Gaa n'Isiokwu

JENỤWARỊ 15, 2016
Azerbaijan

Ọkàikpe Eyigharịakwa Ikpe Ụmụ Nwaanyị Abụọ ma Mee Ka A Ghara Ịtọhapụ Ha

Ọkàikpe Eyigharịakwa Ikpe Ụmụ Nwaanyị Abụọ ma Mee Ka A Ghara Ịtọhapụ Ha

N’abalị iri na anọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2016, ọkàikpe aha ya bụ Akram Gahramanov, nke ụlọikpe ukwu dị na Baku na Azabaịjan, yigharịrị ikpe a na-ekpe Ndịàmà Jehova abụọ aha ha bụ Zakharchenko na Jabrayilova. O kwuru na ihe mere ya ji yigharịa ikpe ahụ bụ na Zakharchenko abịaghị ikpe n’ụbọchị ahụ maka na ahụ́ adịghị ya, n’ihi ya, na agaghị etinye ọnụ n’okwu ya ma ọ nọghị ya. Ọkàikpe ahụ yigharịrị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2016.

Ikpe a o yigharịrị na-akpakwu ụmụ nwaanyị abụọ a aka ọjọọ n’ihi na ọkàiwu ndị na-ekpechite ọnụ ha agaghị enweli ike ikwu ihe ọ bụla ga-eme ka a tọhapụ ha. Mkpọchi a kpọchiri ụmụ nwaanyị abụọ ahụ kemgbe ọnwa iri na otu emeela ka ha rịawa ọrịa. N’ihi ya, ịna-eyigharị ikpe ahụ n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ nakwa ị sị na Zakharchenko ga-anọrịrị ya tupu e tinye okwu ha ọnụ ga-akpakwu ha aka ọjọọ.