Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

JENỤWARỊ 7, 2016
AZEBAỊJAN

Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-eleba Anya na Mkpọrọ A Tụrụ Ndị Aka Ha Dị Ọcha gwara mba Azabaịjan ka ha tọhapụ Zakharchenko na Jabrayilova na mkpọrọ

Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-eleba Anya na Mkpọrọ A Tụrụ Ndị Aka Ha Dị Ọcha gwara mba Azabaịjan ka ha tọhapụ Zakharchenko na Jabrayilova na mkpọrọ

Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-eleba Anya na Mkpọrọ A Tụrụ Ndị Aka Ha Dị Ọcha gwara mba Azebaịjan ka ha tọhapụ Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova na mkpọrọ. Ha kwuru na mba Azebaịjan tụrụ ha mkpọrọ na-ezighị ezi maka na ha na-ekpe okpukpe masịrị ha otú iwu kwuru, n’enweghị onye ọ bụla ha na-enye nsogbu. Ha kwukwara na ihe mere e ji tụọ ha mkpọrọ a bụ maka na a kpọrọ ha asị n’ihi okpukpe ha, nakwa na mba Azebaịjan emeghị ihe iwu òtù mba ụwa kwuru maka ikpe mmadụ ikpe ziri ezi. Ihe otú a kwuru abụghị naanị na mkpọrọ ahụ a tụrụ ụmụ nwaanyị abụọ ahụ megidere iwu, kama, ha kwukwara na iwu ọ bụla a machibidoro ha ime ihe ndị ha na-eme n’okpukpe ha jọgburu onwe ya, gosikwa na a kpọrọ ha asị.

Mba Azebaịjan emeghị ihe Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ gwara ha mee, ya bụ, ịtọhapụ Irina na mkpọrọ. Ọrịa ọ na-arịa ekweghị ya wụchaa n’ụlọikpe zara ọnụ ya n’abalị asaa n’ọnwa Jenụwarị afọ 2016. Ọ bụrụ na a maliteghachi itinye okwu ha ọnụ, ọkàikpe Akram Gahramanov, ọ̀ ga-ekwenụ ime ihe iwu mba ụwa kwuru?