Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1915

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1915

 ỤLỌ NCHE March 1, 1915 kwuru, sị: “Ihe a bụ oge ule. Ihe mere anyị jibu na-ekwusasi ozi ọma ike ọ̀ bụ maka na anyị na-atụ anya na a ga-akpọrọ anyị laa eluigwe n’afọ 1914, ka ọ̀ bụ na anyị hụrụ ONYENWE ANYỊ n’anya, hụkwa ozi Ya na ụmụnna anyị n’anya?” N’afọ 1915, obi adịghị ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl mma maka na ihe ha tụrụ anya ya emeghị. N’oge ahụkwa, a na-alụ agha n’ọtụtụ ebe n’ụwa.

N’afọ ahụ, a na-alụ agha a na-akpọ Agha Ukwu na Yurop. Ma, e mechara kpọwa ya Agha Ụwa nke Mbụ. Ngwá agha ndị e ji lụọ agha a gbanwere otú e sibu alụ agha n’ihi na ọ kpara ọtụtụ ndị na-abụghị ndị agha aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1915, ụgbọ mmiri ndị Jaman malitere ịgbagharị n’oké osimiri ndị gbara Briten gburugburu. N’abalị asaa n’ọnwa Mee, afọ 1915, otu n’ime ụgbọ mmiri ndị Jaman kpuru ụgbọ mmiri ndị Briten na-ebu ndị njem. Ihe karịrị otu puku na otu narị mmadụ nọ n’ụgbọ ahụ nwụrụ.

Okwu Gbasara Ịga Agha

Ndị Mmụta Baịbụl achọghị iso lụọ agha a. Ma ha aghọtachaghị na Ndị Kraịst ekwesịtụdịghị ịba amị ma ọ bụ ịlụ agha. Ọ bụ eziokwu na ha anaghị eji aka ha aba amị, ụfọdụ n’ime ha bara amị mgbe gọọmenti kpọrọ ha ka ha mee otú ahụ. Ha gbakwara mbọ ka ha ghara ịga agha. Ọ bụrụ na a manye ha gaa kwaa mgbọ n’ọgbọ agha, ụfọdụ n’ime ha kpebiri na naanị ihe ha ga na-eme bụ “ịgbali égbè elu.”

N’Ụlọ Nche July 15, 1915, e kwuru banyere otu nwanna onye Họngarị bụ́ onye agha. E mere ya baptizim n’oge ọ na-agbake n’ahụ́ e merụrụ ya n’ihu agha. Mgbe ọ gbakechara, ọ laghachịrị n’ọgbọ agha. Ụlọ Nche ahụ kwuru na mgbe ndị agha Họngarị rutere nso n’ebe ndị agha Rọshịa nọ, onyeisi ha gwara ha ka ha jiri mma a rụnyere n’ọnụ égbè ha magbuo ndị agha Rọshịa. Nwanna anyị onye Họngarị ahụ nọ n’isi isi aka ekpe. Ọ chọghị igbu mmadụ, ọ chọghịkwanụ ka mmadụ gbuo ya. N’ihi ya, o ji mma ya na-akụpụ mma onye agha Rọshịa  nọ ya n’ihu. Mgbe ha na-akụ mma, ọ chọpụtara na onye agha Rọshịa ahụ achọghịkwa igbu yanwa, naanị ihe ọ chọrọ bụ ịna-akụpụ mma ahụ yanwa ji. Onye agha Rọshịa ahụ gbọtọrọ mma ya bidozie bewe ákwá. Mgbe nwanna onye Họngarị ahụ leruru ya anya, ọ hụrụ na e nwere baajị dị n’efe ya. E sere ya “Obe na Okpueze.” Nwanna onye Họngarị ahụ mataziri na ọ bụ nwanna ya n’ime Onyenwe anyị. *

Otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche September 1, 1915, lebara anya n’ihe gbasara Ndị Kraịst ịbụ ndị agha. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla bara amị ma yiri uwe ndị amị ekwerela ịrụ ọrụ niile ndị amị na-arụ. . . . Ọ̀ dịnụ mma Onye Kraịst ime otú ahụ?” Ka oge na-aga, ọ bịara doo anya na Ndị Kraịst ekwesịghị inwe ihe ọ bụla jikọrọ ha na agha.

Mgbanwe E Mere n’Isi Ụlọ Ọrụ Anyị

N’afọ 1915, a gwara mmadụ iri asaa n’ime ndị na-eje ozi na Betel dị na Niu Yọk ka ha laa jewe ozi n’èzí. Ihe kpatara ya bụ na ego adịghị a ga-eji na-elekọta mmadụ niile nọ na Betel. A gwara ha, sị: “Anyị achọghị ịba n’ụgwọ, ma ọ bụkwanụ kwụsị ozi anyị na-ejere Chineke. Ọ bụ ya mere anyị ji kpebie iselata aka n’ego anyị na-emefu.”

Mmadụ atọ n’ime mmadụ iri asaa ahụ a sịrị laa bịanyere aka n’akwụkwọ ozi e dere n’aha “Mmadụ Iri Asaa ahụ Na-ala Ala.” Aha otu n’ime mmadụ atọ ahụ bụ Nwanna Clayton J. Woodworth. E bipụtara akwụkwọ ozi ahụ n’Ụlọ Nche May 1, 1915. Ndị ahụ na-alanụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ha na-ala, obi dị ha ụtọ n’ihi ọtụtụ ihe ọma Jehova meere ha na n’ihi ọrụ dị iche iche ha rụrụ mgbe ha na-eje ozi na Betel.

Ọ bụ eziokwu na isi na Betel pụọ adịrịghị ụmụnna ndị ahụ mfe, o mere ka ha gosi ma hà ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Hà ga-anọgide na-ejere Chineke ozi, ma ọ bụ na-ewe iwe  na a sịrị ha laa? Nwanna Woodworth nọgidere na-ekwusa ozi ọma. E mechakwara kpọghachi ya na Betel. N’afọ 1919, ọ ghọrọ onye mbụ na-achịkọta ihe ndị a na-ebipụta na The Golden Age, bụ́ nke a na-akpọzi Teta! Ọ bụkwa ihe ọ rụgidere ruo n’afọ 1946.

Ohere Mmadụ Ga-eji Jeere Jehova Ozi

N’Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ 1915, a gbara ụmụnna anyị ume ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na afọ ahụ tara akpụ. Ndị e lebaara anya karịchaa bụ ndị e ziri ozi ọma n’oge gara aga, ha enwee mmasị. Ụlọ Nche December 15, 1915, kwuru, sị: “E nwere kaadị ndị e si n’ebe dị iche iche n’obodo a zitere anyị. Ndị zitere ha kwuru ka anyị wetara ha akwụkwọ anyị. Anyị chọrọ ka ụmụnna anyị gaghachi na nke ha . . . mara ma è megharịala ha anya.” Ihe mere e ji chọọ ka a gaghachi bụ ka e mee ka ha na-anụ ọkụ n’obi, ya bụ, “ka ha jiri obi ha niile hụ Chineke n’anya, jirikwa eziokwu ha na-amụta kpọrọkwuo ihe.”

N’ihi otú ihe si kwụrụ n’afọ 1915, a chọrọ ka ụmụnna anyị lekwasị anya n’ihe ndị gbasara Alaeze Chineke, otú a chọkwara ka anyị na-eme taa. Ọ bụ ya mere Ụlọ Nche February 15, 1915, ji kwuo, sị: “Anyịnwa ndị mụ anya ugbu a kwesịrị ịna-arụsi ọrụ Chineke ike.” Ndị ohu Chineke kwesịkwara ịna-eche nche. Ụlọ Nche ahụ kwukwara, sị: “Anyị ga na-eche nche. Gịnịkwanụ ka anyị kwesịrị ịna-eche nche? Anyị kwesịrị ịna-eche onwe anyị nche ka a ghara iji ihe ndị dị n’ụwa ugbu a megharịa anyị anya.”

Isiokwu afọ 1916 gbara ụmụnna anyị ume ka ha dị ike n’okwukwe. Isiokwu a si ná Ndị Rom 4:20. Amaokwu Baịbụl a ga-agba ụmụnna anyị ume n’afọ 1916 n’ihi na ọnwụnwa bịaara ha n’afọ ahụ.

^ para. 4 E nwere baajị Ndị Mmụta Baịbụl yiri ruo ọtụtụ afọ. A kpụkọtara obe na okpueze na ya. E jikwa ya amata ha. Ọ gbakwara n’ihu Ụlọ Nche ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ n’ihe dị ka afọ 1932 ka Ndịàmà Jehova kwụsịrị ịna-eyi ya n’uwe ha na ise ya n’ihu Ụlọ Nche.