Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

 DỌMINIKAN RIPỌBLIK

Jehova Emeela Ka Ọtụtụ Ndị Bata n’Ọgbakọ

Leonardo Amor

Jehova Emeela Ka Ọtụtụ Ndị Bata n’Ọgbakọ
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1943

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1961

  • ONYE Ọ BỤ Ọ mụtara eziokwu mgbe ọ na-eto eto. O jeerela Jehova ozi oge niile ihe karịrị afọ iri ise.

IHE dị ka otu ọnwa e gbuchara Trujillo n’afọ 1961, e mere m baptizim. N’oge ahụ, m na-amụ banyere iwu na mahadum. Papa m chọrọ ka m bụrụ ọkàiwu, ma, m ma na ihe Chineke na-akụzi ka ihe ọ bụla a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, m si na mahadum ahụ pụọ, n’agbanyeghị nsogbu niile papa m nyere m. Obere oge, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Otu n’ime ebe ndị e zigara m bụ La Vega. Ọ bụ ebe Chọọchị Katọlik hiwere isi. N’oge m nọ ebe ahụ, e nweghị onye batara n’ọgbakọ. Naanị mụ na onye ọsụ ụzọ ibe m na-enwe ọmụmụ ihe. M kwuwe okwu ihu ọha, ọ bụ naanị ya na-ege ya. Ma Jehova ji Baịbụl m na-amụ, mgbakọ m na-aga, na ekpere m na-ekpegara ya mee ka ike ghara ịgwụ m ijere ya ozi. M kpewa ekpere, m na-arịọ Jehova ka o mee ka e nwee ọgbakọ na La Vega. Obi dị m ụtọ na e nweela Ụlọ Nzukọ Alaeze isii na ọgbakọ  iri na anọ na La Vega. E nwekwara ihe karịrị narị ndị nkwusa asatọ n’ebe ahụ.

N’afọ 1965, alụrụ m Ángela. N’afọ 1981, a kpọrọ anyị bịa jewe ozi na Betel. N’oge m mere baptizim, e nwere naanị narị ndị nkwusa isii na iri asatọ na otu na Dọminikan Ripọblik. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa iri atọ na puku isii. Ọtụtụ puku mmadụ na-abịakwa mgbakọ anyị. Ọ na-abụ m cheta ole anyị dịbu na ole anyị dị ugbu a, ọ na-atụ m n’anya otú Jehova si mee ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ.

Ndị a bụ ndị so na Kọmitii Alaka. E si n’aka ekpe gụrụ gawa aka nri, onye nke mbụ bụ Reiner Thompson, Juan Crispín, Thomas Dean, Leonel Peguero, Leonardo Amor, na Richard Stoddard