Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

Mgbe Ndị Agha Japan Weghaara Indoneshia

Mgbe Ndị Agha Japan Weghaara Indoneshia

Ná mmalite afọ 1942, ndị agha Japan weghaara Indoneshia ma na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Ha manyere ọtụtụ ụmụnna anyị ka ha na-arụ ụzọ ma ọ bụ na-agwọ gọta. Ha tụrụ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ ruru ezigbo unyi ma mekpọọ ha ọnụ n’ihi na ha jụrụ ịkwado agha. Ọ dịkarịa ala, ụmụnna anyị nwoke atọ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ.

Nwanna Nwaanyị Johanna Harp, ụmụ ya nwaanyị abụọ, na enyi ha aha ya bụ Beth Godenze (ọ bụ ya nọ n’etiti)

E nwere otu nwanna nwaanyị onye Nedalandz aha ya bụ Johanna Harp. O bi n’ime ime obodo dị́ n’ugwu, dị́ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Java. N’afọ abụọ a malitere ịlụ agha, e jidelighị ya tụọ ya mkpọrọ. Ya na ụmụ ya ndị na-eto eto ji ohere ahụ sụgharịa akwụkwọ anyị a na-akpọ Salvation (Nzọpụta)  nakwa Ụlọ Nche. Ha si n’asụsụ Bekee sụgharịa ha n’asụsụ Dọch. * Ha depụtaghachiri akwụkwọ ndị ahụ ha sụgharịrị ma zoro ezoro kesaara ha Ndịàmà Jehova nọ n’ebe niile na Java.

Ndịàmà Jehova ole na ole a na-ejidebeghị na-adị ole na ole amụ ihe n’ụlọ ụmụnna. Ha na-ejikwa akọ ezi ozi ọma. Nwanna Nwaanyị Josephine Elias (onye a na-akpọbu Tan) kwuru, sị: “M na-adị njikere iji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ozi ọma. M na-ebu bọọdụ e ji eti epele aga na nke ndị nwere mmasị ka ndị hụrụ m chee na m bịara ka mụ na ha tie epele.” Nwanna Felix Tan na nwunye ya Bola na-eme ka hà na-ere ncha ma ha na-aga n’ụlọ n’ụlọ ezi ndị mmadụ ozi ọma. Nwanna Felix kwuru, sị: “Ndị na-agbara ndị agha Japan a na-eze eze àmà na-esogharị anyị. A na-akpọ ndị agha ahụ ndị Kempeitai. Ihe anyị na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bụ ozi ọma ka anyị na-abịa ezi bụ na anyị na-abịa na nke ndị anyị na-amụrụ Baịbụl n’oge ndị dịgasị iche iche. Mmadụ isii n’ime ha mere nnọọ nke ọma nke na e mere ha baptizim n’oge agha ahụ.”

Ụmụnna Anyị Nọ́ na Jakata Aghọtahie Ụmụnna Ha

Ka ụmụnna anyị ji nwayọọ na-edi nsogbu agha kpatara, nsogbu ọzọ bịaara ha. Ndị ọchịchị Japan gwara ndị mbịarambịa niile (nakwa ndị Chaịna a mụrụ n’Indoneshia) ka ha deba aha ha n’akwụkwọ nakwa ka ha na-eji kaadị gosiri na ha ṅụrụ iyi ịna-akwado ọchịchị Japan. Ọtụtụ ụmụnna anyị nọ na-eche, sị, ‘Ànyị kwesịrị ideba aha anyị n’akwụkwọ ma bịanye aka na kaadị ahụ ka ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị?’

Nwanna Nwaanyị Josephine Elias na nwanne ya nwoke Felix

Nwanna Felix kwuru, sị: “Ụmụnna anyị nọ́ na Jakata gwara anyịnwa nọ na Sukabumi ka anyị ghara ịbịanye aka na kaadị ahụ. Ma, anyị jụrụ ndị ọchịchị ma hà ga-ekwe ka anyị gbanwee ihe e dere na kaadị ahụ. Ihe e dere na ya bụ, ‘Onye a bịanyere aka na kaadị a aṅụọla iyi na ya ga na-akwado ndị agha Japan.’ Ma, anyị chọrọ ka ọ bụrụ, ‘Onye a  bịanyere aka na kaadị a kwetara na ya agaghị emegide ndị agha Japan.’ Ọ tụrụ anyị n’anya na ha kwetara. N’ihi ya, anyị niile bịanyere aka ma nweta kaadị ahụ. Mgbe ụmụnna anyị nọ na Jakata nụrụ ihe anyị mere, ha sịrị na anyị adapụla n’ọgbakọ. Ha kwụsịkwara iso anyị na-emekọ ihe.”

E mechara nwụchie ọtụtụ ụmụnna anyị nọ na Jakata, bụ́ ndị ahụ na-ekweghị enweta kaadị ahụ. Ọ dịkwa mwute na ọtụtụ n’ime ha kwuru na ha abụghịzi Ndịàmà Jehova. A tụrụ otu nwanna na-ekweghị agọnahụ Jehova mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ Nwanna André Elias nọ na ya. Nwanna André kwuru, sị: “M gwara ya banyere ihe ahụ ụmụnna anyị nọ na Jakata mere ma nyere ya aka ile okwu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. O medara obi rịọ ka a gbaghara ha maka ịkpapụ anyị iche. Mụ na ya jikwa ohere ahụ mee ka okwukwe ibe anyị sikwuo ike. Ma, ọ dị mwute na ọ nwụrụ n’ihi otú ebe ahụ a tụrụ anyị mkpọrọ si jọgbuo onwe ya.”

Merdeka!

Mgbe agha biri n’afọ 1945, ọ na-agụsi ụmụnna anyị agụụ ike ịna-ekwusasi ozi ọma ike. Otu nwanna a tụburu mkpọrọ ma mekpọọ ọnụ degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia  akwụkwọ, sị: “Ọ ka na-anụ m ọkụ n’obi ikwusa ozi ọma otú ahụ ọ na-anụ m tupu afọ anọ a gara aga e mekpọrọ anyị ọnụ. M ka kwụ chịm n’okwukwe m. N’oge niile m nọ ná nsogbu, echefughị m ụmụnna anyị. Biko, ziterenụ m akwụkwọ anyị ụfọdụ.”

E ziteere ụmụnna anyị akwụkwọ ha nọ na-atụ anya ya kemgbe. E bu ụzọ zitere ha obere, mechaa zitere ha ọtụtụ. Ndị nkwusa iri e nwere na Jakata bidoghachiri ịsụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Indoneshian.

N’abalị iri na asaa n’ọnwa Ọgọst afọ 1945, ndị isi òtù na-agba mbọ ka Indoneshia chịwa onwe ya mara ọkwa na Indoneshia enwerela onwe ya. Nke a kpatara tigbuo zọgbuo n’Indoneshia n’ihi na ndị Indoneshia achọzighị ka ndị Nedalandz na-achị ha. Ọtụtụ iri puku mmadụ nwụrụ n’ọgba aghara a, ihe karịrị nde mmadụ asaa gbakwara ọsọ ndụ.

N’oge niile a e nwere ọgba aghara n’Indoneshia, ụmụnna anyị akwụsịghị ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Nwanna Nwaanyị Josephine Elias kwuru, sị: “Ndị bú ọgba aghara ahụ n’isi gbalịrị ime ka anyị na-eti ‘Merdeka,’ nke pụtara ‘Nnwere onwe.’ Ma, anyị gwara ha na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.” N’afọ 1949, ndị Nedalandz nyefere ndị Indoneshia ha na-achị kemgbe ọchịchị, ha achịwazie onwe ha. *

Mgbe ọ na-erula afọ 1950, ụmụnna anyị nọ n’Indoneshia ediela ọgba aghara ahụ ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri. Ma, ha ka nwere nnukwu ọrụ ha ga-arụ. Olee otú ha ga-esi zie ọtụtụ nde mmadụ bi n’Indoneshia ozi ọma? E lee ya anya otú mmadụ si ele ihe anya, ọ gaghị ekwe omume. Ma, ụmụnna anyị ji okwukwe na-ekwusa ozi ọma, tụkwasị Jehova obi na ‘ọ ga-eziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.’ (Mat. 9:38) Jehova mekwara otú ahụ.

^ para. 2 Nwa nwaanyị nke ikpeazụ Nwanna Nwaanyị Harp mụrụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied mgbe a lụchara agha. Mgbe ọ gụchara, ọ laghachiri Indoneshia bụrụ onye ozi ala ọzọ. Aha ya bụ Hermine (Mimi).

^ para. 3 Ndị Nedalandz nọgidere na-achị Ebe Ọdịda Anyanwụ Papụa ruo n’afọ 1962. Ihe a na-akpọbu Ebe Ọdịda Anyanwụ Papụa bụ Ebe Ọdịda Anyanwụ Niu Gini.