Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

 ISI NKE 16

Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova

Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU

Otú ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe si malite na uru ha na-abara anyị

1. Olee ihe nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka mgbe ha zukọtara? Oleekwa ihe mere e ji kwesị inyere ha aka?

OBERE oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ka ha gbaa ibe ha ume. Ha kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ha nọ akpọchi n’ihi na ha na-atụ ụjọ ndị iro ha. Ma, ha kwụsịrị ụjọ a ha na-atụ mgbe Jizọs batara ebe ahụ ha nọ ma gwa ha okwu. Ọ gwara ha, sị: “Natanụ mmụọ nsọ”! (Gụọ Jọn 20:19-22.) Ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara zukọtakwa ọnụ n’oge ọzọ, Jehova awụkwasị ha mmụọ nsọ. Mmụọ nsọ a ha natara nyere ha ike ha ga-eji na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 2:1-7.

2. (a) Olee otú Jehova si enye anyị ike? Oleekwa ihe mere ike ahụ ji dị anyị mkpa? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe Ofufe Ezinụlọ? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji nakwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Ofufe Ezinụlọ.”)

2 Anyị na-enwekwa ụdị nsogbu a ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere. (1 Pita 5:9) Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịtụ ụjọ mmadụ. Ma, Jehova na-enye anyị ike. Ike a ọ na-enye anyị na-eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu. (Efe. 6:10) Olee otú Jehova si enye anyị ike. Ọ na-ejikarị ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe enye anyị ike. E nwere ụzọ ọmụmụ ihe ise anyị na-enwe kwa izu. Ha bụ: Okwu Ihu Ọha, Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na Nzukọ Ije Ozi. * N’afọ ọ bụla, anyị na-echeta ọnwụ Jizọs, na-agakwa mgbakọ ukwu na mgbakọ sekit abụọ. Olee uru ihe ndị a niile na-abara anyị? Olee otú ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe n’oge a si malite? Ò nwere ihe otú anyị si were ịga ọmụmụ ihe ndị a na-ekwu gbasara anyị?

Gịnị Mere Anyị Ji Ezukọta Ọnụ?

3, 4. Gịnị ka Jehova gwara ndị ya ka ha na-eme? Ole ndị mere otú ahụ?

3 Kemgbe ụwa, Jehova na-agwa ndị ya ka ha na-ezukọ ọnụ efe ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova nyere mba Izrel Iwu. Otu n’ime ihe ndị iwu ahụ kwuru bụ na ha ga na-edebe Ụbọchị Izu Ike kwa izu ka ezinụlọ ọ bụla jiri ụbọchị ahụ dum fee Jehova ma mụọ Iwu ya. (Diut. 5:12; 6:4-9) Mgbe ụmụ Izrel mere ihe ndị a a gwara ha na-eme n’Ụbọchị Izu Ike, ezinụlọ ha na-adị n’otu, mba ahụ na Chineke adịrịkwuokwa ná mma. Ma ha nwaa anwaa ghara ịna-ezukọta ọnụ efe Jehova, ha na Chineke na-akwụsị ịdị ná mma.—Lev. 10:11; 26:31-35; 2 Ihe 36:20, 21.

4 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o jighị ọmụmụ ihe egwu egwu. Ọ na-aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu n’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla na-amụ Okwu  Chineke. (Luk 4:16) Mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya ka na-ezukọta amụ Okwu Chineke n’agbanyeghị na iwu ejighịzi ha idebe Ụbọchị Izu Ike. (Ọrụ 1:6, 12-14; 2:1-4; Rom 14:5; Kọl. 2:13, 14) Ọ na-abụ ha zukọọ, a kụziere ha ihe, gbaakwa ha ume. Ha na-ekpekwa ekpere, na-aza ajụjụ, ma na-abụ abụ. Ha si otú a too Chineke.—Kọl. 3:16; Hib. 13:15.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara ka ha gbaa ibe ha ume nakwa ka ha mee ka okwukwe ha sikwuo ike

5. Gịnị mere anyị ji aga ọmụmụ ihe kwa izu, na-agakwa mgbakọ dị iche iche kwa afọ? (Gụọkwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Mgbakọ Ndị Anyị Na-enwe Kwa Afọ Na-eme Ka Anyị Dịrị n’Otu.”)

5 Anyị na-emekwa ihe ndị ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mere. Anyị gaa ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe kwa izu, gaakwa mgbakọ dị iche iche ndị anyị na-enwe kwa afọ, anyị na-egosi na anyị na-akwado Alaeze Chineke. Chineke na-ejikwa mmụọ nsọ ya enye anyị ike. Anyị na-ekwukwa ihe ndị na-agba ụmụnna anyị ume. Ihe kacha mkpa anyị na-eme ma anyị zukọta ọnụ bụ ife Jehova. Otú anyị si eme ya bụ ikpe ekpere, ịza ajụjụ, na ịbụ abụ. Otú anyị si enwe ọmụmụ ihe anyị taa nwere ike ịdị iche n’otú ụmụ Izrel na Ndị Kraịst oge mbụ si nwee nke ha. Ma, ọmụmụ ihe anyị dị mkpa otú ahụ nke ha dịkwa n’oge ahụ. Olee otú ọmụmụ ihe anyị na-enwe n’oge a si bido?

Ọmụmụ Ihe Ndị Anyị Na-enwe Kwa Izu Na-agba Anyị Ume Igosi “Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ”

6, 7. (a) Gịnị mere anyị ji enwe ọmụmụ ihe? (b) Olee mgbe Ndị Mmụta Baịbụl nọ n’ebe dị iche iche na-enwe ọmụmụ ihe ha?

6 Mgbe Nwanna Charles Taze Russell bidoro ịmụ Okwu Chineke ka ọ mata nke bụ́ eziokwu, ọ ghọtara na ya na ndị ọzọ chọrọ ịmụta eziokwu kwesịrị ịna-ezukọta. Ọ bụ ya mere o ji dee ihe o dere n’afọ 1879. O dere, sị: “Mụ na ndị ọzọ nọ na Pitsbọg na-enwe klas anyị na-amụ Baịbụl. Anyị na-amụ ya na Sọnde ọ bụla.” A gbara ndị na-agụ Ụlọ Nche ume ka ha na-ezukọta. Ihe dị ka n’afọ 1881, ha bidoro ịna-enwe ọmụmụ ihe na Pitsbọg dị na Pensụlvenịa n’ụbọchị Sọnde na ụbọchị Wenezdee ọ bụla. Ụlọ Nche Bekee nke November afọ 1895 kwuru ihe mere e ji enwe  ọmụmụ ihe ndị ahụ. Ọ sịrị na ọ bụ ka “Ndị Kraịst nwee ike ịna-akpakọrịta, na-ekwurịta okwu, ma na-ahụ ibe ha n’anya.” O kwukwara na ọmụmụ ihe ndị ahụ ga-eme ka ndị bịara ha na-agbarịta ibe ha ume.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

7 Ruo ọtụtụ afọ, otú Ndị Mmụta Baịbụl e nwere n’otu ebe si enwe ọmụmụ ihe nakwa ugboro ole ha na-enwe ya na-adị iche n’otú Ndị Mmụta Baịbụl e nwere n’ebe ọzọ si enwe nke ha. Dị ka ihe atụ, e nwere akwụkwọ ozi otu ìgwè na-enwe ọmụmụ ihe n’Amerịka dere banyere ọmụmụ ihe ndị ha na-enwe. Akwụkwọ ozi a gbara n’Ụlọ Nche n’afọ 1911. Ha kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Ọ dịkarịa ala, anyị na-enwe ọmụmụ ihe ise kwa izu.” Ha na-enwe ọmụmụ ihe ndị ahụ na Mọnde, Wenezdee, Fraịdee, na-enwekwa abụọ na Sọnde. E nwekwara akwụkwọ ozi otu ìgwè na-enwe ọmụmụ ihe n’Afrịka dere. Akwụkwọ ozi a gbara n’Ụlọ Nche n’afọ 1914. Ha dere, sị: “Anyị na-enwe ọmụmụ ihe anyị malite na Fraịdee ruo na Sọnde. Anyị na-amụ ya otú ahụ ugboro abụọ n’ọnwa.” Ma, ka oge na-aga, anyị malitere inwe ọmụmụ ihe otú anyị si enwe ya ugbu a. Ka anyị lebatụ anya n’otú ọmụmụ ihe nke ọ bụla anyị na-enwe ugbu a si malite.

8. Gịnị bụ isiokwu ụfọdụ nke okwu ihu ọha ndị e kwuru n’oge ndị gara aga?

8 Okwu Ihu Ọha. N’afọ 1880, ya bụ, otu afọ Nwanna Russell bidoro ibipụta Ụlọ Nche, o mewere ihe Jizọs mere. Ọ malitere ịga n’obodo dị iche iche na-ezi ìgwè mmadụ ndị gbakọtaranụ ozi ọma. (Luk 4:43) Ọ bụ otú a Nwanna Russell si agwa ìgwè mmadụ okwu ka e si malite ikwu Okwu Ihu Ọha anyị na-ekwu taa. E nwere ihe e kwuru n’Ụlọ Nche banyere ozi ọma ahụ Nwanna Russell na-aga ezi ìgwè mmadụ n’ebe dị iche iche. E kwuru na obi ga-atọ Nwanna Russell ụtọ ịgwa ọhaneze okwu n’isiokwu bụ́ ‘Ihe ndị gbasara Alaeze Chineke.’ N’afọ 1911, mgbe e hiwechara klas ma ọ bụ ọgbakọ ná mba dị iche iche, a gbara klas nke ọ bụla ume ka ha zipụ ndị ọkà okwu n’obodo ndị dị ha nso ka ha gaa kwuo okwu ihu ọha isii. Ụfọdụ n’ime isiokwu ndị ha ga-ekwu gbasara ya bụ ‘Ikpe’ na ‘Ihe Mgbapụta.’ Ọ na-abụ e kwuchaa okwu nke ọ bụla, a maa ọkwa onye ga-ekwu nke izu na-abịa abịa nakwa isiokwu ya.

9. Olee ihe ndị a gbanwerela kemgbe e bidoro ikwu Okwu Ihu Ọha? Olee ihe ị ga-eme iji na-akwado ọmụmụ ihe a?

9 N’afọ 1945, a mara ọkwa n’Ụlọ Nche na a ga-amalite ikwu Okwu Ihu Ọha asatọ n’ọgbakọ niile. Okwu ihu ọha ndị ahụ ga-eleba anya n’otú a ga-esi elebara “nsogbu ndị e nwere n’oge ahụ anya ọsọ ọsọ.” Ụmụnna ndị na-aga ebe dị iche iche ekwu okwu ihu ọha na-eji isiokwu ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwadebere ekwu okwu ndị ahụ. Ha na-ejikwa isiokwu ndị ha ji aka ha kwadebe ekwu ha. Ha mere otú ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ma, ihe gbanwere malite n’afọ 1981. A gwara ndị niile na-ekwu okwu ihu ọha ka ha na-eji ihe ndepụta e ziteere ọgbakọ na-ekwu ya. * N’ihe ndepụta ụfọdụ, a na-enwe ebe a chọrọ ka ndị na-ege ntị tinye ọnụ mgbe a na-ekwu okwu ihu ọha. A na-emekwa ihe ngosi mgbe ụfọdụ. Ma a kwụsịrị ihe a niile n’afọ 1990. Site n’afọ ahụ gawa, ọ bụ onye na-ekwu okwu ihu ọha na-ekwu ihe niile.  E nwekwara ihe ọzọ a gbanwere na Jenụwarị afọ 2008. E gbubilatara nkeji ole e ji ekwu okwu ihu ọha. A na-ejibu nkeji iri anọ na ise ekwu okwu ihu ọha. Ma, si n’afọ ahụ gawa, ọ bụzi nkeji iri atọ ka e ji ekwu ya. N’agbanyeghị ihe ndị a niile a gbanwerela, okwu ihu ọha a kwadebere nke ọma ka na-eme ka anyị kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Ọ ka na-emekwa ka anyị mụta ọtụtụ ihe banyere Alaeze Chineke. (1 Tim. 4:13, 16) Ị̀ na-eji obi gị niile akpọ ndị ị na-agara nletaghachi na ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà Jehova ka ha bịa gere okwu ndị a dị mkpa a na-eji Baịbụl ekwu?

10-12. (a) Olee ihe ndị a gbanwerela n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche? (b) Olee ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya?

10 Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. N’afọ 1922, e nwere ndị a na-akpọ ndị pilgrim. Ha bụ ụmụnna nwoke ndị na-elekọta nzukọ a na-ezipụ ka ha gaa na-agwa ọgbakọ dị iche iche okwu ma na-edu ha aga ozi ọma. Ụmụnna ndị a tụụrụ ndị na-elekọta nzukọ a aro ka e nwee ụbọchị a ga-eji na-amụ Ụlọ Nche. Ndị na-elekọta nzukọ a nabatara aro a, ọgbakọ dị iche iche amalitezie na-amụ Ụlọ Nche n’etiti izu ma ọ bụkwanụ na Sọnde.

Ebe ụmụnna na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Gana n’afọ 1931

11 N’Ụlọ Nche Bekee nke June 15, afọ 1932, e kwuru otú a ga na-esi eduzi ọmụmụ ihe Ụlọ Nche. A ga na-eduzi ya otú e si eduzi nke Betel. Ọ bụ otu nwanna nwoke ga-eduzi ya. Ụmụnna nwoke atọ ndị ga na-agụpụta paragraf ndị dị na ya, ga na-anọ n’ihu oche. Ha ga na-agụ ya otu otu. N’oge ahụ, a naghị enwe ajụjụ n’isiokwu a na-amụ amụ. N’ihi ya, a gwara onye ga-eduzi ya ka ọ gwa ndị na-ege ntị ka ha jụọ ajụjụ ha chere a ga-aza n’Ụlọ Nche ahụ. Ha jụchaa, ya agwakwa ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ ndị ahụ. E kwukwara na nwanna na-eduzi Ụlọ Nche ga-akọwatụkwu ihe ọ bụla ndị zara ajụjụ ahụ na-akọwatachaghị. Ọ ga-akọwa ya ná nkenke.

12 Mgbe a malitere inwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ọ bụ ọgbakọ na-eji aka ha ekpebi Ụlọ Nche ha ga-amụ. Ọ na-abụ nke ọtụtụ  ndị chọrọ ka a mụọ ka a ga-amụ. Ma, n’Ụlọ Nche Bekee nke April 15, 1933, a gwara ọgbakọ niile ka ha na-amụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ. N’afọ 1937, a gwara ọgbakọ ọ bụla ka ha na-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ụbọchị Sọnde. Ọ bụ n’Ụlọ Nche Bekee nke October 1, 1942, ka e kwuru ka a malite ịmụ Ụlọ Nche otú anyị si amụ ya ugbu a. Ihe mbụ e kwuru n’Ụlọ Nche ahụ bụ na a ga na-enwe ajụjụ n’ala ala peeji isiokwu ndị a ga-amụ amụ, nakwa na ọ bụ ajụjụ ndị ahụ ka a ga-ajụ ma a mụwa ha. Ihe ọzọ e kwuru bụ na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwesịrị iwe naanị otu awa. A gwakwara ndị ga-aza ajụjụ ka ha ghara ịgụpụta ihe e dere na paragraf, kama, ka ha jiri “okwu nke aka ha” zaa ya. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ka bụ isi sekpụ ntị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ji na-akụziri anyị Okwu Chineke n’oge kwesịrị ekwesị. (Mat. 24:45) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-amụ Ụlọ Nche m amụ tupu a mụọ ya n’ọgbakọ? M̀ na-agbalị ka m zaa ajụjụ mgbe a na-amụ Ụlọ Nche?

13, 14. Olee otú Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ si malite? Oleekwa ihe ndị na-atọ gị ụtọ n’ọmụmụ ihe a?

13 Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. E nwere ihe otu Onye Mmụta Baịbụl aha ya bụ H. N. Rahn kwuru n’afọ 1895, mgbe e bipụtachara mpịakọta ụfọdụ nke akwụkwọ a na-akpọ Millennial Dawn. Onye Mmụta Baịbụl a bi n’obodo Baltimọre, dị na Meriland, n’Amerịka. O kwuru ka Ndị Mmụta Baịbụl nọ n’ebe dị iche iche na-ezukọta ọnụ amụ akwụkwọ anyị bụ́ Millennial Dawn. Ihe a na-akpọ ndị ahụ na-ezukọta ọnụ amụ akwụkwọ a mgbe ahụ bụ “Dawn Circles.” N’oge ahụ, ha na-enwe ọmụmụ ihe a ka a mara ma ọ̀ ga-enwekwa isi. Ọ bụkwa n’ụlọ ụmụnna ka ha na-anọkarị enwe ya. Ma, n’ihe dị ka na Septemba afọ 1895, e nweela ọtụtụ ebe n’Amerịka a nọ na-enwe ọmụmụ ihe a. N’ihi ya, e kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke September, 1895, ka Ndị Mmụta Baịbụl niile na-enwe ụdị ọmụmụ ihe a. Ụlọ Nche ahụ kwuru na onye ga na-eduzi ya ga-abụ onye na-agụ ihe nke ọma. Ọ ga-agụpụta otu ahịrịokwu ma chere ka ndị bịaranụ kwuo ihe ha ghọtara. Ya gụchaa otu paragraf, ya na ndị bịara ọmụmụ ihe ekwurịta ya, ya agụọ amaokwu Baịbụl ndị dị na paragraf ahụ. A mụchaa isiokwu nke ọ bụla, onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe ga-ekwu ihe ọ mụtara ná nkenke.

14 A gbanweela aha a na-akpọ ọmụmụ ihe a ọtụtụ ugboro. E mechara kpọwa ya Berean Circles for Bible Study (ya bụ, Ìgwè Ọmụmụ Baịbụl nke Ndị Beria). Ihe mere e ji kpọwa ya aha a bụ n’ihi otú ndị Beria si nyochaa Akwụkwọ nsọ nke ọma. (Ọrụ 17:11) Ka oge na-aga, e mechara kpọwa ya Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ihe anyị na-akpọ ya ugbu a bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. A naghịzi ezukọ n’ìgwè n’ìgwè enwe ya n’ụlọ ụmụnna. Kama, ọgbakọ ọ bụla na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha enwe ya. Kemgbe a malitere inwe ọmụmụ ihe a, e jirila akwụkwọ dị iche iche, broshọ dị iche iche, nakwa isiokwu dị iche iche e bipụtara n’Ụlọ Nche mụọ ihe na ya. Kemgbe e bidoro inwe ọmụmụ ihe a, a na-agba ndị na-abịa ya ume ka ha na-aza ajụjụ. Ọmụmụ ihe a  enyerela anyị aka ịmụtakwu Baịbụl. Ị̀ na-amụ ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe a tupu a mụwa ya n’ọgbakọ? Ị̀ na-agbalị ka ị̀ zaa ajụjụ mgbe a na-amụ ya?

15. Gịnị mere e ji malite ịna-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?

15 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Otu nwanna aha ya bụ Carey Barber kwuru ihe mere mgbe ọ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, nke dị na Niu Yọk. Ọ sịrị: “N’abalị Mọnde bụ́ abalị iri na isii n’ọnwa Febụwarị, afọ 1942, a gwara ụmụnna nwoke niile na-eje ozi na Betel dị na Bruklin ka ha deba aha ha n’ụlọ akwụkwọ e mechara kpọwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.” Nwanna Barber kwuru na ụlọ akwụkwọ a bụ “otu n’ime ihe ọma ndị kachanụ Jehova meere ndị ya n’oge anyị a.” Nwanna Barber mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Ụlọ akwụkwọ a nyeere ụmụnna nwoke aka ịna-akụzi ihe nke ọma, na-ezikwa ozi ọma nke ọma. Ọ bụ ya mere na n’afọ 1943, a malitere iji nwayọọ nwayọọ kesaara ọgbakọ niile akwụkwọ anyị a na-akpọ Course in Theocratic Ministry (ya bụ, Usoro Ihe Ọmụmụ  n’Ije Ozi Ọchịchị Chineke). Ụlọ Nche Bekee nke June 1, 1943, kwuru na a malitere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ka o nyere ndị Chineke aka ka ha “mụta otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma Alaeze Chineke nke ọma.”—2 Tim. 2:15.

16, 17. Ihe a na-akụziri anyị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ọ̀ bụ naanị otú e si ekwu okwu? Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

16 Ná mmalite, o siiri ọtụtụ ụmụnna ike ikwu okwu n’ihu ọha. E nwere otu nwanna nwoke kwuru ihe mere ya mgbe ọ batara ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943. Aha ya bụ Clayton Woodworth, Jr. Papa ya so n’ụmụnna ndị ahụ a tụrụ ha na Nwanna Rutherford mkpọrọ n’afọ 1918 n’enweghị ihe ha mere. Nwanna Woodworth kwuru, sị: “O siiri m ezigbo ike ime ihe omume n’ụlọ akwụkwọ a. Ọ na-abụ m na-ekwu okwu, ya adị ka ire ọ̀ na-anyị m arọ, asọ ataa m n’ọnụ, ya emee m ka m na-eti mkpu ma na-ekwu okwu ike ike.” Ma, mgbe nwanna a mụtakwuru otú e si ekwu okwu, o sozi ná ndị na-ekwu okwu ihu ọha n’ebe dị iche iche. Ọ bụghị naanị otú e si ekwu okwu ka ọ mụtara n’ụlọ akwụkwọ a. Ọ mụtakwara ịdị umeala n’obi  na ịna-atụkwasị Jehova obi. Nwanna Woodworth sịrị: “Ọ bịara doo m anya na onye na-ekwu okwu abụghị ya ka mkpa. Kama, ọ bụrụ na onye ahụ akwadebe okwu ya nke ọma ma tụkwasị Jehova obi, obi ga-atọ ndị ọ na-agwa okwu ụtọ, ha ga-amụtakwa ihe n’okwu ya.”

17 N’afọ 1959, a gwara ụmụnna nwaanyị ka ha deba aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Nwanna Nwaanyị Edna Bauer kwuru ihe mere mgbe a mara ọkwa a ná mgbakọ ha gara. Ọ sịrị: “M chetara otú ọkwa ahụ a mara si tọọ ụmụnna nwaanyị ụtọ. Ugbu a, ha nweziri ike ịna-eme ihe omume n’ụlọ akwụkwọ a.” Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, ì debala aha gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ka Jehova na-akụziri gị ihe?—Gụọ Aịzaya 54:13.

18, 19. (a) Olee ebe e sizi na-akụziri anyị otú e si ezi ozi ọma? (b) Gịnị mere anyị ji abụ abụ n’ọmụmụ ihe? (Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ, “ Iji Eziokwu Ndị Anyị Na-amụta Abụ Abụ.”)

18 Nzukọ Ije Ozi. Kemgbe afọ 1919, a na-enwe nzukọ maka ịhazi ozi ọma. N’oge ahụ, ọ bụghị ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ na-aga ya. Ọ bụ naanị ndị na-ekesa akwụkwọ anyị na-aga ya. N’afọ 1923, e nwere Nzukọ Ije Ozi otu ugboro n’ọnwa ruo ọtụtụ ọnwa. A gwakwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ka ha na-abịa ya. N’afọ 1928, a gwara ọgbakọ ọ bụla ka ha na-enwe Nzukọ Ije Ozi kwa izu. N’afọ 1935, e kwuru n’Ụlọ Nche ka ọgbakọ ọ bụla na-eji ihe e dere n’Ozi Alaeze Anyị na-enwe Nzukọ Ije Ozi. (Ihe a na-akpọ Ozi Alaeze Anyị n’oge ahụ bụ Director, e mechakwara kpọwa ya Informant). Ọgbakọ niile bidoziri nwewe Nzukọ Ije Ozi kwa izu.

19 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma tupu ya ezipụ ha ka ha kwusaa ozi ọma. A na-akụzikwara anyị ụdị ihe ahụ ná Nzukọ Ije Ozi. (Mat. 10:5-13) Ọ bụrụ na i so ná ndị a na-enye Ozi Alaeze Anyị, ị̀ na-amụ ya amụ? Ị mụchaa ya, ị̀ na-eme ihe ndị a na-agwa anyị ka anyị na-eme ma anyị gaa ozi ọma?

Ihe Kacha Mkpa Anyị Na-ezukọ Eme Kwa Afọ

Kemgbe oge ndịozi, Ndị Kraịst na-ezukọ otu ugboro n’afọ maka icheta ọnwụ Jizọs (A kọwara ya na paragraf nke 20)

20-22. (a) Gịnị mere anyị ji echeta ọnwụ Jizọs? (b) Olee uru icheta ọnwụ Jizọs kwa afọ na-abara gị?

20 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya ruo mgbe ya ga-abịa. Otú ahụ a na-eme Ememme Ngabiga otu ugboro n’afọ ka e sikwa echeta ọnwụ Kraịst otu ugboro n’afọ. (1 Kọr. 11:23-26) Ọtụtụ nde mmadụ na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. Ihe a anyị na-eme na-echetara ndị e tere mmanụ na ha na Jizọs ga-eso achị n’Alaeze ya. (Rom 8:17) Ọ na-emekwa ka ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-eji obi ha niile na-akwado Eze nke Alaeze Chineke.—Jọn 10:16.

21 Nwanna Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ ma na e kwesịrị ịna-echeta ọnwụ Jizọs. Ha makwa na e kwesịrị ịna-echeta ya naanị otu ugboro n’afọ. E kwuru n’Ụlọ Nche Bekee nke April, 1880, sị: “Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, ọtụtụ n’ime anyị nọ na Pitsbọg ebe a . . . na-echeta ọnwụ Jizọs, ma na-ata achịcha nke nọchiri anya ahụ́ Onyenwe anyị, na-aṅụkwa mmanya nke nọchiri anya ọbara ya.” Mgbe obere oge gachara, a malitere ịna-echeta ọnwụ Jizọs ma a gaa mgbakọ. Ọ bụ n’otu mgbakọ  e nwere n’afọ 1889 ka e bidoro idekọ mmadụ ole bịara mgbakọ. Ndị bịara mgbakọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri abụọ na ise. E mekwara mmadụ iri abụọ na abụọ baptizim.

22 Ncheta Ọnwụ Jizọs esozighị n’ihe anyị na-eme taa ma anyị gaa mgbakọ. Ma, anyị na-akpọ ndị anyị na ha bi n’otu obodo ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla anyị kwụrụ ụgwọ ịnọ mee ya. Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2013 karịrị nde mmadụ iri na itoolu. Ebe ọ bụ na abalị ahụ a na-echeta ọnwụ Jizọs bụ abalị dị nsọ, anyị kwesịrị ịga cheta ọnwụ Jizọs, kpọọkwa ndị ọzọ ka ha soro anyị. Ị̀ na-eji obi gị niile akpọ ọtụtụ mmadụ n’afọ ọ bụla ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

Gịnị Ka Ịga Ọmụmụ Ihe Na-egosi Gbasara Anyị?

23. Olee otú i si ele ịga ọmụmụ ihe anya?

23 Ndị ji obi ha niile na-efe Jehova anaghị ewere izukọta ọnụ efe ya dị ka ibu arọ. (Hib. 10:24, 25; 1 Jọn 5:3) Dị ka ihe atụ, obi tọrọ Eze Devid ụtọ ịga n’ụlọ Jehova na-efe ya. (Ọma 27:4) Obi na-akacha atọ ya ụtọ ma ya na ndị ọzọ hụrụ Chineke n’anya zukọọ na-efe Chineke. (Ọma 35:18) Onye ọzọkwa obi tọrọ ụtọ ịga n’ụlọ Chineke na-efe ya bụ Jizọs. Mgbe ọ ka dị obere, ọ gụsiri ya agụụ ike ịna-aga n’ụlọ Nna ya na-efe ya.—Luk 2:41-49.

Otú o si agụ onye ọ bụla n’ime anyị agụụ ịna-ezukọta ọnụ efe Chineke na-egosi ma ànyị kwetasiri ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị

24. Gịnị na gịnị ka anyị na-amụta ma anyị gaa ọmụmụ ihe?

24 Mgbe ọ bụla anyị gara ọmụmụ ihe, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya, na-egosikwa na anyị chọrọ ịgba ụmụnna anyị ume. Anyị na-egosikwa na anyị chọsiri ike ịmụta otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ka ụmụ amaala Alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ n’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ dị iche iche ka a na-akụziri anyị otú anyị ga na-esi eme ya. Ọ bụkwa n’ọmụmụ ihe ndị a ka anyị na-esi amụta otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị na-amụtakwa otú anyị ga-esi na-akụziri ndị ọzọ ihe ma na-enyekwara ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst. Ozi ọma a anyị na-ezi ndị mmadụ bụ ọrụ kacha mkpa Chineke ji Alaeze ya na-arụ ugbu a. (Gụọ Matiu 28:19, 20.) O doro anya na otú o si agụ onye ọ bụla n’ime anyị agụụ ịna-ezukọta ọnụ efe Chineke na-egosi ma ànyị kwetasiri ike na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ka anyị jiri ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe mgbe niile.

^ para. 2 E wezụga ịga ọmụmụ ihe kwa izu, a gwara ezinụlọ ọ bụla ka ha na-ewepụta otu mgbede ha ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ. A gwakwara ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ka ha na-ewepụta otu mgbede ha ga-eji na-amụ ihe.

^ para. 9 Tupu afọ 2013 agwụchaa, e wepụtala ihe ndepụta karịrị otu narị na iri asatọ e ji ekwu okwu ihu ọha.

GỤKWUO GBASARA YA

Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?

Leba anya n’otú ezinụlọ ụfọdụ si enwe ya ná mba dị iche iche ma mara ihe i nwere ike ime.