Gaa n'Isiokwu

EPREL 8, 2021
NAỊJIRỊA

Ndịàmà Jehova Ewepụtala Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ E Degharịrị Edegharị n’Asụsụ Igbo

Ndịàmà Jehova Ewepụtala Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ E Degharịrị Edegharị n’Asụsụ Igbo

N’abalị anọ n’ọnwa Eprel n’afọ 2021, Nwanna Kenneth Cook, onye so n’Òtù Na-achị Isi, wepụtara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ e degharịrị edegharị n’asụsụ Igbo. O wepụtara Baịbụl a ná nnọkọ pụrụ iche e si n’Ịntanet nwee. Obi tọrọ ndị nkwusa nọ n’ihe karịrị otu puku ọgbakọ na otu narị na iri anọ (1,140) na-eji asụsụ Igbo amụ ihe na Naịjirịa ezigbo ụtọ inweta Baịbụl a. E wepụtara Baịbụl a afọ iri na anọ e wepụtachara Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mbụ n’asụsụ Igbo.

Baịbụl a ga-abara ihe karịrị ndị nkwusa puku iri ise (50,000) uru bụ́ ndị bi n’ebe a na-asụ asụsụ Igbo. Ọ ga-abakwa ezigbo uru iji ya na-ezi ihe dị ka nde mmadụ iri anọ (40,000,000) na-asụ asụsụ Igbo ozi ọma.

Otu n’ime ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Igbo kwuru, sị: “E ji asụsụ Igbo a na-asụ n’oge a degharịa Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a. E nwekwara ọtụtụ ihe e dere n’ala ala peeji Baịbụl a ga-eme ka ọ masị onye Igbo ọ bụla gụrụ ya. Ihe mere e ji dee ihe ndị ahụ dị n’ala ala peeji abụghị naanị iji kọwaa okwu Hibru ma ọ bụ okwu Grik. N’ebe ụfọdụ, ihe e dere na ya bụ otú ọzọ e si ekwu ihe a na-akọwa n’asụsụ Igbo ka ndị si ná mpaghara Igbo dị iche iche nwee ike ịghọta ihe a na-ekwu.”

Nwanna Archibong Ebiti, onye so na Kọmitii Na-elekọta Alaka Ụlọ Ọrụ dị na Naịjirịa, kwuru, sị: “O were ndị nsụgharị isii afọ anọ ịsụgharịcha Baịbụl a. Ọ bụ eziokwu na ọrịa koronavaịrọs mere ka nsogbu ndị a na-atụghị anya ha dọlatụ ọrụ a azụ, anyị na-ekele Jehova na o nyere ndị niile so rụọ ọrụ a mmụọ nsọ ya ha ji rụchaa ya.”

Obi siri anyị ike na ịgụ okwu ndị dị ụtọ e dere na Baịbụl a e degharịrị edegharị ga-eme ndị Igbo bụ́ Ndịàmà Jehova obi ụtọ. Ọ ga-adịkwara ha mfe iji Baịbụl a na-akụziri ma ‘na-akọwara ndị ọzọ eziokwu gbasara ụzọ Chineke.’​—Ọrụ 18:26.