Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

 IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Europe

Europe
  • MBA OLE DỊ NA YA 47

  • MMADỤ OLE BI NA HA 741,311,996

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 1,611,036

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 847,343

Ya na Ụmụ Klas Ya Bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

Finland: Ihe a bụ mgbe ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke anọ bịara ịhụ ihe a na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

Finland, e nwere otu nwata akwụkwọ aha ya bụ Ines, bụ́ Onyeàmà Jehova. Ọ nọ na klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị. Mgbe ọ nụrụ na onye nkụzi ha chọrọ ịkụziri ha banyere Ndịàmà Jehova, ọ gwara ha ka ha bịa legharịa anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụ klas ya na onye nkụzi ha kwetara na ha ga-aga.

N’izu ọzọ, ụmụ klas ya dị mmadụ iri atọ na asatọ ji ígwè ha gbaa  ihe dị ka kilomita ise ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị nkụzi abụọ na onyeisi ụlọ akwụkwọ ha bịakwara. Mgbe ha rutere, ha hụrụ ụmụnna nwoke abụọ na ụmụnna nwaanyị atọ. Mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ nọ na-eri nri, ha jụrụ ajụjụ gbasara Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa gbasara Ndịàmà Jehova. Ha jụrụ, sị: “Olee ihe unu na-amụ n’ọmụmụ ihe unu? Olee ihe unu na-eji ọnụ ụlọ ahụ dị ebe ahụ eme?” Ọnụ ụlọ ha na-ajụ ajụjụ ya bụ ọ́bá akwụkwọ dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ha jụkwara, sị: “Gịnị mere unu ji dee ‘iri kee isii’ n’ahụ́ ájá?” Ihe ha na-ekwu bụ Matiu 6:10, bụ́ ebe isiokwu afọ ahụ si.

Ụmụnna anyị mepere jw.org gosi ha katuun bụ́ Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka. Ihe mere e ji gosi ha ya bụ na ụlọ akwụkwọ a so ná ndị a kụziiri otú a ga-esi akwụsị ụmụ akwụkwọ ịna-achọ ibe ha okwu. Ha gosikwara ha ihe ụfọdụ dị na jw.org, kpọnyekwara ha otu abụ anyị. Ha nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze otu awa.

Obi tọrọ ma onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ ahụ ụtọ. Ihe ndị ahụ e gosiri ha na jw.org masịrị onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ, ya asị na e nwere ike iji ya kụziere ụmụ akwụkwọ ha ihe gbasara okpukpe. Obi tọkwara ya ụtọ mgbe ọ nụrụ na ụmụ klas ndị ọzọ nwekwara ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze legharịa anya. Nke a mere ka onye nkụzi klas ọzọ kpọtụrụ ụmụnna anyị n’echi ya, gwa ha na hanwa chọkwara ịbịa legharịa anya.

Ọ Chọtara Ihe Bara Uru n’Ebe A Na-ekpofu Ahịhịa

Otu nwaanyị onye Romenia aha ya bụ Cristina agaghị ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, ọ maghị agụ, ọ maghị ede. Ọ dakwara ogbenye. Otú ọ na-esi enweta ego o ji akpa afọ ya bụ ịtụtụ ihe n’ebe a na-ekpofu ahịhịa. Otu ụbọchị ọ na-atụtụ ihe ebe ahụ, ọ hụrụ otu akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Ndị e sere na ya mara mma, obi dịkwa ha ụtọ. Ọ gwara onwe  ya, sị: ‘E nwere ebe ụdị ndị a bi n’ụwa.’ Cristina chọsiri ike ịma ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, ọ gwara mmadụ gụọrọ ya ya. Mgbe ọ matara na akwụkwọ ahụ na-ekwu banyere okpukpe, obi jọrọ ya njọ na mmadụ tụfuru akwụkwọ kwuru banyere Okwu Chineke. Cristina na-agazi ebe ahụ atụtụ broshọ, traktị na magazin anyị. Ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ zuru ezu, ndị ọzọ dọkara adọka.  Ọ mụrụ otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe ka o nwee ike ịmụtakwu ihe n’akwụkwọ ndị ahụ.

Ka oge na-aga, Ndịàmà Jehova ziri Cristina ozi ọma, ya na ha amalitekwa mụwa Baịbụl. Obi dị ya ụtọ na Jehova mere ka o si n’akwụkwọ ndị ọzọ tụfuru etufu mata ya. Ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya, ihe ọ na-amụta na-atọkwa ya ụtọ. Otu n’ime ihe kacha eme ya obi ụtọ bụ na ọ na-enweta magazin, akwụkwọ na broshọ ndị ọhụrụ. Ọ naghịzi aga n’ebe a na-ekpofu ahịhịa achọ ha. N’eziokwu, Cristina chọtara ihe bara uru n’ebe a na-ekpofu ahịhịa.

Ọmụmụ Baịbụl A Nọ “n’Ọhịa” Na-amụ

Jamanị: Ihe a bụ mgbe Nwanna Nwaanyị Margret na-amụrụ otu nwaanyị Baịbụl n’ọhịa

N’ụtụtụ ọ bụla, Nwanna Nwaanyị Margret na-akpọ nkịta ya akpagharị n’otu ọhịa dị na Jamanị. O kwuru, sị, “M na-agba mbọ ka mụ na ndị na-agafe agafe na-ekwurịta okwu. Ọ bụrụ na ọ dịghị ha ngwa ngwa, m na-akọrọ ha ihe Baịbụl kwuru.”

Otu ụbọchị, ọ hụrụ otu nwaanyị kpọkwa nkịta nke ya na-aga n’ụzọ. Nwaanyị a akarịtụla iri afọ asaa. Margret malitere izi ya ozi ọma. Ihe ọ gwara nwaanyị a tọrọ ya ụtọ. Ọ gwara Margret na ya na-ekpegara Chineke ekpere, na-agụkwa Baịbụl kwa ụbọchị. Si n’ụbọchị ahụ gawa, nwaanyị a na nwanna nwaanyị a na-abịa ebe ahụ kwa ụbọchị na-ekwurịta ihe gbasara Chineke. Otu ụbọchị, ọ jụrụ Margret, sị: “Olee otú i si mara Baịbụl otú a?” Ya agwa ya na ya bụ Onyeàmà Jehova.

Margret gwara nwaanyị ahụ ọtụtụ ugboro ka ha mụwa Baịbụl, ya ajụ. Ma, ha abụọ ka na-ekwurịta ihe si na Baịbụl. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, Margret gwakwara ya ka ha mụwa Baịbụl. Ya agwazie ya na ụjọ na-atụ ya ịmụ Baịbụl n’ihi na nwoke ya na ya bi anaghị achọ iji anya ahụ Ndịàmà Jehova.

 N’oge ọzọ, Margret ji Baịbụl na akwụkwọ Bible Na-akụzi gaa n’ọhịa ahụ. Mgbe ọ hụrụ nwaanyị ahụ, ọ katara obi gwa ya, sị: “Ihe m chọrọ ịgwa gị ugbu a bụ ka anyị mụwa Baịbụl n’ọhịa, ọ bụghị n’ụlọ gị.” Mgbe Nwanna Nwaanyị Margret gwachara ya ihe a, anya mmiri eju nwaanyị ahụ n’anya, ya ekweta ozugbo ka ha mụwa Baịbụl. Nwaanyị ahụ na-abịa ebe ahụ amụ Baịbụl abalị isii n’izu. Mgbe ụfọdụ, Margret na-eji nche anwụ na tọọchị amụrụ nwaanyị ahụ Baịbụl.

Otú O Si Fufee Isi Megharịrị Ha Anya

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Delphine na otu nwaanyị aha ya bụ Irina na-amụ Baịbụl n’obodo Bọlgeria. Ihe nwaanyị a na-amụ na-atọ ya ụtọ. Ọ na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Ma, di Irina achọghị ka Irina na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. N’ihi ya, ọ kpọọrọ ezinụlọ ya gaa n’otu obere obodo dị na Swidin biri. Nke a mere ka Irina na Nwanna Nwaanyị Delphine kwụsị ịmụ Baịbụl. Otu ụbọchị, ụmụnna nwaanyị abụọ aha ha bụ Alexandra na Rebecca hụrụ Irina ma chọọ ka ha zie ya ozi ọma. Irina anaghị anụ Swidish. Ụmụnna nwaanyị a wepụtara akwụkwọ Good News for People of All Nations, mepee ebe e dere ihe n’asụsụ Bọlgerian, ma nye ya Irina ka ọ gụọ. Akwụkwọ a nyeere ha aka ha ajụọ ya ma ọ̀ ga-achọ inweta akwụkwọ e dere n’asụsụ ya. Irina fufere isi. Ụmụnna nwaanyị a lawara chee na Irina achọghị inweta ya.

Nwanna Nwaanyị Alexandra mechara cheta na Nwanna Nwaanyị Linda, bụ́ onye Swidin na-eje ozi na Bọlgeria, ga-abịa Swidin n’izu ole na ole na-abịanụ. O kwuru na Irina ga-aghọta ihe Baịbụl na-akụzi nke ọma ma e jiri asụsụ ya kụziere ya ihe. Mgbe Linda bịara Swidin, ya na Alexandra so gaa na nke Irina. Mgbe ha ruru, Irina gwara Linda na ya nọ na-arịọ Jehova abalị niile ka o zitere ya onye ọzọ ya na ya ga na-amụ Baịbụl. Irina kwuru na ya na-ejikarị  akwụkwọ Bible Na-akụzi aga ebe ọ bụla ya na aga ka o nwee ike gosi ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ọ ga-ahụ. Ma, o nweghị Onyeàmà Jehova ọ bụla ọ hụrụ. Obi tọrọ Irina ụtọ mgbe o nwetara akwụkwọ ndị ọzọ n’asụsụ Bọlgerian.

Nwanna Nwaanyị Linda jụrụ Nwanna Nwaanyị Alexandra ihe mere ha ji chee na Irina achọghị inweta akwụkwọ anyị mgbe mbụ ha gara na nke ya. Alexandra gwara ya na mgbe ha jụrụ ya, o fufere isi. Linda mụmụrụ ọnụ ọchị ma gwa ha na ọ bụrụ na a jụọ onye Bọlgeria ajụjụ, ya ekwe n’isi, ọ pụtara na onye ahụ ekweghị, o fufeekwanụ isi, ọ pụtara na o kwere. Irina nọ na-amụ Baịbụl n’asụsụ Bọlgeria ruo mgbe ọ mụtara asụsụ Swidin. Olee otú o si na-amụ ihe n’asụsụ Bọlgerian? Ya na Delphine maliteghachiri ịmụ ihe. Ha na-amụ ya n’Ịntanet, n’agbanyeghị na ha anọghị otu ebe. Ha na-ahụ onwe ha ma ha na-amụ ihe.

Otú Àgwà Ọma Nna Si Nyere Nwa Ya Aka

A kụziiri otu nwaanyị bi na Spen aha ya bụ Jemima eziokwu mgbe ọ dị obere. Ma, mgbe ọ dị afọ asaa, mama ya kpebiri na ya achọkwaghị ịbụ Onyeàmà Jehova ma gbaa papa ya alụkwaghịm. Nke a mere ka ihe gbanwee ná ndụ Jemima. Mgbe ọ dị afọ iri na atọ, ọ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe. Mbọ niile papa ya gbara ịkụziri ya ihe gbasara Chineke, kụrụ afọ n’ala.

Mgbe Jemima toro, ọ banyere n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa òtù ọrụ ebere n’ihi na ọ chọrọ ka ihe dịrị ndị nkịtị ná mma. Mgbe ọ na-enweghịzi ọrụ, papa ya Domingo gwara ya ka ọ rụwara ya ọrụ. Papa ya na-ete ụlọ ágbá.

Otu ụbọchị Domingo na Jemima nọ na-arụ ọrụ, Domingo gwara ya ka ya mụwara ya Baịbụl, ya ajụ. Jemima gwara ya na ya chọọ ịmụ Baịbụl, na ya ga-agwa ya. Domingo na-akpọkarị Baịbụl na magazin a na-egere egere ma ọ na-arụ ọrụ. Ma, Jemima na-akwụnye ihe ná ntị na-ege egwú pọp.

 Domingo mechara lụọ nwaanyị ọzọ. Na Nọvemba afọ 2012, a kpọrọ ya ka ọ bịa gụọ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Lụrụ Di na Nwunye. Mgbe Jemima nụrụ ya, o metụrụ ya n’ahụ́ na papa ya ga-eji ọnwa abụọ gaa ụlọ akwụkwọ ma hapụ ihe niile gawa ebe ọ bụla a ga-eziga ya. Nke a mere ka Jemima ghọta na papa ya ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ chọkwara ịma ihe kpatara ya.

Jemima kwụsịrị ige egwú ndị ahụ ọ na-ege, gewazie Baịbụl na magazin papa ya na-ege. Ọ malitere ịjụ papa ya ajụjụ. Otu ụbọchị mgbe papa ya nọ n’elu ubube na-ete ụlọ ágbá, ọ jụrụ ya, sị: “Ì chetara mgbe m gwara gị na m chọọ ịmụ Baịbụl na m ga-agwa gị? M chọziri ịmụ Baịbụl.”

Obi tọrọ Domingo ụtọ mgbe Jemima gwara ya ihe a. Ha malitere ịmụ ihe n’ọnwa Jenụwarị afọ 2013. Ha na-amụ ya ugboro abụọ n’izu. Ụlọ akwụkwọ ahụ malitere n’ọnwa Eprel. N’agbanyeghị nke ahụ, ya na Jemima na-amụ ihe n’Ịntanet. Ha na-ahụkwa onwe ha ma ha na-amụ ihe. Mgbe Domingo gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, Jemima gara ememme ngụcha akwụkwọ ha. Ihe ndị e kwuru n’ememme ahụ tọrọ ya ụtọ. O mere baptizim n’abalị iri na anọ n’ọnwa Disemba, afọ 2013.

Jemima kwuru, sị: “Jehova nweere m ezigbo ndidi, amakwa m na o nweghị mgbe ọ hapụrụ m. O meela ka m nweta ezigbo ndị enyi m na-enwetalighị n’ụwa. Otú ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile si dịrị n’otu mere ka o dokwuo m anya na Jehova hụrụ anyị n’anya.”

Uru Ịkwanyere Ndị Mmadụ Ùgwù Bara

N’abalị iri atọ n’ọnwa Mach, afọ 2014, ndị uwe ojii ji ụgbọala ha bịa n’ebe otu nwanna ji ihe a na-akwagharị akwagharị e dewere akwụkwọ anyị na ya na-ezi ozi ọma. Ebe a ọ nọ dị nso n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Rọshịa. Aha nwanna a bụ Vasilii. O jeela ozi ọtụtụ afọ na Betel dị na  Rọshịa. Mgbe ndị uwe ojii ahụ kwụsịrị ụgbọala ha n’ebe Vasilii nọ na-ezi ozi ọma, otu onye uwe ojii si n’ụgbọala ahụ pụta ma meda obi gwa Vasilii ka ọ kwụsị ozi ọma ahụ ọ na-ezi n’ihi na ụfọdụ ndị na-eme mkpesa banyere ya n’ebe ahụ. Onye uwe ojii ọzọ ji vidio see ha mgbe ha na-ekwurịta okwu. Vasilii kwuru na ọ ga-akara ya mma ige ndị uwe ojii ntị kama ị zọwa ihe ruuru ya. Mgbe ya na ndị uwe ojii ahụ na-ekwurịta okwu, ụfọdụ ndị bịara ka ha mara ihe na-emenụ. Vasilii kwaara ngwongwo ya laa. Ma mgbe abalị abụọ gachara, ọ gwara otu onyeisi ndị uwe ojii ka ya na ya nwee nnọkọ. Onyeisi ndị uwe ojii ahụ kwetara. Ná nnọkọ ahụ, Vasilii kelere ya maka ọrụ ọma ha na-arụrụ ndị obodo ha nakwa otú ndị uwe ojii ahụ ya na ha kwurịtara okwu abalị abụọ gara aga si meda obi gwa ya okwu. Onyeisi ndị uwe ojii ahụ lere onye na-esote ya anya gwa ya, sị: “Kemgbe afọ iri atọ m rụwara ọrụ a, ahụbeghị m onye kelere anyị maka ọrụ anyị na-arụ.” Mgbe ha na-ekwurịta okwu, Nwanna Vasilii mere ka ọ ghọta na iwu kwadoro ozi ọma anyị na-ezi. Ọ jụrụ Nwanna Vasilii ihe mere o ji kwụsị ozi ọma ahụ kwara ngwongwo ya laa otú ahụ ndị uwe ojii kwuru, n’agbanyeghị na ọ ma na iwu kwadoro ozi ọma ahụ ọ na-ezi? Nwanna a gwara ya, sị: “Ana m akwanyere ndị uwe ojii ùgwù. Chegodị echiche otú ọ gaara adị ma a sị na m nọ n’ihu ndị niile nọ ebe ahụ gwa ndị uwe ojii na ha amaghị iwu.” Ihe a Vasilii kwuru mere ka obi tọọ onyeisi ndị uwe ojii a na onye na-esote ya ụtọ. Ha gwara Vasilii na ha agaghị enye ya nsogbu ọzọ ma o jiri ihe a na-akwagharị akwagharị e dewere akwụkwọ anyị na ya na-ezi ozi ọma.