Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

E Kwusaa Ozi Ọma Ruo n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Indoneshia

E Kwusaa Ozi Ọma Ruo n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Indoneshia

N’afọ 1953, e nyere Nwanna Peter Vanderhaegen ọrụ sekit n’Indoneshia. Sekit ya bụ Indoneshia niile. Isi n’ebe ọwụwa anyanwụ Indoneshia gaa n’ebe ọdịda anyanwụ dị puku kilomita ise na otu narị. Isi n’ebe ugwu gaa n’ebe ndịda dịkwa otu puku kilomita na narị asatọ. Mgbe ọ na-eje ozi n’ebe a e kenyere ya, o nwere ọtụtụ ihe merenụ menyere ya ụjọ nakwa ndị nke mere ya obi ụtọ.

Onye a bụ Nwanna Peter Vanderhaegen

 N’afọ 1954, Nwanna Vanderhaegen gara n’agwaetiti ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Indoneshia. E nwere ọtụtụ okpukpe na ha. A bịa n’agwaetiti Bali, ọtụtụ ndị bi na ya bụ ndị Hindu. Na Lombok na Sumbawa, ọtụtụ ndị bi na ha bụ ndị Alakụba. Na Flọris, ọtụtụ ndị bi na ya bụ ndị Katọlik. Na Sumba, Alọ, na Timọ, ọtụtụ ndị bi na ha bụ ndị Protestant. Tupu Nwanna Vanderhaegen eruo isi obodo Timọ bụ́ Kupang, ọ na-akwụsịtụ ụgbọ mmiri ya zie ndị bi n’agwaetiti ndị ọ na-agafe ozi ọma. O kwuru, sị, “M ziri ozi ọma na Timọ izu abụọ. N’agbanyeghị oké mmiri ozuzo, m nyefere akwụkwọ niile m ji, nwetakwa mmadụ iri atọ na anọ kwuru ka a na-ezitara ha magazin. M malitekwara ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl.” Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche bịara mụwara ndị a nwere mmasị Baịbụl. Ha hiwekwara ọgbakọ na Kupang. E si na Kupang ziri ozi ọma gaa n’agwaetiti ndị dị́ nso. Ha bụ Rotè, Alọ, Sumba, na Flọris.

Mgbe ndị ụkọchukwu Protestant nọ na Kupang hụrụ na ndị òtù ha na-ege Ndịàmà Jehova ntị, ezigbo iwe were ha. Otu ụkọchukwu ọkwá ya dị elu gwara otu onye tinka mere agadi, nke nwere otu aka, ka ya na Ndịàmà Jehova kwụsị ịmụ Baịbụl. Aha ya bụ Thomas Tubulau. Onye ụkọchukwu ahụ gwara ya na ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ịkọrọ ndị ọzọ ihe Ndịàmà Jehova na-akụziri ya, na a ga-egburu ya mmadụ. Thomas gwara ya hoo haa, sị: “O nweghị Onye Kraịst ga-ekwu ihe a i kwuru ugbu a. Ụkwụ m agaghị akpa na chọọchị gị ọzọ.” Thomas ghọrọ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi. Nwa ya nwaanyị mechakwara ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche.

N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ụkọchukwu nọ na Timọ fooro ntụtụ taa na ha ga-emela Ndịàmà Jehova n’obodo ahụ. N’afọ 1961, ha mere ka Ngalaba Na-ahụ Maka Okpukpe na ndị isi amị nọ́ n’obodo ahụ machibido Ndịàmà Jehova iwu ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. N’ihi ya, ụmụnna anyị gbanwere ụzọ ndị ha si ezi ozi ọma. Ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ahịa, n’olulu mmiri, na-ezikwa ndị ọkụ azụ̀ ozi ọma n’ebe  ha na-ewepụta azụ̀ ndị ha gbutere. Ndị ọzọ ha na-ezi ozi ọma bụ ndị bịara imezi ili onye ezinụlọ ha nwụrụ anwụ. Mgbe otu ọnwa gachara, ndị amị ahụ wepụrụ iwu ahụ ha machibidoro anyị ma maa ọkwa na redio na onye ọ bụla nọ́ na Timọ nweere onwe ya ikpe okpukpe ọ bụla masịrị ya. Mgbe ngalaba ahụ na-ahụ maka okpukpe siri ọnwụ na e wepụbeghị iwu ahụ a machibidoro anyị, ụmụnna anyị gwara ha dee ya edee. Ha jụrụ. Mgbe ha na-ekweghị, ụmụnna anyị malitekwara ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ n’enweghị onye na-enye ha nsogbu.

Mgbe ndị ozi ala ọzọ aha ha bụ Piet de Jager na nwunye ya Nell nakwa Hans van Vuure na nwunye ya Susie rutere na Papụa n’afọ 1962, ndị ụkọchukwu nyekwara ha nsogbu. Mmadụ atọ n’ime ha ọkwá ha gbagotere agbagote bịakwutere ha ma gwa ha gaa ebe ọzọ kwusawa ozi ọma. Ha na-agwa ndị mmadụ okwu n’ọlta, n’akwụkwọ akụkọ, nakwa na redio na Ndịàmà Jehova na-akpatara ndị ọchịchị nsogbu. Ha hụ onye òtù ha ya na ndị ozi ala ọzọ malitere ịmụ Baịbụl, ha eyie ya egwu, ma ọ bụ nye ya aka azụ ma ọ bụkwanụ were ire ụtọ gwa ya okwu ka ọ kwụsị. Ha na-enyekwa ndị isi obodo nsogbu ka ha ghara ikwe ka Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma.

Ma, mbọ ha gbara kụrụ afọ n’ala mgbe otu onyeisi obodo kpọrọ ndị ozi ala ọzọ ahụ ka ha bịa gwa ndị obodo ya okwu. Nwanna Hans kwuru, sị: “Mgbe onyeisi obodo ahụ kpọkọtachara ndị obodo ya, mụ na Nwanna Piet kwuru okwu dị́ nkenke anyị ji kọwaa ozi anyị. Mgbe ahụ, ndị nwunye anyị gosiri ha otú anyị ga-esi akụ aka n’ọnụ ụzọ ha, bata ma ha sị anyị bata, ma gwa ha ihe ole na ole si na Baịbụl. Ihe anyị mere tọrọ onyeisi obodo a na ndị obodo ya ụtọ. Ha kwetakwara ka anyị na-ezi ozi ọma n’ebe niile n’obodo ha.”

Ụdị ihe a mekwara n’ebe ndị ọzọ. O siri ike ịhụ ebe ndị Alakụba nyere anyị nsogbu ka anyị ghara ikwusa ozi ọma. Ọ bụ ndị ụkọchukwu na-enyekarị anyị nsogbu. Ha ka na-emekwa otú ahụ ruo ugbu a.

 “A Ga-akpụpụta Unu n’Ihu Ndị Gọvanọ . . . Ka Ọ Bụrụ Àmà”

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.” (Mat. 10:18) Ihe a Jizọs kwuru emeela ugboro ugboro n’Indoneshia.

N’afọ 1960, otu onye Nedalandz bụ́ ọkà mmụta okpukpe na Jakata bipụtara akwụkwọ o ji kpọọ Ndịàmà Jehova Ndị Kraịst ụgha. Akwụkwọ ahụ mere ka ọtụtụ ndị ụkọchukwu bowe anyị ebubo. Dị ka ihe atụ, otu ụkọchukwu degaara Ngalaba Na-ahụ Maka Okpukpe akwụkwọ ozi, na-ekwu na Ndịàmà Jehova na-emegharị ndị chọọchị ya anya. Mgbe ndị ọnụ na-eru n’okwu na ngalaba ahụ kpọrọ ụmụnna anyị  ka ha bịa zara ọnụ ha, ha bịara. Ụmụnna anyị mere ka ha mata nke bụ́ eziokwu ma zie ha ozi ọma. Otu n’ime ha gwara ndị ibe ya, sị: “Hapụnụ Ndịàmà Jehova aka. Ha na-akpọte ndị Protestant nọ n’ụra.”

Ebe a na-ebutu akwụkwọ anyị a na-akpọ Paradise e bubatara n’afọ 1963

N’afọ 1964, ụfọdụ ndị ụkọchukwu Protestant e nwere na Papụa degaara Kọmitii Na-ahụ Maka Okpukpe na Ọdịmma Ọhaneze n’Ụlọ Nzukọ Omeiwu akwụkwọ ka ha machie Ndịàmà Jehova ikwusa ozi ọma. Alaka ụlọ ọrụ anyị degaara kọmitii ahụ akwụkwọ ka ha kwe ka ha bịa zara ọnụ ha. Nwanna Tagor Hutasoit kwuru ihe mere mgbe ha gara. Ọ sịrị: “Anyị ji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu awa kọwaara ha ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ na Baịbụl. Otu n’ime ha, bụ́ onye Protestant na-emegide anyị, boro anyị ebubo na anyị na-akpata ọgba aghara na Papụa. Ma, ọtụtụ ndị Alakụba n’ime ha, meteere anyị ebere. Ha gwara anyị, sị: ‘Iwu obodo anyị kwuru na nwa amaala ọ bụla nweere onwe ya ikpe okpukpe masịrị ya. N’ihi ya, unu nweere onwe unu ịna-ezi ozi ọma.’” Mgbe ha nwechara nnọkọ a, otu onye ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti kwuru, sị: “Gọọmenti ọhụrụ anyị . . . ewepụbeghị iwu kwuru na onye ọ bụla nweere onwe ya ikpe okpukpe masịrị ya ma okpukpe ndị pụtara ọhụrụ.”