Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

Tigbuo Zọgbuo Ndị Kọmunist Kpatara Ataghị Isi M

Ronald Jacka

Tigbuo Zọgbuo Ndị Kọmunist Kpatara Ataghị Isi M
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1928

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1941

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụ ohu alaka ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na ise.

N’ISI ỤTỤTỤ abalị mbụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1965, ndị agha na-akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị kọmunist nke Indoneshia gburu ndị isi amị isii a ma ama ná mbọ ha na-agba ịkwatu ọchịchị. Ihe a ha mere mere ka gọọmenti malite ịsụ ndị kọmunist akwụ ozugbo. Ọgba aghara bịara ju ebe niile n’Indoneshia. E gbukwara narị puku mmadụ ise a sịrị bụ́ ndị kọmunist.

Mgbe mbọ ahụ a gbara ịkwatu ọchịchị Indoneshia kụchara afọ n’ala, izu ole na ole agaakwa, otu onyeisi ndị amị gwara m na aha m dị n’ebe e dere aha ndị isi okpukpe ndị kọmunist chọrọ igbu n’ógbè anyị. Ọ gwakwara m na m chọọ, ya agaa gosi m ebe ha gwuru ili m. Ma, m ji nwayọọ gwa ya na mụ achọghị ịga hụ ili ahụ. N’ihi otú ihe si kwụrụ n’oge ahụ, achọghị m ka a hụ mụ na ya n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ chewe na m na-etinyezi aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.