Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

Ọtụtụ Ndị Abata n’Ọgbakọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java

Onye a bụ Nwanna Theodorus Ratu

Ọtụtụ Ndị Abata n’Ọgbakọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java

N’afọ 1933, Nwanna Frank Rice gwara Theodorus (Theo) Ratu, bụ́ onye Ebe Ugwu Sulawesi, ka ọ na-abịa enyere ya aka elekọta ebe anyị na-ebusa akwụkwọ na Jakata. Nwanna Theo sịrị: “M bịara nwekwuo mmasị n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. M malitekwara iso Nwanna Rice na-ekwusa ya. M mechara soro Nwanna Bill Hunter kwusaa ozi ọma n’ebe niile na Java, sorokwa ná ndị ji ụgbọ mmiri Lightbearer gaa kwusaa ozi ọma na Sumatra.” Theo bụ onye Indoneshia mbụ ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ọ sụkwara ụzọ ọtụtụ iri afọ na Java, Ebe Ugwu Sulawesi, nakwa na Sumatra.

N’afọ na-eso ya, Nwanna Hunter nyere Felix Tan, bụ́ nwa akwụkwọ bi na Jakata, akwụkwọ anyị bụ́ Where Are the Dead? (Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?) Felix ji akwụkwọ ahụ laghachi n’ụlọ ha na Bandọng, nke dị́ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java, ma gosi ya nwanne ya nwoke ọ tọrọ aha ya bụ Dodo. Ọ tụrụ ha abụọ n’anya mgbe ha gụrụ akwụkwọ ahụ chọpụta na nwoke mbụ bụ́ Adam enweghị mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ, kama, ọ bụ mkpụrụ obi n’onwe ya. (Jen. 2:7) Ihe a ha mụtara mere ka ha nwekwuo mmasị ịmụ Baịbụl. N’ihi ya, ha gara n’ebe a na-ere akwụkwọ ochie na Bandọng  iji hụ ma hà ga-enwetakwu akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Ha kụzikwaara ndị ezinụlọ ha ihe ndị ha mụtara. Mgbe ha gụchara akwụkwọ anyị ndị ha hụrụ, ha degaara onye na-elekọta ebe a na-ebusa akwụkwọ anyị na Jakata akwụkwọ ozi. Ọ tụrụ ha n’anya mgbe Nwanna Rice bịara na nke ha wetara ha akwụkwọ anyị ndị ọhụrụ ma gbaa ha ume.

Ndị a bụ ndị ezinụlọ Tan

Obere oge Nwanna Rice laghachiri Jakata, Nwanna Deschamp na nwunye ya ọ lụrụ ọhụrụ aha ya bụ Jean bịara Bandọng nọọ abalị iri na ise. Nwanna Felix kwuru, sị: “Nwanna Deschamp jụrụ ndị ezinụlọ anyị ma hà ga-achọ ka e mee ha baptizim. Mmadụ anọ n’ime anyị, ya bụ, Dodo, nwanne m nwaanyị m tọtara aha ya bụ Josephine (Pin Nio), mama m (bụ́ Kang Nio), na mụnwa mere baptizim iji gosi na anyị enyefeela Jehova onwe anyị.” * Mgbe e mechara Tan  na ndị ezinụlọ ya baptizim, ha sonyeere Nwanna Deschamp na nwunye ya gaa kwusaa ozi ọma ụbọchị itoolu. Nwanna Deschamp kụziiri ha otú ha ga-esi eji kaadị anyị e dere ihe ole na ole si na Baịbụl zie ozi ọma. E dere ihe ole na ole ahụ n’asụsụ atọ. Obere oge, mmadụ ole na ole ahụ na-enwe ọmụmụ ihe na Bandọng ghọrọ ọgbakọ. Ọgbakọ ha bụ nke abụọ e nwere n’Indoneshia.

Okpu Poopu

Ka ozi ọma ụmụnna anyị ndị a na-ekwusa biiri ọkụ, ndị ụkọchukwu Krisendọm malitere lebawara ha anya. Ma ha ma ndị òtù ha malitere ide ihe ụfọdụ n’akwụkwọ akụkọ iji katọọ ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi na ozi ọma ha na-ekwusa. Ihe ndị ahụ ha dere mere ka ndị isi Ngalaba Na-ahụ Maka Okpukpe kpọọ Nwanna Rice òkù ma gbaa ya ajụjụ. Ihe ọ zara ha juru ha afọ, ya emee ka ha gharazie ịna-enye ụmụnna anyị nsogbu maka ozi ọma ha na-ekwusa. *

N’agbata afọ 1931 na afọ 1934, ọtụtụ ndị Nedalandz na-achị Indoneshia gbara ụmụnna anyị nkịtị ka ha na-ezi ozi ọma. Ma mgbe ndị ọchịchị Nazi nke Jamanị malitere ịkpa ike na Yurop, ụfọdụ ndị nọ́ n’ọchịchị, nke ka nke ndị bú chọọchị Katọlik n’isi, malitere imegide Ndịàmà Jehova. Nwanna Deschamp kwuru, sị: “Otu onye kọstọm na-ekpe Katọlik jichiri akwụkwọ anyị e bubatara n’Indoneshia maka na ọ sịrị na akwụkwọ ndị ahụ kwuru okwu ọjọọ gbasara ọchịchị ndị Nazi. Mgbe m gara n’ụlọ ọrụ ha maka ya, onye kọstọm ahụ gara ezumike. Onye nọchiri ya na-abụghị onye Katọlik gosiri m akwụkwọ ndị ahụ ozugbo ma gwa m, sị, ‘Buru ole ọ bụla i nwere ike iburu ugbu a onye ọ dị n’aka na-anọghị.’”

Nwanna Nwaanyị Deschamp kwuru, sị, “O nwere mgbe ndị kọstọm siri ọnwụ na anyị ga-ehicharịrị ihe osise abụọ dị́ n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Enemies. Ihe osise abụọ ahụ ha  na-achọghị iji anya ahụ bụ agwọ hịkọrọ ahịkọ (ya bụ, Setan) na nwaanyị akwụna mmanya na-egbu (ya bụ, okpukpe ụgha). Ma agwọ ahụ ma nwaanyị akwụna ahụ kpucha okpu poopu. * Anyị kpebisiri ike ikesa akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, anyị atọ nọ n’anwụ n’ọdụ ụgbọ mmiri jiri ihe techie okpu poopu ahụ e sere n’ọtụtụ puku akwụkwọ anyị e bubatara.”

Ihe osise abụọ ahụ ndị ọchịchị na-achọghị iji anya ahụ dị́ n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Enemies

Ka agha na-achọ ibido na Yurop, akwụkwọ anyị nọgidere na-agba omume ihu abụọ ndị Krisendọm na-eme nakwa aka ha na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’anwụ. Ndị ụkọchukwu bidoro ịkwanyekwu ndị ọchịchị ọkụ n’ikè ka ha kwụsị anyị izi ozi ọma. A machibidokwara ọtụtụ akwụkwọ anyị iwu.

Ma ụmụnna anyị kpebisiri ike ịna-ezi ozi ọma. Ha ji ígwè e ji ebi akwụkwọ e si n’Ọstrelia butere ha na-ebi akwụkwọ. (Ọrụ Ndịozi 4:20) Nwanna Nwaanyị Deschamp kwuru otu n’ime ihe ndị ha na-eme n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Anyị bipụta  akwụkwọ ma ọ bụ magazin ọhụrụ, anyị na-ewegara ndị ọchịchị otu ka ha gụọ ya ma nye anyị ikike ikesa ya. Anyị na-ebipụta akwụkwọ ahụ ná mmalite izu ma kesaa ya. O ruo ná ngwụcha izu, anyị na-ewegara ọkàikpe ukwu nke Indoneshia otu n’ọfis ya. Ọ bụrụ na ọ kwadoghị ka anyị kesaa ya, anyị na-efufe isi ma jiri ọsọ na ije gaa ibipụta ọzọ.”

Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị, bụ́ ndị na-ekesa akwụkwọ anyị ndị a machibidoro iwu, na-eji amamihe eso ndị uwe ojii ka ha ghara ijide ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Charles Harris na-ekwusa ozi ọma na Kediri, nke dị́ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Java, ọ gara na nke onye uwe ojii n’amaghị ama.

Onye uwe ojii ahụ sịrị ya: “O teela m chọwara gị. Chere ka m weta akwụkwọ e depụtasịrị akwụkwọ unu ndị a machibidoro iwu.”

Nwanna Harris kwuru, sị: “Mgbe onye uwe ojii ahụ na-achọgharị akwụkwọ ahụ n’ime ụlọ ya, m weere akwụkwọ ndị ahụ a machibidoro iwu tinye n’ime akpa kootu m. Mgbe ọ pụtara, m nyere ya akwụkwọ anyị iri na ise a na-amachibidoghị iwu. O jisiri ike nye m ego ha. Mgbe m gatukwuru, m nyefere ndị mmadụ akwụkwọ anyị ndị ahụ a machibidoro iwu.”

Ibi Akwụkwọ n’Oge Nsogbu

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ bịara biri ọkụ na Yurop, a naghịzi esi na Nedalandz ebubatara anyị akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ụmụnna anyị ma na ọ bụ ihe na-aga ime, n’ihi ya, ha haziri ka ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ na-ebipụtara anyị magazin anyị na Jakata. Consolation ma ọ bụ Teta! mbụ e bipụtara n’asụsụ Indoneshian bụ nke January 1939. Obere oge e bipụtachara Teta!, e bidoro ibipụta Ụlọ Nche. Ụmụnna anyị zụtaziri obere ígwè e ji ebi akwụkwọ ma jiri aka ha na-ebipụta Ụlọ Nche na Teta! N’afọ 1940, e si n’Ọstrelia butere ha nnukwu ígwè na-ebi akwụkwọ, bụ́ nke ha ji ebipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ Indoneshian na Dọch. Ọ bụkwa ego akpa ha ka ha ji na-ebi ya.

Mgbe a na-ebubata ígwè mbụ anyị ji bie akwụkwọ n’ebe anyị na-ebusa akwụkwọ anyị na Jakata

 N’ikpeazụ, n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Julaị afọ 1941, ndị ọchịchị machibidoro akwụkwọ anyị niile iwu. Nwanna Nwaanyị Deschamp kwuru ihe mere n’oge ahụ, sị: “Mgbe m nọ n’ọfis m n’otu ụtụtụ jiri taịpraịta na-ede ihe, ụzọ ọfis m mepere n’ike. Ndị uwe ojii atọ na onye Nedalandz ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị nke jiri ejiji ndị uwe ojii pụrụ iche batara. Ọ nya ọla n’olu, kpuru glov n’aka, jiri mma agha, ma kpuru okpu e tinyere abụba nnụnụ n’isi. Ọbịbịa ha ejughị anyị anya. Ụbọchị atọ tupu mgbe ahụ, anyị nụrụ na a ga-amachibido akwụkwọ anyị iwu n’oge na-adịghị anya. Onye ahụ ọnụ na-eru n’okwu onwe ya na-ebu isi gụpụtaara anyị ihe e dere n’akwụkwọ e ji machibido akwụkwọ anyị niile iwu ma gwazie anyị kpọrọ ha gaa n’ebe anyị na-ebi akwụkwọ ka ha gbachie ya. Ma di m gwara ha na ha abịaghị ngwa ngwa, na e rere ígwè anyị na-eji ebi akwụkwọ n’ụbọchị bọtara ụbọchị ahụ.”

Ma, a machibidoghị Baịbụl iwu. N’ihi ya, ụmụnna anyị na-ejizi naanị ya aga ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Ha mụkwaara ọtụtụ ndị Baịbụl. Ma ebe ọ bụ na agha nwere ike ịda n’Eshia, a gwara ndị ọsụ ụzọ anyị si mba ọzọ ka ha laghachi Ọstrelia.

^ para. 1 Ka oge na-aga, nna Felix na ụmụnne Felix atọ ọ tọrọ ghọrọ Ndịàmà Jehova. Nwanne Felix aha ya bụ Josephine lụrụ Nwanna André Elias. Ha abụọ gakwara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. E bipụtara akụkọ ndụ Nwanna Nwaanyị Josephine na Teta! Bekee nke September 2009.

^ para. 1 Mgbe a lụchara Agha Ụwa nke Abụọ, Nwanna Rice laghachiri Ọstrelia, lụọ nwaanyị, ma mụọ ụmụ. O jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1986.

^ para. 3 Ihe osise ndị ahụ si na Mkpughe 12:9 na Mkpughe 17:3-6.