Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

Brazil: Ebe Valdira mụnyere kandụl ma jiri ekwentị nọrọ n’ọhịa na-amụ Baịbụl

 IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu
  • MBA OLE HA DỊ 57

  • MMADỤ OLE BI NA HA 982,501,976

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 4,102,272

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 4,345,532

Ọmụmụ Baịbụl E Ji Kandụl Amụ

Na Brazil, e nwere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-eje ozi n’ime ime obodo. Mgbe ha nụrụ gbasara otu nwa agbọghọ aha ya bụ Valdira, ha chọọrọ ya gawa. A mụọrọla Valdira Baịbụl afọ iri na atọ gara aga tupu mgbe ahụ. Tupu di na nwunye a ahụ ya, ha gara ogologo ije n’okporo ụzọ bụ́ uzuzu uzuzu,  gafeekwa ọtụtụ mmiri na-asọsi ike. Mgbe ha hụrụ ya, ọ chọsiri ike ka a maliteghachi ịmụrụ ya Baịbụl. Ebe ọ bụ na o bi n’ime ime obodo, a haziri otú a ga-esi na-amụrụ ya ihe. Valdira nwere ekwentị, ma naanị ebe ọ ga-anọ mmadụ akpọọ ya nweta ya bụ n’ọhịa dị́ anya n’ụlọ ha. Ihe ọzọ bụ na naanị mgbe ọ na-enwe ohere ịmụ ihe bụ ma ọ kụchaa elekere anya itoolu n’abalị. Weregodị ya na ị na-ahụ ka nwa agbọghọ ji ekwentị nọrọ naanị ya n’ọhịa n’abalị, mụnye kandụl na-amụ Baịbụl.

Valdira na-eji ekwentị ya ege ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe n’ụbọchị Sọnde. Ọ na-eji Baịbụl, Ụlọ Nche, na abụ aga n’ọhịa ahụ ma na-ege ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ mgbe mmiri na-ezo, ọ na-eji nche anwụ ya aga.

N’ọnwa Mach, Valdira gara ihe dị ka kilomita iri itoolu na asaa iji ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge e nwere nnọkọ pụrụ iche. Ọ bụ ná nnọkọ ahụ ka e wepụtara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e dezigharịrị edezigharị n’asụsụ Pọchugiiz. Obi dị ya ezigbo ụtọ na e nyere ya Baịbụl ọhụrụ a. Mgbe e kelere ya maka mbọ niile ọ na-agba ịmụ Baịbụl, ọ sịrị, “O nweghị oké ihe dị na ya.”

“M Ma na Otu Ụbọchị, Unu Ga-abịa”

E nwere ndị Amerịka bi na Kolombia a na-akpọ ndị Yukpa. Tupu otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Frank agaa izi ozi ọma n’otu n’ime obodo ndị dị ebe ahụ, a gwara ya kpachara anya maka chiifu obodo ahụ aha ya bụ John Jairo. Nwoke a achụọla ọtụtụ ndị chọọchị bịara ebe ahụ izi ozi ọma. Otu oge, mgbe John chọpụtara na pastọ ha na-ana ndị mmadụ otu ụzọ n’ụzọ iri, ọ gbaliri égbè elu, si otú ahụ chụọ ya ụkwụ eru ala.

Kolombia: Ebe Nwanna Frank na-amụrụ ụfọdụ ndị Yukpa Baịbụl

 Nwanna Frank kwuru, sị: “Mgbe anyị ruru obodo ahụ, onye mbụ gere anyị ntị bụ otu n’ime ụmụ John Jairo ndị nwaanyị. Mgbe anyị gosichara ya akwụkwọ anyị bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, o kwuru ozugbo, sị, ‘Ihe a bụ chọọchị m chọrọ ịna-aga.’ Ọ gbaara gaa gwa papa ya banyere anyị. Papa ya kpọrọ anyị ozugbo. Anyị ji ụjọ gaa za ya. Tupu anyị ekwuo ihe ọ bụla, ọ sịrị: ‘Ama m na chọọchị unu bụ ezigbo chọọchị. Afọ asatọ gara aga, ahụrụ m akwụkwọ unu yiri nke a unu nyere nwa m nwaanyị n’ebe a na-ekpofu ahịhịa na Beseril. M gụrụ ya, kemgbe ahụ, m nọ na-ele anya unu. M ma na otu ụbọchị, unu ga-abịa. M chọrọ ka unu kụziere mụ na ndị ezinụlọ m na ndị obodo a Baịbụl. Anyị na-eche unu eche.’

 “Ihe a o kwuru mere ka anya mmiri rujuo anyị n’anya. Ndị obodo ahụ niile gbakọtara ka ha nụ ozi ọma anyị bịara izi ha. John Jairo jikwa asụsụ ha na-agwa ha ihe anyị na-ekwu. Mgbe anyị na-ala, ọ kpụnyere anyị obere ịnyịnya ibu ka o bupụrụ anyị ihe anyị. Ugbu a, ndị Yukpa anyị na-amụrụ ihe dị otu narị na iri abụọ, ma mmadụ iri anọ na asaa n’ime ha bụ ndị anyị na-agụrụ ka ọmụmụ Baịbụl. John Jairo na nwa ya nwaanyị so na ha.”

Onye Na-emegide Anyị Agbanwee

E nwere otu nwoke bubu chọọchị Katọlik n’isi n’Ekwedọ. Aha ya bụ José. O dere, sị: “Anaghị m achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova. M mesiri ha ike ruo afọ iri. M na-akpọrọ ha ndị ga-emesi ha ike. M na-akụ ha ezigbo ihe, ma boo ha  ebubo na ha bụ ndị ohi. Ndị uwe ojii tụba ha n’ụlọ nga, m na-aga ebe ahụ jiri ugodi kpọchie ya n’onwe m. O nwedịrị mgbe anyị kụkasịrị ụgbọala otu Onyeàmà Jehova. N’oge ọzọ, anyị tụbara ọgba tum tum ha n’olulu.

“N’afọ 2010, oyi bara m ahụ́. Dọkịta m gwara m kwapụ n’ugwu Andis m bi kwaga n’ebe na-ekpotụ ọkụ ka m nọrọ ebe ahụ gbakee. M gara biri n’otu obere ugbo onye ikwu m ma mechaa lekọtawara ya ugbo ahụ. Ọ bụ naanị m na-anọ. N’ihi ya, m chọsiri ike inweta onye mụ na ya ga na-ekwurịta okwu. Ị̀ ma ndị bịaranụ? Ọ bụ Ndịàmà Jehova. Ebe ọ na-enweghị onye ọzọ mụ na ya na-ekwurịta okwu, m nabatara ha. Otú ha si gụọ Baịbụl ma kọwaa ya tụrụ m n’anya. M kwetara ka mụ na ha na-amụ Baịbụl. Mgbe mụ na ha mụrụ Baịbụl ruo ọnwa isii, m gara ọmụmụ ihe ha nke mbụ m. Otú ha si nabata m ma mesoo m ihe tọrọ m ụtọ nke na m jụrụ onwe m, sị, ‘Ọ̀ ga-abụ na ndị a bụ ezigbo ndị ohu Chineke?’ M mụgidere ihe ma mechaa mee baptizim n’ọnwa Eprel afọ 2014.

“Ihe ọjọọ niile m mere Ndịàmà Jehova na-ewute m. Ma, Jehova kwere ka m mezitụ ihe ụfọdụ m mejọrọ. Ná mgbakọ sekit anyị gara n’abalị anọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2014, a gbara m ajụjụ ọnụ gbasara otú m si mesie Ndịàmà Jehova ike n’oge gara aga. Nwanna gbara m ajụjụ ọnụ jụrụ m, sị: ‘A sị gị rịọ otu n’ime ndị ahụ i mesiri ike mgbaghara, ònye ka ị ga-arịọ?’ M kwuru ozugbo na ọ bụ otu nwanna aha ya bụ Edmundo, ma amaghị m otú mụ na ya ga-esi ahụ. Amaghị m na onye nlekọta sekit anyị zoro ya n’azụ ikpo okwu. Ozugbo m kwuru na amaghị m otú mụ na ya ga-esi ahụ, o si ebe ahụ pụta, mụ na ya amakụọ ma bee ákwá. Ụmụnna anyị bekwara ákwá.”

“Biko Jehova, Mee Ka Mụ na Ndịàmà Gị Hụ”

Paragụwaị: Ebe otu nwa agbọghọ na-ajụ ụmụnna anyị nwaanyị ma hà bụ Ndịàmà Jehova

N’otu ehihie anwụ na-achasi ike, otu ìgwè ozi ubi e nwere na Asunsiọn dị́ na Paragụwaị rụchara ebe  e kenyere ha izi ozi ọma n’ụbọchị ahụ. Mgbe ha rụchara ya, ha gara ka ha zie ozi ọma n’ụlọ ole na ole dị́ ha nso. Otu nwanna kwuru, sị, “O nwere ike inwe onye na-ekpe ekpere ka a bịa nyere ya aka.” N’ụlọ dị́ n’akụkụ ebe ọ nọ, otu nwa agbọghọ hụrụ ụmụnna anyị ndị nwaanyị ma jiri ihu ọchị kelee ha, jụọ ha ma hà bụ Ndịàmà Jehova. Ọ gwara ha na ya si Bolivia kwata na Paragụwaị n’ihi ọrụ ya. A na-amụburu ya Baịbụl na Bolivia. O nweghị onye agbata obi ya ọ bụla ma otú ya ga-esi ahụ Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, o kpere ekpere, sị, “Biko Jehova, mee ka mụ na Ndịàmà gị hụ.” Ọ bụ n’ụbọchị o kpere ekpere ahụ ka ụmụnna nwaanyị ahụ bịara na nke ya, ha na ya amalite ịmụ Baịbụl.