Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ

 AJỤJỤ NKE 4

Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?

Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na ị na-ekweta ihe i mejọrọ, ndị mmadụ ga na-akwanyekwuru gị ùgwù, na-atụkwasịkwu gị obi.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Tim na ndị enyi ya nọ na-egwu egwu, ya atụọ bọl, bọl ahụ agaa kụwaa enyo dị́ n’ụgbọala onye agbata obi ha.

Ọ bụrụ na ị bụ Tim, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

E NWERE IHE ATỌ I NWERE IKE IME:

  1. A. Ịgba ọsọ.

  2. B. Ikwu na ọ bụ onye ọzọ kụwara ya.

  3. CH. Ịgwa onye ahụ ihe merenụ, gwakwa ya na ị ga-akwụ ụgwọ ya.

Obi gị nwere ike ịgwa gị ka ị họrọ Nke A. Ma e nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji kweta ihe i mejọrọ, ma ị̀ kụwara enyo dị́ n’ụgbọala ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.

 IHE ATỌ MERE Ị GA-EJI KWETA IHE I MEJỌRỌ

  1. Ọ bụ ihe i kwesịrị ime.

    Baịbụl kwuru, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”Ndị Hibru 13:18.

  2. Mmadụ kweta ihe o mejọrọ, o nwere ike ime ka a gbaghara ya.

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.”Ilu 28:13.

  3. Nke ka nke, ọ na-eme Chineke obi ụtọ.

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”Ilu 3:32.

N’Amerịka, otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Karina bu ụgbọala gbaa ọnwụ ọnwụ, ndị gọọmenti erie ya iwu, ya ezochiere ya papa ya. Ma, o zochilighị ya ruo mgbe ebighị ebi. Karina kwuru, sị: “Mgbe ihe dị́ ka otu afọ gara, papa m hụrụ akwụkwọ e ji rie m iwu e dere aha m na ya. Abara m n’ezigbo nsogbu.”

Gịnị ka ihe a na-akụziri gị? Karina sịrị: “Izochi ihe i mejọrọ ga-eme ka ihe ka njọ. Ị ga-emecha taa ahụhụ ya.”

OTÚ Ị GA-ESI MỤTA IHE N’IHE NDỊ I MEJỌRỌ

Baịbụl kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ikweta ihe i mejọrọ ga-egosi na ị dị umeala n’obi nakwa na ị ghọọla dimkpa, nke ka nke, ma i kweta ozugbo.

Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịmụta ihe n’ihe ndị i mejọrọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vera sịrị: “M na-agba mbọ ịmụta ihe n’ihe ọ bụla m mejọrọ. Ọ na-enyere m aka ịghọkwu ezigbo mmadụ. M na-amata ihe m kwesịrị ime mgbe ọzọ.” Ka anyị chọpụta otú ị ga-esi eme ya.

Ka e were ya na papa gị bunyere gị ọgba tum tum ya, gị emebie ya. Gịnị ka ị ga-eme?

  • Gbachi nkịtị ma kpewe ekpere ka papa gị ghara ịmata.

  • Gwa papa gị ihe merenụ.

  • Gwa papa gị ihe merenụ ma kwuo na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.

Ka e were ya na ị dara ule n’ihi na ị gụghị akwụkwọ. Gịnị ka ị ga-eme?

  • Ikwu na ule ahụ siri ike.

  • Ikweta na ọ bụ gị mere onwe gị.

  • Ikwu na onye nkụzi kpọrọ gị asị.

Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị banyere ihe i mejọrọ n’oge gara aga, o yiri ebe onye na-anya ụgbọala legidere anya n’enyo o ji ahụ ihe dị́ n’azụ

 Chegodị banyere ihe atụ ndị ahụ anyị nyeburu. Were ya na ị bụ (1) papa gị na (2) onye nkụzi unu. Olee otú papa gị na onye nkụzi unu ga-esi ele gị anya ma i kweta ihe i mejọrọ ozugbo? Olee otú ha ga-esi ele gị anya ma i zochie ihe i mejọrọ?

Chebara ihe ndị i mejọrọ n’afọ gara aga echiche ma zaa ajụjụ ndị a.

Gịnị bụ ihe ahụ i mejọrọ? Olee ihe i mere banyere ya?

  • M zochiri ya.

  • M kwuru na ọ bụ onye ọzọ kpatara ya.

  • M kwetara ozugbo na ọ bụ m mere ya.

Ọ bụrụ na i kwetaghị ihe i mejọrọ, olee otú obi mechara dị́ gị?

  • Obi dị m ụtọ maka na o nweghị onye matara ihe m mere.

  • Obi nọ na-apịa m ụtarị. M gaara ekwu eziokwu.

Olee ihe ka mma ị gaara eme?

Gịnị ka ị mụtara n’ihe ahụ i mejọrọ?

GỊNỊ KA I CHERE?

Gịnị mere ụfọdụ ndị anaghị ekweta ihe ha mejọrọ?

Olee otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ezochikarị ihe i mejọrọ? Ma, olee otú ha ga-esi na-ele gị anya ma ị na-ekweta ihe i mejọrọ?Luk 16:10.