Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

 INDONESHIA

Ha Gbataara Ụmụnna Ha Ọsọ Enyemaka n’Oge Ọdachi

Ha Gbataara Ụmụnna Ha Ọsọ Enyemaka n’Oge Ọdachi

ALA ỌMA JIJIJI na ugwu na-agbọpụ ọkụ na-akpakarị Indoneshia aka ọjọọ. Ụfọdụ ala ọma jijiji ndị ahụ na-eme n’oké osimiri ma buru mmiri bata n’ime obodo. Ọdachi ndị a mee, Ndịàmà Jehova na-agbatara ndị o metụtara ọsọ enyemaka ozugbo, karịchaa ụmụnna ha. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2005, ala ọma jijiji kpara mkpamkpa na Gunungsitoli, bụ́ obodo kachanụ n’agwaetiti Nịas, dị́ n’Ebe Ugwu Sumatra. Ozugbo ahụ, ọgbakọ ndị dị n’agwaetiti dị́ nso a na-akpọ Sumatra nakwa alaka ụlọ ọrụ anyị butere ihe ndị a ga-eji nyere ndị mmadụ aka. Otu onye nlekọta sekit na otu nwanna na-anọchite anya alaka ụlọ ọrụ ji ụgbọelu gaa n’agwaetiti ahụ ka ha gbaa ụmụnna ume ma mee ka obi sie ha ike. Otu n’ime ndị okenye e nwere na Nịas aha ya bụ Yuniman Harefa, sịrị, “Ezigbo ụjọ ji ndị mmadụ ebe a. Ma otú nzukọ Chineke si gbatara anyị ọsọ enyemaka ozugbo mere ka anyị mara na ụmụnna anyị kwụ anyị n’azụ.”