ọrụ enyemaka na-arụzi otu ụlọ ajọ ifufe ahụ mebiri. Ọ nọ na-ele otú ha si na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Mgbe ọ chọpụtara na ndị ọrụ a na-eme ka ụmụnne, ọ gara ebe ahụ ka ọ mara ndị ha bụ. Mgbe o rutere ebe ahụ, a gwa ya na ha bụ Ndịàmà Jehova, ya eju ya anya. Ihe dapụrụ ya n’ọnụ bụ: “Echeburu m na unu bụ ndị ọjọọ.” Gịnị ka nwaanyị a meziri? Ọ gara wepụ ihe ahụ o kwo Ndịàmà Jehova mapawa n’ọnụ ụzọ ya.

10, 11. (a) Olee ihe ndị anyị meerela ụmụnna anyị nke gosiri na anyị na-enye ha ihe na-akpa ha n’ụba? (b) Olee akwụkwọ na-enyere ụmụnna anyị aka mgbe ha na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ihe Na-enyekwuru Ụmụnna Aka Ịgbata Ọsọ Enyemaka.”)

10 Nke abụọ bụ na ọ na-eme ka anyị ‘na-enye ụmụnna anyị ihe na-akpa ha n’ụba.’ (2 Kọr. 9:12a) Ọ na-agụsi anyị agụụ ike inye ụmụnna anyị ihe na-akpa ha na ime ka ahụhụ ha na-ata belata. Gịnị mere anyị ji eme otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọgbakọ Ndị Kraịst dị ka “otu ahụ́.” Ọ bụrụkwa na “otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ.” (1 Kọr. 12:20, 26) N’ihi ya, ọ bụ otú ụmụnna anyị si hụ ibe ha n’anya na-eme, ọtụtụ n’ime ha nụhaala na e nwere ụmụnna ha ọdachi dakwasịrị, ha ahapụ ihe ọ bụla ha na-eme, chịrị ngwá ọrụ ha, gawa ebe ahụ ka ha nyere ụmụnna ha ndị ahụ aka. (Jems 2:15, 16) Dị ka ihe atụ, mgbe ala ọma jijiji kpara mkpamkpa na Japan n’afọ 2011, alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka degaara Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè n’Amerịka akwụkwọ ka ha “lee ma à ga-enweta ụmụnna ole na ole” ga-ewepụta onwe ha ịga Japan rụghachi Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị ebe ahụ. Ị̀ ma ihe merenụ? N’ime izu ole na ole alaka ụlọ ọrụ degachaara kọmitii ahụ akwụkwọ ozi, ihe fọrọ obere ka o ruo narị ụmụnna isii wepụtara onwe ha ịga ebe ahụ. Ha kwukwara na ha ga-akwụrụ onwe ha ụgwọ ụgbọelu. Ndị na-elekọta alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka kwuru, sị: “Otú ụmụnna si wepụta onwe ha tụrụ anyị n’anya.” Otu nwanna onye Japan jụrụ otu n’ime ụmụnna ndị a si mba ọzọ bịa inyere ha aka ihe mere o ji bịa inyere ha aka. Nwanna ahụ gwara ya, sị: “Anyị na ụmụnna anyị ndị Japan bụ ‘otu ahụ́.’ Ahụhụ ha na-ata na-emetụkwa anyị n’ahụ́.” Ụmụnna ndị a na-agbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka anaghị achọ ihe ga-abara naanị ha uru. E nwedịrị mgbe ha na-eme ihe nwere ike ịta isi ha ebe ha na-achọ inyere ụmụnna ha aka. *1 Jọn 3:16.

11 Ọsọ enyemaka a anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-emekwa ka ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-ekwu okwu ọma gbasara anyị. Dị ka ihe atụ, na 2013, e nwere mkpamkpa kpara na steeti Akan sas, dị n’Amerịka. Mgbe ihe a mechara, otu akwụkwọ akụkọ kọrọ otú Ndịàmà Jehova si gaa ozugbo ka ha nyere ndị mmadụ aka. Akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ, sị: “Otú Ndịàmà Jehova si ahazi ndị òtù ha na-agbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka dị egwú. Ọ na-eme ka ha gaa ebe ọdachi mere ozugbo na-enyere ndị mmadụ aka.” O doro anya na ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru bụ eziokwu. Anyị ‘na-enye ụmụnna anyị ihe na-akpa ha n’ụba.’

12-14. (a) Gịnị mere inyere ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị aka ka ha maliteghachi ije ozi ọma na ọmụmụ ihe ji dị oké mkpa? (b) Olee ihe ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị kwuru nke gosiri na ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe na-abara anyị ezigbo uru?

12 Nke atọ bụ na anyị na-enyere ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị aka ka ha maliteghachi ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Pọl kwuru na ọsọ enyemaka ahụ a gbataara ha ga-eme ka ha ‘na-enye Chineke ọtụtụ okwu ekele.’ (2 Kọr. 9:12b) Otú kacha mma ndị ahụ a gbataara ọsọ enyemaka ga-esi kelee Jehova bụ ịmaliteghachi ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe. (Fil. 1:10) Otu Ụlọ Nche e bipụtara n’afọ 1945 kwuru, sị: “Pọl kwadoro . . . ka a nakọta onyinye maka na ọ na-eme ka . . . Ndị Kraịst nọ ná mkpa nwee ike ịzụta ihe ndị dị ha mkpa ha ga-eji enyere ndụ aka. Ọ na-emekwa ka ha nwee ume ịgbara Jehova àmà.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka anyị bu n’obi agbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị ndị a amaliteghachi izi ozi ọma, ha na-akasi ndị agbata obi ha obi, kasiekwa onwe ha obi.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

13 Ka anyị leba anya ugbu a n’ihe ụfọdụ ụmụnna anyị a gbataara ọsọ enyemaka kwuru. Anyị ga-ahụ otú ozi ọma ha maliteghachiri izi si kasie ha obi. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ozi ọma mụ na ndị ezinụlọ m maliteghachiri izi baara anyị ezigbo uru. Ka anyị na-akasi ndị ọzọ obi, anyị anaghị echegbucha onwe anyị maka ọdachi ahụ dakwasịrị anyị.” Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Izi ndị ọzọ ozi ọma na-eme ka obi m pụọ n’ihe niile ọdachi ahụ mebiri. O mere ka ahụ́ ruo m ala.” Nwanna nwaanyị ọzọ kwuru, sị: “O nwere ọtụtụ ihe ndị anyị na-amaghị ihe anyị ga-eme, ma, ozi ọma mere ka ndụ ezinụlọ anyị nwee isi. Ịkọrọ ndị ọzọ banyere ụwa ọhụrụ mere ka obi sie anyị ike na Chineke ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ.”

14 Ịga ọmụmụ ihe so n’ihe ọzọ ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị kwesịrị ibido mewe ozugbo. Ka anyị leba anya n’ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kiyoko. Nwanna nwaanyị a dị ihe dị ka iri afọ ise na asatọ. Ala ọma jijiji mere n’obodo ha lara ihe niile o nwere n’iyi ma e wezụga uwe na akpụkpọ ụkwụ o yi mgbe ahụ. Ọ nọ na-eche ma ò nwere mgbe ihe ga-emecha dịrị ya mma. Ka ọ nọ na-eche ihe a, otu okenye nọ n’ọgbakọ ha bịakwutere ya ma gwa ya na ha ga-anọ n’ụgbọala ya, ya bụ, n’ụgbọala okenye a, nwee ọmụmụ ihe ha na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nwanna Nwaanyị Kiyoko kwuru, sị: “Mgbe oge ọmụmụ ihe ahụ ruru, mụ na okenye a na nwunye ya nakwa nwanna nwaanyị ọzọ nọ ọdụ n’ụgbọala ahụ. Anyị egbughị oge n’ọmụmụ ihe ahụ. Ma, o mere ka obi m pụọ n’ọdachi ahụ merenụ. Obi bịara ruo m ala. Ọmụmụ ihe ahụ mere ka m ghọta nke ọma na ọmụmụ ihe anyị na-abara anyị ezigbo uru.” E nwere ihe otu nwanna nwaanyị ọzọ kwuru banyere ọmụmụ ihe ha nwere n’oge ahụ ọdachi dakwasịchara ha. Ọ sịrị:  “Ọmụmụ ihe ndị ahụ nyeere m ezigbo aka idi ihe mere anyị.”—Rom 1:11, 12; 12:12.

Ọsọ Enyemaka Anyị Na-agbatara Ụmụnna Anyị Na-aba Ezigbo Uru

15, 16. (a) Olee uru Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt na ebe ndị ọzọ ritere n’ihi na ha gbataara ụmụnna ha ọsọ enyemaka? (b) Oleekwa uru ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị taa na-abara anyị?

15 Mgbe ahụ Pọl na-agwa Ndị Kọrịnt banyere ọsọ enyemaka Ndị Kraịst na-agbatara ibe ha, ọ kọwaara ha uru ma hanwa ma Ndị Kraịst ibe ha ga-erite ma ha na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka. Ọ gwara ha, sị: “Sitekwa n’ịrịọsi arịrịọ ike n’ihi unu, agụụ unu na-agụsi ha ike [ya bụ, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nọ na Jeruselem a gbataara ọsọ enyemaka,] n’ihi oké obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ nke dị n’ahụ́ unu.” (2 Kọr. 9:14) N’eziokwu, aka ụmụnna nọ na Kọrịnt nyeere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ga-eme ka ndị Juu a bụ́ Ndị Kraịst rịọ Jehova ka ọ gọzie ụmụnna ha a nọ na Kọrịnt, nakwa Ndị Kraịst bụ́ ndị mba ọzọ. Ọ ga-emekwa ka ndị Juu ahụ bụ́ Ndị Kraịst hụkwuo ha n’anya.

16 Ụlọ Nche Bekee nke December 1, 1945, kwuru uru ịgbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka na-abara anyị taa otú ahụ Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe ndị Chineke nọ n’otu ebe gbataara ụmụnna ha nọ ebe ọzọ ọsọ enyemaka, ọ na-eme ka ha dịrịkwuo n’otu.” Ụmụnna ndị na-aga agbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka achọpụtala na ihe a bụ eziokwu. Otu okenye so nyere ụmụnna ya aka mgbe idei mmiri mebisịrị ihe ha kwuru, sị: “Inyere ụmụnna m ndị a aka emeela ka mụ na ha dịrịkwuo ná mma.” Otu nwanna nwaanyị obi dị ụtọ n’ihi aka e nyeere ya mgbe ọdachi dakwasịrị ya kwuru, sị: “Ihe kacha mkpa anyị nwere ugbu a ruokwa mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs bụ ụmụnna anyị.”—Gụọ Ilu 17:17.

17. (a) Olee otú ihe e kwuru n’Aịzaya 41:13 si gbasa ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị? (b) Kọọ ihe ụfọdụ merenụ nke gosiri na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị na-eme ka e too Jehova, na-emekwa ka anyị dịrịkwuo n’otu. (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ụmụnna Si Mba Dị Iche Iche Agbatara Ụmụnna Ha Ọsọ Enyemaka.”)

 17 Mgbe ụmụnna anyị si ebe ọzọ bịa inyere ụmụnna ha ọdachi dakwasịrị aka, ụmụnna ndị a ọdachi dakwasịrị na-achọpụta na Chineke na-emezu nkwa o kwere anyị. Jehova sịrị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” (Aịza. 41:13) Otu nwanna nwaanyị ọdachi dakwasịrị kwuru, sị: “Mgbe ihe a mere, ọ dị m ka ụwa m ọ̀ gwụla. Ma, Jehova nyeere m ezigbo aka. Aka ụmụnna nyeere m riri m ọnụ.” Mgbe ala ọma jijiji kpachara mkpamkpa n’otu obodo, ndị okenye abụọ bi n’obodo ahụ degaara alaka ụlọ ọrụ ha akwụkwọ ozi n’aha ọgbakọ ha. Ha dere, sị: “Ala ọma jijiji a gbawara anyị obi, ma Jehova si n’aka ụmụnna anyị nyere anyị aka. Anyị agụọla banyere otú ụmụnna anyị si gbatara ibe ha ọsọ enyemaka n’oge ndị gara aga. Ma ugbu a, anyị ejirila anya anyị hụ ya.”

Ò nwere Otú I Nwere Ike Isi Nye Aka?

18. Ọ bụrụ na ị chọrọ i so gbatara ụmụnna anyị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, olee ihe ị ga-eme? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ O Mere Ka Ọ Mata Ihe O Kwesịrị Iji Ndụ Ya Mee.”)

18 Ị̀ ga-achọ inwe ụdị obi ụtọ ụmụnna gị na-enwe ma ha gbatara ibe ha ọsọ enyemaka? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, cheta na a na-esikarị n’ụmụnna na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahọrọ ndị ga-aga enyere ụmụnna ọdachi dakwasịrị aka. N’ihi ya, gwa ndị okenye unu ka ha nye gị fọm ị ga-edejupụta. Otu okenye garala ebe dị iche iche nyere ụmụnna ọdachi dakwasịrị aka kwuru, sị: “I kwesịghị ịga ebe ahụ ọdachi ahụ mere ma ọ bụrụ na Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka agwaghị gị gaa ebe ahụ.” Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị agaa ebe ahụ naanị mgbe a gwara ya gaa, ọ ga-eme ka ihe niile gaa siriri werere.

19. Olee otú ụmụnna anyị na-agbatara ibe ha ọsọ enyemaka si enye aka egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’eziokwu?

19 Kraịst nyere anyị iwu ka anyị ‘na-ahụrịta ibe anyị n’anya.’ Ọsọ enyemaka a anyị na-agbatara ụmụnna anyị bụ otu ụzọ magburu onwe ya anyị si na-eme ihe a Jizọs gwara anyị. Ọ bụrụ na anyị e si otú ahụ na-ahụrịta ibe anyị n’anya, anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’eziokwu. (Jọn 13:34, 35) Obi dị anyị ụtọ taa na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna anyị ndị na-ewepụta onwe ha na-agbatara ụmụnna ha ndị ji obi ha niile na-akwado Alaeze Chineke ọsọ enyemaka. Ọsọ enyemaka a ha na-agbatara ụmụnna ha na-eme ka a na-eto Jehova.

^ para. 3 Isiokwu a ga-eleba anya n’ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị. Ma, anyị na-enyekwara ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova aka.—Gal. 6:10.

^ para. 5 Pọl jikwa okwu Grik bụ́ di·aʹko·nia kọwaa “ndị ohu na-eje ozi.”—1 Tim.3:12.

^ para. 10 Gụọ ihe e dere n’isiokwu bụ́ “Inyere Ezinụlọ Anyị nke Ndị Kwere Ekwe na Bosnia Aka.” Isiokwu a gbara n’Ụlọ Nche November 1, 1994, peeji nke 23-27.