Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ

 AJỤJỤ NKE 6

Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?

Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na i merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị, ọ pụtara na ọ bụ gị na-ekpebi ihe ị chọrọ ime, ọ bụghị ndị ọzọ.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Obi wụbara Brian n’afọ ka ụmụ akwụkwọ ibe ya abụọ bịakwutere ya. N’izu a, ha agbalịala ugboro abụọ ime ka ọ ṅụọ sịga. Nke a bụ nke ugboro atọ.

nye nke mbụ sịrị ya:

“Ị̀ nọrọkwala naanị gị? O nwere ezigbo ihe m chọrọ inye gị.”

Ya elee Brian anya, manye aka n’akpa wepụta ihe, matịa aka ka o nye ya Brian.

Brian hụrụ sịga n’aka ya. Obi awụbakwuo ya n’afọ.

Brian asị ya, “Ewela iwe. M gwala gị na anaghị m aṅụ sịga.”

Onye nke abụọ anapụ ya okwu n’ọnụ, sị: “Ụjọ atụla gị.”

Brian katara obi sị ya, “Abụghị m onye ụjọ.”

Onye nke abụọ konyere Brian aka n’olu, wetuo olu sị ya, “Ṅụtụnụ.”

Onye nke mbụ achọọ itinye ya sịga ahụ n’ọnụ ma wetuo olu sị ya, “Anyị agaghị agwa onye ọ bụla. O nweghị onye ga-ama.”

Ọ bụrụ na ị bụ Brian, gịnị ka ị ga-eme?

 CHEGODỊ ECHICHE

Ụmụaka a na-enye Brian nsogbu hà echebarala ihe a ha na-eme echiche? Hà ji aka ha kpebie ihe ha ga na-eme? Ọ dị ka ha emebeghị otú ahụ. O nwere ike ịbụ na ha na-eme ihe ndị ọzọ gwara ha mee. Ha chọrọ ka ndị ọzọ lewe ha anya ọma. Ọ bụ ya mere ha ji eme ihe ndị ọzọ gwara ha.

E mee gị ụdị ihe a, olee otú ị ga-esi mee ihe dị́ mma ma merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị?

  1. MATA IHE NWERE IKE IME

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.

    Ọtụtụ mgbe, i nwere ike ịmata nsogbu na-abịanụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị hụrụ ebe ụmụ akwụkwọ ibe gị nọ na-aṅụ sịga. Ọ bụrụ na ị mata ihe nwere ike ime, ị ga-adị njikere ime ihe i kwesịrị ime.

  2. CHEE ECHICHE

    Baịbụl kwuru, sị: “Nweenụ ezi akọ na uche.”1 Pita 3:16.

    Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ esoro ndị ọzọ mee ihe a, olee otú obi ga-emecha dị m?’ O nwere ike ime ka ụmụaka ibe gị lewe gị anya ọma mgbe ahụ. Ma, olee otú obi ga-adị gị ma e mechaa? Ị̀ dị njikere ịhapụ ime ihe i kweere naanị ka i mee ka obi dị́ ụmụ klas unu mma?Ọpụpụ 23:2.

  3. KPEBIE IHE Ị GA-EME

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”Ilu 14:15.

    Mee elu mee ala, ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme ma jiri isi anyị buru ihe sí na ya pụta. Baịbụl kwuru na Josef, Job, na Jizọs mere ihe dị́ mma. O kwukwara na Ken, Isọ, na Judas mere ihe na-adịghị mma. Gịnị ka gịnwa ga-eme?

Baịbụl kwuru, sị: ‘Kwesị ntụkwasị obi.’ (Abụ Ọma 37:3) Ọ bụrụ na i cheela ihe ga-esi na ya pụta, kpebiekwa ihe ị ga-eme, ikwu ihe i kpebiri ime ga-adịrị gị mfe, baakwara gị uru.

Enyela onwe gị nsogbu. Ọ bụghị ihe ị ga-ekwuwe ogologo okwu. Naanị ịsị MBA ma kwụsie ike na ya ezuola. Ma ọ bụ, ị chọọ ikwu ihe i kpebiri hoo haa, i nwere ike sị:

  • “Agaghị m eso.”

  • “Anaghị m eme ụdị ihe ahụ.”

  • “I kwesịrị ịma na agaghị m eme ya.”

Ihe dị́ mkpa bụ ikwu okwu ozugbo n’amaghị ọnụ jijiji. I mee otú ahụ, o nwere ike iju gị anya na ndị ọgbọ gị ga-akwụsị inye gị nsogbu.

 IHE Ị GA-EME MA A CHỊWA GỊ ỌCHỊ

Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ọgbọ gị gwara gị mee, ị ga-adị ka robọt a na-agwa ihe ọ ga-eme

Ọ bụrụkwanụ na ndị ọgbọ gị achịwa gị ọchị? Ọ bụrụ na ha asị, “Gịnịdị na-eme gị, ị̀ bụ onye ụjọ?” Mata na ihe mere ha ji achị gị ọchị bụ na ha chọrọ ka i mee ihe ha kwuru. Gịnị ka i nwere ike ime? Ọ dịkarịa ala, e nwere ihe abụọ i nwere ike ime.

  • I nwere ike ikweta ihe ha kwuru. (“Ekwela m. Abụ m onye ụjọ.” Kwuzie ihe mere i ji jụ.)

  • I nwere ike ịgwa ha ihe ga-emetụ ha n’ahụ́. Gwa ha ihe mere i ji jụ, ma kwuo ihe ga-eme ka ha chee echiche. (“Echere m na unu ma ihe, unu ana-aṅụ sịga.”)

Ọ bụrụ na ha akwụsịghị ịchị gị ọchị, si ebe ahụ pụọ. Mara na ị nọrọ ebe ahụ, ha ga-enyekwu gị nsogbu. Ọ bụrụ na i si ebe ahụ pụọ, ọ pụtara na i kweghị ka ndị ọgbọ gị mee ka i mee ihe ha chọrọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaghị emeli ka ndị ọgbọ gị ghara inye gị nsogbu. Ma, i nwere ike ikpebi ihe ị chọrọ ime, gwa ha ihe i kpebiri ime, ma kwụsie ike na ya. Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme.Jọshụa 24:15.