Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

DISEMBA 12, 2012
FRANS

Gọọmenti Frans Enyeghachila Ndịàmà Jehova Ego Ha Naara Ha

Gọọmenti Frans Enyeghachila Ndịàmà Jehova Ego Ha Naara Ha

Mgbe e kpechara ikpe ruo afọ iri na anọ, gọọmenti Frans nyeghachiri Ndịàmà Jehova ego dị $8,294,320 (ya bụ, ihe dị ka ₦1,285,619,600).

N’afọ 1998, gọọmenti Frans siri ọnwụ na Ndịàmà Jehova ga-eji ihe karịrị ọkara ego ha nwetara n’onyinye n’afọ ndị gara aga kwụọ gọọmenti ụtụ isi. N’afọ 2003, ha sịrị Ndịàmà Jehova kwụbata ụfọdụ n’ime ụgwọ ahụ. Ma, Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop kpebiri na iwu akwadoghị ụtụ isi a gọọmenti Frans chọrọ ka Ndịàmà Jehova tụọ, nakwa na ọ ga-eme ka Ndịàmà Jehova ghara inwere onwe ha ikpe okpukpe ha. Ụlọikpe a kwukwara na ọ ga-eme ka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova daa, meekwa ka ha gharazie ịna-ekwusa ozi ọma. Ebe ọ bụ na ụlọikpe ahụ kpebiri na iwu akwadoghị ụtụ isi ahụ a naara Ndịàmà Jehova, gọọmenti Frans amalitela ime ihe ụlọikpe ahụ kpebiri. Ha amalitela inyeghachi Ndịàmà Jehova ego ahụ ha naara ha, ma ọmụrụ nwa dị n’elu ya ma ego Ndịàmà Jehova mefuru n’ikpe ha na ha.

Ndị E Nwere Ike Ịkpọtụrụ:

J. R. Brown, Office of Public Information, tel. +1 718 560 5000

France: Guy Canonici, tel. +33 2 32 25 55 55