Gaa n'Isiokwu

Akụkọ Gbasara Ndịàmà Jehova

Nọrọ n’Ịntanet gụọ akụkọ gbasara Ndịàmà Jehova. Ndị na-ahụ ihe gbasara iwu na ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi ga-enwetakwa ihe ndị ga-abara ha uru ebe a.

AKỤKỌ SI MBA DỊ ICHE ICHE

Ihe Gbata Gbata Zuru Ụwa Ọnụ: Inyere Ụmụnna Anyị Aka Mgbe E Nwere Ọdachi na Ọrịa Na-efe Efe

Òtù Na-achị Isi ga-anọgide na-agwa ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile ihe ndị ha ga na-eme ozugbo e nwere ọdachi.

E Nweela Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Zuru Ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka

Ndịàmà Jehova mara ọkwa na ha asụgharịchaala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka.

RỌSHỊA

Ajụjụ Ọnụ A Gbara Nwanna Dmitriy Mikhaylov

A nwụchiri Nwanna Mikhaylov na Mee 29, 2018. Ọ nọrọ ọtụtụ ọnwa n’ụlọ mkpọrọ. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, o kwuru otú Jehova si nyere ya aka ịtachi obi, nakwa otú nwunye ya si kwado ya. O kwukwara otú izi ndị mkpọrọ ibe ya ozi ọma si mee ka obi ruo ya ala, ya ana-enwekwa ọṅụ.

AKỤKỌ SI MBA DỊ ICHE ICHE

Ezigbo Ịhụnanya Mere Ka Anyị Gbatara Ndị Nọ n’Agwaetiti Dị Iche Iche Ọsọ Enyemaka

Vidio a gosiri otú ọtụtụ Ndịàmà Jehova si gbaa mbọ wepụta onwe ha iji nyere ndị ajọ ifufe a na-akpọ Ịma na Marịa mebiri ihe ha aka.