Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ

 AJỤJỤ NKE 8

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Idina Mmadụ n’Ike?

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Idina Mmadụ n’Ike?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

N’afọ ọ bụla, a na-edina ọtụtụ nde mmadụ n’ike ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ metọọ ha. Ndị a kacha eme ya bụ ndị na-eto eto.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Otu nwoke jidere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Annette. Tupu ya amata ihe na-eme, nwoke ahụ tụrụ ya n’ala. Annette kwuru, sị: “M mere ihe niile nwere ike ime ka ọ hapụ m. M gbalịrị iti mkpu, ma e nweghị ike ịnụ olu m. M kwara ya aka, gbaa ya ụkwụ, suo ya aka, gaakwa ya mbọ. Mgbe ahụ ka ọ mara m mma. Ike agwụ m.”

Ọ bụrụ na ị bụ Annette, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Ihe ọjọọ nwere ike ime n’agbanyeghị otú i si kwadebe ma ọ bụ kpachapụ anya mgbe ị na-aga n’abalị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”Ekliziastis 9:11.

Ndị na-achọ idina ụfọdụ ndị na-eto eto n’ike bụ ndị ha na-amaghị, otú ahụ e mere Annette. E nwekwara ndị onye na-achọ idina ha bụ onye ha ma ama ma ọ bụ onye ezinụlọ ha. Otu nwata nwaanyị aha ya bụ Natalie dị naanị afọ iri mgbe otu nwa okorobịa bí n’akụkụ ụlọ ha dinara ya n’ike. Natalie kwuru, sị: “Ezigbo ụjọ na ihere ekweghị m kọọrọ ya onye ọ bụla ozugbo ahụ.”

 E KWESỊGHỊ ỊTA GỊ ỤTA

Obi Annette ka na-ama ya ikpe n’ihi ihe e mere ya. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m nọrọ, mụ ana-eche ihe ahụ mere n’abalị ụbọchị ahụ. Obi m na-agwa m na m gaara agbasikwu mbọ ike ka ọ hapụ m. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ọ mara m mma, egwu ekweghị m mee ihe ọ bụla. Ike adịghịzi m ime ihe ọ bụla, ma ọ dị m ka m̀ gaara agbalịkwu.”

Obi Natalie ka na-amakwa ya ikpe. O kwuru, sị: “Agaraghị m atụkwasị onye ahụ obi. Papa m na mama m nyere mụ na nwanne m nwaanyị iwu ka anyị na-anọkọ ọnụ mgbe ọ bụla anyị na-egwu egwu n’èzí, ma egeghị m ntị. Ọ bụ ya mere o ji adị m ka ọ̀ bụ m nyere onye agbata obi anyị ohere idina m n’ike. Ihe ahụ merenụ gbawara ndị ezinụlọ anyị obi. Obi na-ama m ikpe na ọ bụ m kpatara ya. Ọ bụ ya kacha enye m nsogbu n’obi.”

Ọ bụrụ na obi na-ama gị ikpe otú ahụ ọ na-ama Annette ma ọ bụ Natalie, ihe mbụ ị ga-eburu n’obi bụ na e dinaa mmadụ n’ike, a manyere ya amanye. Ụfọdụ na-ekwu na o nweghị ihe o mere, na ọ bụ ihe ụmụ okorobịa na-emekarị, ma ọ bụkwanụ na ndị e dinara n’ike chọrọ ka e dinaa ha. Ma, o nweghị onye e kwesịrị idina n’ike. Ọ bụrụ na e mere gị ụdị ihe a jọgburu onwe ya, e kwesịghị ịta gị ụta.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mfe ịgụ na “e kwesịghị ịta gị ụta,” ma ikweta ya nwere ike isi ezigbo ike. Ụfọdụ na-eburu ihe mere ha n’obi, obi ana-ama ha ikpe ma ọ bụ na-ajọ ha njọ. Ma, ị gbachi nkịtị, ònye ka ọ ga-abara uru? Ọ̀ bụ gị, ka ọ̀ bụ onye dinara gị n’ike? Kama ịgbachi nkịtị, i kwesịrị ịkọrọ ya onye ọzọ.

ỊKỌRỌ MMADỤ IHE E MERE GỊ

Baịbụl gwara anyị na mgbe Job bụ́ onye ezi omume hụrụ na nsogbu ya esiela ezigbo ike, ọ sịrị: “M ga-ekwu okwu dị ka o si ewute mkpụrụ obi m!” (Job 10:1) Ọ ga-abara gị uru ma i mee otú ahụ. Ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi ihe merenụ nwere ike inyere gị aka idi ihe e mere gị, meekwa ka obi ruo gị ala.

Otú obi si ajọ gị njọ nwere ike ịdị gị ka ibu dị́ arọ naanị gị na-agaghị ebuli. Ọ ga-adị mma ka ị kọọrọ ya onye ga-enyere gị aka

Annette chọpụtara na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “M kọọrọ ya otu ezigbo enyi m nwaanyị, ya agwa m ka m kọọrọ ya ndị okenye ọgbakọ anyị. Obi dị m ụtọ na m mere otú ahụ. Mụ na ha nọkọrọ ọtụtụ ugboro, ha agwa m ihe m kwesịrị ịnụ. Ha gwara m na ihe ahụ merenụ esighị m n’aka, na o nweghị ihe ọjọọ m mere.”

Natalie gwara papa ya na mama ya na e dinara ya n’ike. Ọ sịrị: “Ha nyeere m aka. Ha gwara m ka m kọọrọ ha otú o si mee. Ihe ahụ m kọọrọ ha mere ka iwe m dajụwa, obi adịtụwa m mma.”

Ekpere bụ ihe ọzọ kasiri Natalie obi. Ọ sịrị: “Ịkọrọ ya Chineke nyeere m aka, nke ka nke, n’oge ahụ m na-achọghị ịkọrọ ya mmadụ. M kpewe ekpere, m na-ekwu otú ọ dị m n’obi. Ọ na-eme ka obi ruo m ala.”

Gịnwa nwekwara ike ịchọpụta na ka oge na-aga, obi agaghịzi na-ama gị ikpe. (Ekliziastis 3:3) Na-elekọta onwe gị. Echekwala ihe ga-eme ka obi na-ajọ gị njọ. Na-ehi ụra nke ọma. Ihe kacha mkpa bụ ịtụkwasị Jehova, bụ́ Chineke nkasi obi niile, obi.2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

 Ọ BỤRỤ NA I TORUOLA KA GỊ NA NWOKE KPAWA

Ọ bụrụ na ị bụ nwa agbọghọ, ya abụrụ na mmadụ na-enye gị nsogbu ka i mee omume rụrụ arụ, ọ dịghị njọ ma i kwusie okwu ike, sị, “Kwụsị ya!” ma ọ bụ, “Wepụ aka gị n’ahụ́ m!” Agbachila nkịtị n’ihi ịtụ ụjọ na nwa okorobịa gị na ya na-akpa ga-ahapụ gị. Ọ hapụ gị n’ihi ya, ọ pụtara na ọ bụghị onye gị na ya kwesịrị ịna-akpa. Onye gị na ya na-akpa kwesịrị ịbụ ezigbo mmadụ, onye ga na-akwanyere ahụ́ gị na ihe i kweere ùgwù.

AJỤJỤ GBASARA EGWUREGWU IBERIIBE

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Coretta sịrị: “Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ụmụ okorobịa na-esi n’azụ dọtụ uwe ara m aka, kwuwe ihe na-enweghị isi na ọdụ. Ha na-asị na obi ga-aka adị m mma ma mụ na ha nwee mmekọahụ.”

Gịnị ka i chere ụmụ okorobịa ndị ahụ na-eme Coretta?

  1. A. Hà na-egwusa ya egwuregwu nkịtị?

  2. B. Hà na-achụ ya?

  3. CH. Hà na-egwusa ya egwuregwu iberiibe?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Candice sịrị: “Mgbe m nọ n’ụgbọala, otu nwa okorobịa malitere ịgwa m okwu iberiibe ma jide m aka. M kụpụrụ aka ya, sị ya si n’ebe m nọ pụọ. Ya elewe m ka isi ò mebiri m.”

Gịnị ka i chere nwa okorobịa a na-eme Candice?

  1. A. Ọ̀ na-egwusa ya egwuregwu nkịtị?

  2. B. Ọ̀ na-achụ ya?

  3. CH. Ọ̀ na-egwusa ya egwuregwu iberiibe?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Bethany sịrị: “N’afọ gara aga, otu nwa okorobịa nọ na-agwa m na ọ hụrụ m n’anya, na ọ chọrọ ka mụ na ya na-akpa n’agbanyeghị na m na-asị ya mba. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adịda m aka n’aka, mụ asị ya kwụsị ya, ma ọ naghị ekwe. Otu ụbọchị m nọ na-ekezi eriri akpụkpọ ụkwụ m, ọ bịara kụọ m aka n’ikè.”

Gịnị ka i chere nwa okorobịa a na-eme?

  1. A. Ọ̀ na-egwusa ya egwuregwu nkịtị?

  2. B. Ọ̀ na-achụ ya?

  3. CH. Ọ̀ na-egwusa ya egwuregwu iberiibe?

Azịza ajụjụ atọ a bụ CH.

Olee ihe dị iche n’igwusa mmadụ egwuregwu iberiibe na ịchụ onye ahụ ma ọ bụ igwusa ya egwuregwu nkịtị?

Ọ bụ naanị onye na-egwusa mmadụ egwuregwu iberiibe ka ihe ahụ ọ na-eme na-atọ ụtọ. Onye ọ na-egwusa ya sịgodị ya kwụsị ya, ọ naghị akwụsị.

Egwuregwu iberiibe abụghị obere okwu. Onye na-egwusa mmadụ egwuregwu iberiibe nwere ike idina onye ahụ n’ike.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwusawa M Egwuregwu Iberiibe?

Chọpụta ihe bụ́ egwuregwu iberiibe na ihe ị ga-eme ma e gwusawa gị ya.