Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

 IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile

OTÚ ọtụtụ ndị si na-abata ná nzukọ Jehova taa emeela ka ọ dị mkpa na a ga-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, ụlọ akwụkwọ ebe nzukọ Jehova na-azụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị, nakwa Ọfis Ndị Nsụgharị. Nke a emeekwala ka ọ dị mkpa na a ga-arụ ihe ụfọdụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. N’ihi ya, n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, Òtù Na-achị Isi hiwere ngalaba ọhụrụ ga-eme ka a gbapụ ọrụ ise ụkpụrụ ụlọ na ịrụ ha arụ ọsọ, nakwa ịrụzigharị ndị nke a rụrụla arụ na ilekọta ha otú na-agaghị efu oké ego ma ọ bụ rie oge. Aha a kpọrọ ya bụ Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile. Ngalaba a dị n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Bruklin, Niu  Yọk. Ọ bụ Kọmitii Mbipụta nke Òtù Na-achị Isi na-elekọta ngalaba a.

Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná Mpaghara Dị Iche Iche n’Ụwa, bụ́ ndị e nwere n’alaka ụlọ ọrụ anyị ndị dị n’Ọstreleshia, Sentral Yurop, Saụt Afrịka, nakwa n’Amerịka nọ n’okpuru Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ụwa Niile. Ọ bụ ngalaba ndị a na-ahụ maka ise ụkpụrụ ụlọ, ịrụ ha arụ, na ilekọta ha ná mpaghara ụwa nke ha nakwa ịhụ na a na-arụpụta Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa. N’oge gara aga, ọ bụ Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ụfọdụ. Ma, ná mba ndị na-abaghị ọgaranya, a na-esi ná ndokwa e mere maka mba ndị na-enweghị ego arụrụ ha nke ha. Ma ugbu a, e jikọtala ụzọ abụọ a ọnụ ka e nwee ike gbapụkwuo ọrụ a ọsọ.

E hiwere Ngalaba Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’alaka ụlọ ọrụ niile iji hazie ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ ngwa ngwa. Ọ bụ Kọmitii Alaka ka ngalaba a ga na-akọrọ otú ọrụ ha si aga. Otu ihe magburu onwe ya n’ihe a a gbanwere bụ na alaka ụlọ ọrụ ọ bụla nwere ike ịhọpụta ụmụnna ndị ọrụ ha ga-abụ inyere ọgbakọ dị iche iche aka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ.

N’ọnwa Eprel afọ 2014, nnukwu ọrụ ndị e ji n’aka karịrị narị abụọ na iri asaa. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ọfis Ndị Nsụgharị iri itoolu, ụlọ mgbakọ iri atọ na ise, na narị alaka ụlọ ọrụ na iri atọ a na-arụ ọrụ na ha. Ụlọ Nzukọ Alaeze dịkwa oké mkpa n’ebe dị iche iche. E nwere ihe karịrị puku Ụlọ Nzukọ Alaeze iri na anọ a na-arụ ọhụrụ ma ọ bụ na-arụzigharị arụzigharị.

N’eziokwu, okwukwe anyị na-esikwu ike ka anyị na-ahụ ka ụmụnna anyị si ná mba dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, na asụsụ dị iche iche na-abịakọta ọnụ soro na-arụ ụlọ ndị na-ewetara aha nsọ Jehova otuto ma na-ebuli  ya elu. Otu nwanna aha ya bụ Dan Molchan, onye na-arụ ọrụ n’ọfis Kọmitii Na-ahụ Maka Ndị Na-arụ Ọrụ na Betel kwuru, sị: “Ihe a ga-arụ arụ ka dị ọtụtụ. Ọ bụ ya mere obi ji atọ anyị ụtọ na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị na-echeta anyị n’ekpere ma na-enye onyinye iji na-akwado ọrụ a. Ma, ndị anyị kacha ekele bụ ndị nke wepụtara onwe ha na-arụ ọrụ a.”

GỤKWUO GBASARA YA

Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ime Ime Obodo

Lee vidio a ka ị hụ otú ìgwè ndị ọrụ ise si rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ n’ime abalị iri abụọ na asatọ.

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?

Chọpụta otú ọrụ ikwusa ozi ọma Ndịàmà Jehova si na-aga nke ọma n’ụwa niile n’agbanyeghị na ha anaghị ana ụtụ ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri.