Gaa n'Isiokwu

Okwu Ikpe na Ihe Ndị Ruuru Mmadụ

Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere

Ebe ndị a tụrụ Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ihi na ha na-ekpe okpukpe ha, na-emekwa ihe ndị ha nweere onwe ha ime, ọtụtụ n’ime ha nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya.

RỌSHỊA

Olee Mgbe Ikpe Arụrụala A Na-ekpe Ndịàmà Jehova n’Obodo Taganrọg Ga-akwụsị?

À ga-atụ Ndịàmà Jehova 16 a na-enweghị ihe ha mere mkpọrọ na Rọshịa n’ihi ihe ha kweere?

SAỤT KORIA

Gọọmenti Saụt Koria Akpọpụtala Ọtụtụ Ndị Jụrụ Ịrụ Ọrụ Agha n’Ihi Akọnuche Ha n’Ụlọ Mkpọrọ A Na-atụba Ndị Omekome

Gọọmenti Saụt Koria emeela ka ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha kurutụ ume ndụ.

AMINIA

Gọọmenti Aminia Ewepụtala Ọrụ Ọzọ Maka Ndị Akọnuche Ha Na-ekweghị Ha Rụọ Ọrụ Agha

Ihe ndị na-emenụ gosiri na gọọmenti Aminia ekwetawala na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ya. E nyela ọtụtụ Ndịàmà Jehova ọrụ na-abụghị ọrụ agha.

SAỤT KORIA

Ọtụtụ Mba Akatọọla Ikpe Na-ezighị Ezi A Na-ekpe na Saụt Koria

Ndịàmà Jehova ebipụtala broshọ na-ekwu gbasara mkpọrọ na-ezighị ezi a na-atụ ọtụtụ ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ha anabataghị ya.

TỌKI

Òtù Mba Ụwa Agwala Mba Tọki Amanyezila Ụmụ Amaala Ha Ka Ha Mee Ihe Akọnuche Ha Na-anabataghị

Gụọ ihe a ka ị hụ ikpe Òtù Mba Ụwa kpere nke nyere ụmụ amaala Tọki ikike ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ha.

RỌSHỊA

Ụlọikpe Kpebiri na “Anyị Anọghị n’Afọ 1937”

Otu ọkàikpe nọ n’ụlọikpe dị elu e nwere n’otu ógbè kagburu ihe otu obere ụlọikpe kpebiri.

YUKREN

E Kpere Ikpe Ziri Ezi na Yukren

Ụlọikpe Kacha Elu na Yukren ekweghị ka a napụ Ndịàmà Jehova ala ha.